< Zefanaya 2 >

1 Chịkọtaanụ onwe unu, e, chịkọtaanụ onwe unu, unu ndị mba ihe ihere dịrị.
Rally yourselves together and gather, unashamed nation—
2 Tupu ụkpụrụ ahụ ewere ọnọdụ, a chịpụ ụbọchị ahụ dịka igbugbo ọka nke ikuku na-ebufu, tupu iwe ọkụ Onyenwe anyị abịakwasị gị, tupu ụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị abịakwasị gị.
before the decree takes effect and that day passes like the chaff, before the fierce anger of Yahweh's wrath comes upon you, before the day of the wrath of Yahweh comes upon you.
3 Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ, unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu. Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi, ma eleghị anya, a ga-echebe unu nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị.
Seek Yahweh, all you humble people on earth who obey his decrees! Seek righteousness. Seek humility, and perhaps you will be protected in the day of Yahweh's wrath.
4 Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza, obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu. Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd; a ga-ehopukwa Ekrọn.
For Gaza will be abandoned, and Ashkelon will turn into a devastation. They will drive out Ashdod at noon, and they will uproot Ekron!
5 Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri, unu bụ ndị Keret; okwu Onyenwe anyị na-emegide unu, Kenan, ala ndị Filistia. Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi, ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.”
Woe to the inhabitants of the seacoast, the nation of the Kerethites! Yahweh has spoken against you, Canaan, land of the Philistines. I will destroy you until no inhabitant remains.
6 Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ, ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ na ọgba igwe ewu na atụrụ.
So the seacoast will become pastures for shepherds and for sheep pens.
7 Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda, ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa. Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu, dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi. Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha, mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile.
The coastal region will belong to the remnant of the house of Judah, who will shepherd their flocks there. Their people will lie down in the evening in the houses of Ashkelon, for Yahweh their God will care for them and restore their fortunes.
8 “Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab, na ịkwa emo niile nke ndị Amọn, nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m na-anya isi na ha ga-ewere ala ha.
“I have heard the taunts of Moab and the reviling of the people of Ammon when they taunted my people and violated their borders.
9 Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwubiri ya, “aghaghị m ime ka Moab dịrị ka Sọdọm, mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra. Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara, na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha, ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha.”
Therefore, as I live—this is the declaration of Yahweh of hosts, God of Israel— Moab will become like Sodom, and the people of Ammon like Gomorrah; a place of nettles and a salt pit, deserted forever. But the remnant of my people will plunder them, and the remainder of my nation will take possession of them.”
10 Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha, na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
This will happen to Moab and Ammon because of their pride, since they taunted and mocked the people of Yahweh of hosts.
11 Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ, mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi. Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya, onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile.
Then they will fear Yahweh, for he will taunt all the gods of the earth. Everyone will worship him, everyone from his own place, from every seashore.
12 “Unu ndị Itiopia, a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”
You Cushites also will be pierced by my sword,
13 Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.
and God's hand will attack the north and destroy Assyria, so that Nineveh will become an abandoned devastation, as dry as the desert.
14 Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ, ha na ihe e kere eke dị iche iche. Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ. Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku, mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile, ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.
Then herds will lie down there, every animal of the nations, both the desert owl and the screech owl will rest in the top of her columns. A call will sing out from the windows; rubble will be in the doorways; her carved cedar beams will be exposed.
15 Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri, nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla; nke na-asị onwe ya, “Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.” Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu; lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi. Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ, ma fufekwaa isi ya.
This is the exultant city that lived without fear, that said in her heart, “I am, and nothing is my equal.” How she has become a horror, a place for beasts to lie down in. Everyone that passes by her will hiss and shake his fist at her.

< Zefanaya 2 >