< Zefanaya 3 >

1 Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu, na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya.
Tsoka kwa mzinda wa anthu opondereza, owukira ndi odetsedwa!
2 Ọ naghị ege onye ọbụla ntị, ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị. Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi, ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso.
Sumvera aliyense, sulandira chidzudzulo. Sumadalira Yehova, suyandikira pafupi ndi Mulungu wake.
3 Ndịisi nọ nʼetiti ya dịka ọdụm na-agbọ ụja, ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị, nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ.
Akuluakulu ake ali ngati mikango yobuma, olamulira ake ndi olusa ngati mimbulu ya nthawi ya madzulo, zimene pofika mmawa sizisiya chilichonse.
4 Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ, ha bụkwa ndị aghụghọ. Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọ na-ejikwa ike emebi iwu.
Aneneri ake ndi odzikuza; anthu achinyengo. Ansembe ake amadetsa malo opatulika ndipo amaphwanya lamulo.
5 Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume. Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ. Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè; ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya, ma ndị ajọ omume enweghị ihere.
Yehova amene ali pakati pawo ndi wolungama; Iye salakwa. Tsiku ndi tsiku amaweruza molungama, ndipo tsiku lililonse salephera, komabe ochita zoyipa sachita manyazi nʼkomwe.
6 “Egbuchapụla m mba niile dị iche iche, kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike. Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ, ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga. A laala obodo ha niile nʼiyi, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.
“Ndachotseratu mitundu ya anthu; ndagwetsa malinga awo. Ndipo sindinasiye ndi mmodzi yemwe mʼmisewu mwawo, popanda aliyense wodutsa. Mizinda yawo yawonongedwa; palibe aliyense adzatsalemo.
7 Asịrị m, banyere Jerusalem, ‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m, ma nabatakwa ntụziaka.’ Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya, ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya. Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere.
Ndinati, ‘Ndithudi, anthu a mu mzindawu adzandiopa ndi kumvera kudzudzula kwanga!’ Ndipo sindidzawononga nyumba zawo, kapena kuwalanganso. Koma iwo anali okonzeka kuchita mwachinyengo zinthu zonse zimene amachita.
8 Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe. Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche, na ịkpọkọta alaeze niile, ịwụkwasị ha oke iwe m, ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m. Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m, ka a ga-eji rechapụ ụwa niile.
Choncho mundidikire,” akutero Yehova, “chifukwa cha tsiku limene ndidzaperekera umboni. Ndatsimikiza kusonkhanitsa pamodzi mitundu ya anthu, kusonkhanitsa maufumu ndi kutsanulira ukali wanga pa iwo; mkwiyo wanga wonse woopsa. Dziko lonse lidzatenthedwa ndi moto wa mkwiyo wa nsanje yanga.
9 “Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe.
“Pamenepo ndidzayeretsa milomo ya anthu a mitundu yonse kuti anthu onsewo ayitane dzina la Yehova ndi kumutumikira Iye pamodzi.
10 Site nʼofe osimiri niile nke Kush, bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche.
Kuchokera kutsidya kwa mitsinje ya ku Kusi anthu anga ondipembedza, omwazikana, adzandibweretsera zopereka.
11 Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị, nʼihi omume njehie niile i jere megide m, nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile na-aṅụrị ọṅụ na mpako ha. A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu nʼugwu nsọ m.
Tsiku limenelo simudzachita manyazi chifukwa cha zoyipa zonse munandichitira, popeza ndidzachotsa onse mu mzinda uwu amene amakondwera chifukwa cha kunyada kwawo. Simudzakhalanso odzikuza mʼphiri langa lopatulika.
12 Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa nʼaha Onyenwe anyị.
Koma ndidzasiya pakati panu anthu ofatsa ndi odzichepetsa, amene amadalira dzina la Yehova.
13 Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ, ha agaghị ekwu okwu ụgha. Ire na-ekwu okwu aghụghọ agaghị adịkwa nʼọnụ ha. Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.”
Aisraeli otsala sadzachitanso zolakwika; sadzayankhulanso zonama, ngakhale chinyengo sichidzatuluka mʼkamwa mwawo. Adzadya ndi kugona ndipo palibe amene adzawachititse mantha.”
14 Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem.
Imba, iwe mwana wamkazi wa Ziyoni; fuwula mokweza, iwe Israeli! Sangalala ndi kukondwera ndi mtima wako wonse, iwe mwana wamkazi wa Yerusalemu!
15 Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ.
Yehova wachotsa chilango chako, wabweza mdani wako. Yehova, Mfumu ya Israeli, ali pakati pako; sudzaopanso chilichonse.
16 Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba.
Pa tsiku limenelo adzanena kwa Yerusalemu kuti, “Usaope, iwe Ziyoni; usafowoke.
17 Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba, kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”
Yehova Mulungu wako ali pakati pako, ali ndi mphamvu yopulumutsa. Adzakondwera kwambiri mwa iwe, adzakukhalitsa chete ndi chikondi chake, adzayimba mokondwera chifukwa cha iwe.”
18 “Nʼụbọchị mmemme a kara aka, aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ, nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị.
“Ndidzakuchotserani zowawa za pa zikondwerero zoyikika; nʼzolemetsa ndi zochititsa manyazi.
19 Nʼoge ahụ, aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike. Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ, chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ. Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.
Taonani, nthawi imeneyo ndidzathana ndi onse amene anakuponderezani; ndidzapulumutsa olumala ndi kusonkhanitsa amene anamwazika. Ndidzawayamikira ndi kuwachitira ulemu mʼdziko lililonse mmene anachititsidwa manyazi.
20 Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ; mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ. Aga m eme ka unu na-ewu ewu ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa, mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu nʼihu anya unu.” Ka Onyenwe anyị kwuru.
Pa nthawi imeneyo ndidzakusonkhanitsani; pa nthawi imeneyo ndidzakubweretsani ku mudzi kwanu. Ndidzakuyamikirani ndi kukuchitirani ulemu pakati pa mitundu ya anthu a dziko lapansi pamene ndidzabwezeretsa mtendere wanu inu mukuona,” akutero Yehova.

< Zefanaya 3 >