< 1 Ar-ari 1 >

1 Lakay unayen ni Ari David. Binalkotda isuna kadagiti lupot, ngem saanen a bumara ti bagina.
Mgbe eze Devid ghọrọ agadi, nʼagbanyeghị na-eji ọtụtụ uwe kpuchie ya, ahụ ya ekpoghị ọkụ.
2 Isu a kinuna dagiti adipenna kenkuana, “Mangbirokkami koma iti maysa a balasang a birhen para iti apomi nga ari. Pagserbianna koma ti ari ken aywananna isuna. Agpungan koma isuna iti takiagna tapno bumara ti bagi ti apomi nga ari.”
Ya mere, ndị na-ejere ya ozi sịrị ya, “Ka anyị chọtara eze otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, onye ga-akwụ nʼihu eze ma bụrụkwa onye ga-elekọta ya. O nwere ike idina nʼakụkụ onyenwe anyị bụ eze ime ka ahụ kpoo ya ọkụ.”
3 Nangbirokda ngarud iti napintas a babai kadagiti amin a beddeng ti Israel. Nasarakanda ni Abisag a taga-Sunem ket inyegda isuna iti ari.
Ha gagharịrị nʼala Izrel niile chọọ nwaagbọghọ mara mma, chọta otu nwaagbọghọ onye Shunem, aha ya bụ Abishag, kpọtaara ya eze.
4 Nakapinpintas unay ti babai. Pinagserbianna ti ari ken inaywananna isuna, ngem saan a sinagsagid isuna ti ari.
Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu; ọ lekọtakwara eze, jekwaara ya ozi ma ya na eze enweghị mmekọ ọbụla.
5 Iti dayta a tiempo, ni Adoniha nga anak ni Haggit, intan-okna ti bagina, a kunana, “Siakon ti agbalin nga ari.” Isu a nangisagana isuna kadagiti karwahe ken kadagiti nakakabalio ken adda pay limapulo a lallaki nga agtaray nga umun-una kenkuana.
Nʼoge a, Adonaịja onye nne ya bụ Hagit, wepụtara onwe ya, kwuo sị, “Aga m abụ eze.” Nʼihi nke a, ọ kwadooro onwe ya ụgbọ agha na ọtụtụ ịnyịnya, kpọtakwa iri ndị ikom ise, ndị ga-agba ọsọ nʼihu ya.
6 Saan a pulos a binabalaw isuna ti amana a kunana, “Apay nga inaramidmo daytoy wenno dayta?” Nataer met unay a lalaki ni Adonija, isuna ti simmaruno kenni Absalom a naiyanak.
Na ndụ Adonaịja niile, o nweghị oge nna ya baara ya mba site nʼịjụ ya, “Gịnị mere i ji akpa agwa dị otu a?” Ọ bụ nwokorobịa mara mma nke ukwuu; ọ bụ ya na-esotekwa nwanne ya Absalọm.
7 Kinatulagna ni Joab nga anak ni Zeruyas ken ni Abiatar a padi. Simmurotda kenni Adoniha ken tinulonganda isuna.
Adonaịja na Joab, nwa Zeruaya tinyere Abịata onye nchụaja, kparịtara ụka. Ha kwenyere inyere ya aka ka ọ ghọọ eze.
8 Ngem ni Zadok a padi, ni Benaias nga anak ni Jehoyada, ni Natan a profeta, ni Simei, ni Reihi, ken dagiti mamaingel a lallaki a tattao ni David ket saan a simmurot kenni Adoniha.
Ma Zadọk onye nchụaja, Benaya nwa Jehoiada, Netan onye amụma, Shimei, Rei na ndị agha niile na-eche Devid nche esonyeghị Adonaịja.
9 Nangidaton ni Adoniha iti karnero, bakbaka, ken nalulukmeg nga urbon a baka iti ayan ti bato ti Zohelet nga abay ti En Rogel. Inawisna amin dagiti kakabsatna a lallaki, dagiti lallaki nga annak ti ari, ken amin a lallaki iti Juda nga adipen ti ari.
Adonaịja chịịrị atụrụ, ehi na ụmụ ehi gbara abụba, gaa nʼakụkụ En-Rogel chụọ aja na Nkume Zohelet. Ọ kpọrọ ụmụnne ya niile bụ ụmụ ndị ikom eze na ndịisi Juda niile, ndị na-ejere eze ozi oku,
10 Ngem saanna nga inawis ni Natan a profeta, ni Benaias, dagiti mamaingel a lallaki, wenno ni Solomon a kabsatna.
ma ọ kpọghị Netan onye amụma, maọbụ Benaya, maọbụ ndị agha niile na-eche Devid nche. Ọ kpọkwaghị Solomọn nwanne ya.
11 Kalpasanna, kinasarita ni Natan ni Batseba nga ina ni Solomon, kinunana, “Saanmo kadi a nangngeg a nagbalinen nga ari ni Adoniha nga anak ni Haggit, ket saan nga ammo daytoy ni David nga apotayo?
Mgbe ahụ, Netan onye amụma jụrụ Batsheba nne Solomọn ajụjụ sị, “Ị nụghị na Adonaịja nwa Hagit aghọọla eze ugbu a, ma onyenwe anyị bụ Devid amaghị ihe ọbụla banyere ya?
12 Ita ngarud, denggem koma ti ibalakadko kenka tapno maisalakanmo ti biagmo ken ti biag ti anakmo a ni Solomon.
Ma ugbu a, ka m dụọ gị ọdụ otu ị ga-esi zọpụta ndụ gị na ndụ nwa gị Solomọn.
13 Mapanka kenni Ari David; ibagam kenkuana, 'Apok nga ari, saan kadi nga inkarim iti adipenmo, a kunam, “Awan duadua a ni Solomon nga anakmo ti sumukat kaniak nga agturay, ket agtugawto isuna iti tronok?” Apay ngarud nga agturturayen ni Adoniha?'
Bakwuru eze Devid sị ya, ‘Onyenwe m bụ eze, ọ bụ na i kweghị m bụ ohu gị nkwa sị: “Nʼezie, Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ ga-anọdụ nʼocheeze m”? Ma gịnị mere Adonaịja ji bụrụ eze?’
14 Bayat nga addaka sadiay a makisarsarita iti ari, sumarunoakto kenka ket patalgedak dagiti saom.”
Mgbe ị ka nọ na-akpanyere eze ụka, mụ onwe m ga-abịakwute gị gbaa okwu niile ị na-ekwu ume.”
15 Napan ngarud ni Batseba iti siled ti ari. Lakay unayen ti ari, ket ni Abisag a taga-Sunem, pagserserbianna ti ari.
Batsheba bakwuuru eze nʼime ụlọ. Eze emeela nnọọ agadi nke ukwuu. Abishag onye Shunem nọkwa na-elekọta ya.
16 Nagruknoy ken nagrukob ni Batseba iti sangoanan ti ari. Ket kinuna ti ari, “Ania ti kayatmo?”
Batsheba gburu ikpere nʼala, kpọọ isiala nye eze. Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ?”
17 Kinunana kenkuana, “Apok, inkarim iti adipenmo babaen iti nagan ni Yahweh a Diosmo, a kunam, 'Awan duadua a ni Solomon nga anakmo ti sumukat kaniak nga agturay, ket agtugawto isuna iti tronok.'
Batsheba zara sị ya, “Onyenwe m, i jiri Onyenwe anyị Chineke gị ṅụọrọ m iyi, kwee m nkwa sị na nwa m Solomọn ga-abụ eze, nọdụkwa nʼocheeze gị.
18 Ita, kitaem, nagbalinen nga ari ni Adoniha, ket sika apok nga ari, saanmo nga ammo daytoy.
Ma ugbu a, Adonaịja aghọọla eze, ma gị onyenwe m bụ eze amaghị ihe banyere nke a.
19 Nangidaton isuna kadagiti baka, kadagiti napalukmeg nga urbon a baka, ken nakaad-adu a karnero, ket inawisna amin nga annak ti ari, ni Abiatar a padi, ken ni Joab a pangulo ti armada, ngem saanna nga inawis ni Solomon nga adipenmo.
O jirila ọtụtụ igwe ehi na ụmụ ehi gbara abụba, na atụrụ chụọ aja. Ọ kpọkwara ụmụ ndị ikom eze niile na Abịata onye nchụaja, na Joab onyeisi agha. Ma ọ kpọghị Solomọn bụ ohu gị.
20 Apok nga ari, kumitkita amin kenka dagiti mata ti Israel, ur-urayenda nga ibagam kadakuada no siasino ti agtugaw iti tronom a sumukat kenka, apok.
Ma ugbu a, onyenwe m eze, ndị Izrel niile na-ele gị anya isi nʼọnụ gị nụta onye ga-anọchi anya gị, ịnọkwasị nʼocheeze eze gị.
21 Ta no saan ket mapasamakto, nga inton pumusayto ti apok, siak ken ti anakko a ni Solomon ket maibilangto a kriminal.”
Ma ọ bụghị otu a, ngwangwa onyenwe m bụ eze ga-esoro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, mụ onwe m na nwa m Solomọn ka a ga-emeso mmeso dịka ndị mmebi iwu.”
22 Bayat a makisarsarita pay laeng isuna iti ari, simrek ni Natan a profeta.
Mgbe Batsheba nọ na-akpanyere eze ụka, Netan onye amụma batara.
23 Imbaga dagiti adipen iti ari, “Adda ditoy ni Natan a profeta.” Idi simrek isuna iti ayan ti ari, nagkurno iti sangoanan ti ari.
A gwara eze okwu sị, “Netan onye amụma nọ nʼebe a.” Ya mere, ọ gara nʼihu eze kpọọ isiala nye ya.
24 Kinuna ni Natan, “Apok nga ari, pudno kadi nga imbagam, 'Ni Adoniha ti agturay kalpasan ti panagturayko, ket isuna ti agtugaw iti tronok?'
Netan sịrị, “Onyenwe m, bụ eze, ọ bụ gị onwe gị sịrị Adonaịja ga-abụ eze mgbe ị nwụrụ, na ọ ga-anọkwasịkwa nʼocheeze gị?
25 Ta simmalog isuna ita nga aldaw ket nangidaton kadagiti kalakian a baka, napalukmeg a baka, ken nakaad-adu a karnero, ket inawisna amin dagiti annak ti ari, dagiti papangulo ti armada, ken ni Abiatar a padi. Mangmangan ken agiinomda iti sangoananna a kunkunada, 'Agbiag ni Ari Adoniha!'
Taa, ọ gaala jiri ọtụtụ igwe ehi, na ụmụ ehi gbara abụba, na ụmụ atụrụ chụọ aja. Ọ kpọọkwala ụmụ ndị ikom eze niile. Ọ kpọkwara ndịisi agha, na Abịata onye nchụaja. Ha na ya na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-eti mkpu na-asị, ‘Eze Adonaịja ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.’
26 Ngem no maipanggep kaniak, siak nga adipenmo, ni Zadok a padi, ni Benaias nga anak ni Jehoyada, ken ti adipenmo a ni Solomon, ket saannakami nga inawis.
Ma ha akpọghị mụ bụ ohu gị na Zadọk, onye nchụaja, na Benaya nwa Jehoiada, na ohu gị bụ Solomọn.
27 Naaramid kadi daytoy ti apok nga ari a saanna nga imbagbaga kadakami nga adipenmo, siasino ti rumbeng nga agtugaw iti trono kalpasan ti panagturayna?”
Ọ bụ site nʼaka onyenwe m bụ eze ka ihe nke a siri mee, ma i meghị ka ndị ohu ya mata onye ga-anọdụ nʼocheeze onyenwe m eze, mgbe ọ nọghịkwa ya?”
28 Ket simmungbat ni Ari David a kunana, “Paumayenyo ditoy ni Batseba.” Immay isuna iti ayan ti ari ket nagtakder iti sangoananna.
Mgbe ahụ, Devid kwuru okwu sị, “Kpọọrọnụ m Batsheba.” Batsheba batara, guzo nʼihu eze.
29 Nagsapata ti ari a kunana, “Iti nagan ni Yahweh nga adda iti agnanayon, a nangispal kaniak iti amin a peggad,
Mgbe ahụ, eze ṅụrụ iyi sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, Onye ahụ napụtara m site na nsogbu m niile,
30 kas iti naikarikon kenka babaen iti nagan ni Yahweh a Dios ti Israel a kunak, 'Ni Solomon nga anakmo ti agturay kalpasan ti panagturayko, ket agtugawto isuna iti tronok a sumukat kaniak,' Aramidek daytoy ita nga aldaw.”
otu ahụ m siri ṅụrụ gị iyi nʼaha Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sị, na Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ bụ ya ga-anọchi anya m, nọdụkwa nʼocheeze m. Otu ahụ ka m ga-eme nʼụbọchị taa.”
31 Ket nagkurno ni Batseba iti sangoanan ti ari ket kinunana, “Agbiag koma iti agnanayon ni Ari David nga apok!”
Mgbe ahụ, Batsheba kpọrọ isiala, gbukwaa ikpere nʼihu eze sị ya, “Ka onyenwe m eze Devid dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
32 Kinuna ni Ari David, “Ayabanyo ditoy ni Zadok a padi, ni Natan a profeta, ken ni Benaias nga anak ni Jehoyada.” Immayda ngarud iti ayan ti ari.
Mgbe ahụ, Devid nyere iwu sị, “Kpọọrọ m Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya, nwa Jehoiada.” Mgbe ha niile bịara nʼihu eze,
33 Kinuna ti ari kadakuada, “Ikuyogyo dagiti adipen ti apoyo, ket pagsakayenyo ni Solomon nga anakko iti asnok ket ipanyo idiay Gihon.
ọ sịrị ha, “Duru ndị ozi onyenwe unu, tinyere unu onwe unu, mee ka Solomọn nwa m nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul nke mụ onwe m, kpọrọnụ ya gbada Gaihọn.
34 Pulotan koma isuna ni Zadok a padi ken ni Natan a profeta tapno agbalin nga ari iti entero nga Israel ken puyotanyo ti tangguyob ket ipukkawyo, “Agbiag ni Ari Solomon!”
Nʼebe ahụ, ka Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, tee ya mmanụ ịbụ eze Izrel. Fụkwaanụ opi, tiekwanụ mkpu sị, ‘Eze Solomọn ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.’
35 Kalpasanna, sumurotkayonto kenkuana, ket umayto isuna agtugaw iti tronok; ta agbalinto nga ari a sumukat kaniak. Dinutokak isuna a mangituray iti Israel ken Juda.”
Mgbe ahụ, unu na ya ga-esokwa gbagota, ọ ga-abịa nọkwasị nʼocheeze m ịchị nʼọnọdụ m. Nʼihi na ọ bụ ya ka m họpụtara ịchị eze nʼIzrel na Juda.”
36 Simmungbat ni Benaias nga anak ni Jehoyada iti ari, “Mapasamak koma dayta! Patalgedan koma daytoy ni Yahweh a Dios ti apok nga ari.
Benaya nwa Jehoiada zara eze sị, “Amen, ka Onyenwe anyị Chineke onyenwe m na eze, kwupụta ya ka ọ dị otu a.
37 Kas iti pannakikaadda ni Yahweh iti apok nga ari, kasta koma met ti pannakikaaddana kenni Solomon, ket pagbalinen pay koma ni Yahweh a natantan-ok ti tronona ngem iti trono ni Ari David nga apok.”
Dịka Onyenwe anyị si nọnyere onyenwe m bụ eze, biko, ka o si otu a nọnyere Solomọn ime ka ocheeze ya dị ukwuu karịa ocheeze onyenwe m bụ eze Devid.”
38 Simmalog ngarud ni Zadok a padi, ni Natan a profeta, ni Benaias nga anak ni Jehoyada, ken dagiti Kereteo ken dagiti Peleteo ket pinagsakayda ni Solomon iti asno ni Ari David; impanda isuna idiay Gihon.
Ya mere, Zadọk, onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya, nwa Jehoiada, na ndị Keret na ndị Pelet, duuru Solomọn mee ya ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul nke eze Devid. Emesịa, ha duuru ya gaa Gaihọn.
39 Innala ni Zadok a padi ti sinan-sara a pagkargaan iti lana manipud iti tolda ket pinulotanna ni Solomon. Kalpasanna, pinuyotanda ti tangguyob, ket kinuna amin dagiti tattao, “Agbiag ni Ari Solomon!”
Nʼebe ahụ, Zadọk onye nchụaja wepụtara mpi mmanụ ahụ dị nʼụlọ nzute Chineke, were tee Solomọn nʼisi. Ha fụkwara opi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze Solomọn dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
40 Ket amin dagiti tattao, simmarunoda kenkuana a simmang-at, ket tinukar dagiti tattao dagiti plauta ket nagrag-oda iti kasta unay nga uray la aggungon ti daga iti ariwawada.
Ndị Izrel niile sooro ya rigoo, na-afụ ọja na-aṅụrịkwa oke ọnụ, ruo nʼala mara jijiji nʼihi oke ụzụ.
41 Nangngeg daytoy ni Adoniha ken dagiti amin a sangaili a kakaduana bayat a malmalpas ti pannanganda. Idi nangngeg ni Joab ti uni ti tangguyob, kinunana, “Apay ngata a naariwawa iti siudad?”
Adonaịja na ndị ọbịa ya niile nụrụ mkpu ọṅụ ahụ mgbe ha onwe ha na-erisi nri. Mgbe Joab nụrụ opi ike ka ọ na-ada, ọ jụrụ sị, “Gịnị mere oke ụzụ dị otu a ji na-ada nʼime obodo.”
42 Bayat nga agsasao pay laeng isuna, dimteng ni Jonatan nga anak ni Abiatar a padi. Kinuna ni Adoniha kenkuana, “Dumanonka, ta mapagtalkanka a tao ken mangiyeg ti naimbag a damag.”
Ma mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, lee Jonatan nwa Abịata onye nchụaja, ka ọ batara. Adonaịja sịrị, “Bata! Nʼihi na ị bụ ezi mmadụ amaara m na ọ bụ oziọma ka i ji bịa.”
43 Simmungbat ni Jonatan ket kinunana kenni Adoniha, “Ni Ari David nga apotayo, pinagbalinnan nga ari ni Solomon.
Jonatan zara ya sị, “Mba, ọ dịghị otu ahụ! Onyenwe anyị eze Devid emeela Solomọn eze.
44 Ket impakuyog ti ari kenkuana ni Zadok a padi, ni Natan a profeta, ni Benaias nga anak ni Jehoyada, dagiti Kereteo ken dagiti Peleteo. Pinagsakayda ni Solomon iti asno ti ari.
Eze e zigala ya na Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya nwa Jehoiada, ndị Keret na ndị Pelet sokwa duru ya gaa. Ha mere ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul eze.
45 Pinulotan isuna ni Zadok a padi ken ni Natan a profeta idiay Gihon, ket manipud sadiay, simmang-atda nga agraragsak, isu a naariwawa iti siudad. Daytoy ti ariwawa a nangngegyo.
Zadọk onye nchụaja na Netan onye amụma eteela ya mmanụ na Gaihọn ịbụ eze. Ha esitekwala nʼebe ahụ ṅụrụ ọṅụ na-alaghachikwa, ndị obodo niile nọkwa ugbu a na-eme mkpọtụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ. Ọ bụkwa ụzụ ọṅụ ha ka unu nụrụ.
46 Kasta met a nakatugawen ni Solomon iti trono ti pagarian.
Solomọn na-anọkwasị nʼocheeze ugbu a.
47 Malaksid iti daytoy, immay dagiti adipen ti ari tapno bendisionanda ni Ari David nga apotayo, kunada, 'Pagbalinen koma ti Diosmo ti nagan ni Solomon a natantan-ok ngem iti naganmo, ken pagbalinenna a natantan-ok ti tronona ngem iti tronom.' Kalpasanna, nagdumog ti ari iti pagiddaanna.
Ọzọkwa, ndị na-ejere eze ozi abịala ikele onyenwe anyị eze Devid ekele, na-asị, ‘ka Chineke gị mee ka aha Solomọn bụrụ aha a ma ama karịa nke gị, ka ocheeze Solomọn dịkwa ukwuu karịa nke gị.’ Eze nọkwa nʼelu ihe ndina ya kpọọ isiala ofufe,
48 Kinuna met ti ari, 'Madaydayaw ni Yahweh a Dios ti Israel, a nangted iti tao nga agtugaw iti tronok iti daytoy nga aldaw, ket nakita a mismo dayta dagiti matak.'”
sị, ‘Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke Izrel onye mere ka m jiri anya m hụ onye nọchiri anya nʼocheeze m taa.’”
49 Ket nagbuteng amin dagiti sangaili ni Adoniha; timmakderda ket nagsipanawda.
Mgbe ahụ, Adonaịja, na ndị ọbịa ya si nʼebe ha na-eri ihe malie. Onye ọbụla sikwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ, nʼihi ụjọ.
50 Nagbuteng ni Adoniha kenni Solomon, timmakder ket napan immiggem kadagiti sara iti altar.
Ma Adonaịja tụrụ egwu nke ukwuu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya, ọ gara jide mpi dị nʼebe ịchụ aja aka.
51 Ket adda nangibaga kenni Solomon iti daytoy a kunana, “Kitaenyo, mabuteng ni Adoniha kenni Ari Solomon, ta immiggem isuna kadagiti sara iti altar a kunkunana, 'Agkari koma nga umuna kaniak ni Ari Solomon a saanna a patayen ti adipenna babaen iti kampilan.'”
Mgbe ahụ, a gwara Solomọn sị, “Adonaịja na-atụ egwu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya ọ na-ejide mpi ebe nchụaja aka. Ọ na-asị, ‘Ka eze Solomọn ṅụọra m iyi taa sị na ọ gaghị eji mma agha gbuo ohu ya.’”
52 Kinuna ni Solomon, “No ipakitana a mapagtalkan isuna a tao, awan ti uray maysa a buokna a matnag iti daga, ngem no kinadangkes ti adda kenkuana, matay isuna.”
Solomọn zara sị, “Ọ bụrụ na o gosi onwe ya dịka onye kwesiri ntụkwasị obi, otu agịrị isi dị ya nʼisi agaghị ada nʼala, ma ọ bụrụ na a hụta ihe ọjọọ na nʼaka ya, ọ ga-anwụ.”
53 Isu a nangibaon ni Solomon iti lallaki a mapan mangibaba kenni Adoniha manipud iti altar. Napan isuna ket nagtamed kenni Ari Solomon, ket kinuna ni Solomon kenkuana, “Agawidka.”
Mgbe ahụ, eze Solomọn, zigara ndị ozi mere ka o site nʼebe nchụaja rịdata. Adonaịja bịara kpọọ isiala nye eze Solomọn. Mgbe ahụ, Solomọn sịrị ya, “Laa nʼụlọ gị.”

< 1 Ar-ari 1 >