< Zefanaya 2 >
1 Chịkọtaanụ onwe unu, e, chịkọtaanụ onwe unu, unu ndị mba ihe ihere dịrị.
Kusanyikeni pamoja ninyi wenyewe mkutano wa hadhara na kusanyikeni, taifa lisilokuwa na aibu -
2 Tupu ụkpụrụ ahụ ewere ọnọdụ, a chịpụ ụbọchị ahụ dịka igbugbo ọka nke ikuku na-ebufu, tupu iwe ọkụ Onyenwe anyị abịakwasị gị, tupu ụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị abịakwasị gị.
kabla amri kuchukua madhara na siku hiyo kupita kama makapi, kabla hasira kali ya ghadhabu ya Yahwe kuja juu yenu, kabla siku ya ghadhabu ya Bwana kuja juu yenu.
3 Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ, unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu. Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi, ma eleghị anya, a ga-echebe unu nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị.
Mtafuteni Yahwe, ninyi watu wote wanyenyekevu duniani mnaozitii amri zake! Tafuteni haki yake. Tafuteni unyenyekevu, na labda mtalindwa katika siku ya ghadhabu ya Yahwe.
4 Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza, obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu. Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd; a ga-ehopukwa Ekrọn.
hivyo Gaza utatelekezwa, na Ashkeloni utageuka kuwa uharibifu. Watauondoshea mbali Ashdodi wakati wa mchana, na wataung'oa Ekroni!
5 Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri, unu bụ ndị Keret; okwu Onyenwe anyị na-emegide unu, Kenan, ala ndị Filistia. Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi, ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.”
Ole kwa wanaokaa kando ya bahari, taifa la Wakerethi! Yahwe amesema dhidi yenu, Kanaani, nchi ya Wafilisiti. Nitawaangamiza hakuna mkazi atakayebakia.
6 Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ, ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ na ọgba igwe ewu na atụrụ.
Hiyo nchi ya kando ya bahari itakuwa malisho kwa wachungaji na kwa mazizi ya kondoo.
7 Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda, ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa. Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu, dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi. Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha, mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile.
Nchi ya kando ya bahari itakuwa mali ya mabaki ya watu wa nyumba ya Yuda, watakaochungia makundi yao huko. Watu wao watalala jioni katika nyumba ya Ashikeloni, kwa kuwa Yahwe Mungu wao atawatunza na kurejesha wafungwa wao.
8 “Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab, na ịkwa emo niile nke ndị Amọn, nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m na-anya isi na ha ga-ewere ala ha.
Nilizisikia dhihaka za Moabu na wakiwatukana watu wa Amoni wakati walipowadhihaki watu wangu na kujitukuza mipakani mwao.
9 Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwubiri ya, “aghaghị m ime ka Moab dịrị ka Sọdọm, mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra. Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara, na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha, ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha.”
Kwa hiyo, kama ninavyoishi - hili ni tamko la Yahwe wa majeshi, Mungu wa Israeli, - Moabu itakuja kuwa kama Sodoma, na watu wa Amoni kama Gomora; mahali pa viwavi na shimo la chumvi, jangwa la daima. Lakini watu wangu waliosalia watawateka mateka, na watu wa taifa langu waliobaki watachukua umiliki wao.'
10 Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha, na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Hili litatokea kwa Moabu na Amoni kwa sababu ya kiburi chao, tangu walipowadhihaki na kuwatukana watu wa Yahwe wa majeshi.
11 Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ, mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi. Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya, onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile.
Ndipo watamwogopa Yahwe, kwa kuwa ataidhihaki miungu yote ya dunia. Kila mmoja atamwabudu yeye, kila mmoja kutoka mahali pake, kutoka kila upande wa pwani.
12 “Unu ndị Itiopia, a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”
Ninyi Wakushi pia mtakufa kwa upanga wangu,
13 Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.
na mkono wa Mungu utaishambulia kaskazini na kuiangamiza Ashuru, Kwa hiyo Ninawi utatelekezwa kwa kuteketezwa, kuwa pakavu kama jangwa.
14 Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ, ha na ihe e kere eke dị iche iche. Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ. Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku, mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile, ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.
Ndipo makundi ya wanyama yatalala pale, kila mnyama wa mataifa, wote kirukanjia na nungunungu watapumzika juu ya safu zao. Sauti itasikika kutoka madirishani; kifusi kitakuwa milangoni; nakshi za mwerezi wao mihimili itakuwa imeifunua.
15 Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri, nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla; nke na-asị onwe ya, “Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.” Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu; lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi. Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ, ma fufekwaa isi ya.
huu ni mji wa kushangiliwa ambao umekaa pasipo hofu, ambaye husema moyoni mwake, “Mimi niko, na hakuna mwingine wa kufanana na Mimi”. Kwa namna ulivyokuwa wa kutisha, mahali pa kulala wanyama ndani yake. Kila mmoja ambaye hupitia kwake huuhisia na kutingisha ngumi kwake.