< Zefanaya 1 >

1 Nke a dịrị onyeisi abụ, nʼụbọ akwara m dị iche iche. Okwu Onyenwe anyị nke rutere Zefanaya, nwa Kushi, nwa nwa Gedaliya, bụ nwa Amaraya. Amaraya bụ nwa Hezekaya. Ozi a bịara nʼoge Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda.
Wuta na buku ya motambolisi banzembo. Babetaki yango na mandanda. Na tango Joziasi, mwana mobali ya Amoni, azalaki mokonzi ya mokili ya Yuda, Yawe alobaki na Sofoni, mwana mobali ya Kushi, mwana mobali ya Gedalia, mwana mobali ya Amaria, mwana mobali ya Ezekiasi:
2 “Aga m azachapụ ihe niile site nʼelu ụwa,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
« Nakosilisa kobebisa biloko nyonso oyo ezali kati na mokili, » elobi Yawe,
3 “Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ. Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe, zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri, na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.” “Mgbe m kpochapụrụ mmadụ niile site nʼelu ụwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
« solo, nakoboma ezala bato to banyama, ezala bandeke ya likolo to bambisi ya ebale; nakolongola, na mokili, bato mabe mpe biloko oyo ebetisaka bato mabaku » elobi Yawe.
4 “Aga m esetipụ aka m megide Juda, megidekwa ndị niile bi na Jerusalem. Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a, na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị,
« Nakosembola loboko na Ngai mpo na kopesa mokili ya Yuda mpe bavandi nyonso ya Yelusalemi etumbu; nakosilisa koboma, na esika oyo, nyonso oyo etikali, ya losambo ya nzambe Bala elongo na bakombo ya banganga-nzambe ya bapagano, oyo basalelaka banzambe ya bikeko:
5 bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando, ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi, ma na-ejikwa Milkọm na-aṅụ iyi,
bato nyonso oyo bafukamaka na likolo ya bandako mpo na kosambela mampinga ya likolo, bato nyonso oyo bagumbamaka na kolapa ndayi na Kombo na Yawe mpe na kombo na nzambe Moloki,
6 na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.”
bato nyonso oyo bapesaka Yawe mokongo, oyo balukaka Ye te mpe batunaka Ye te.
7 Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso. Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja; o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ.
Bovanda kimia liboso ya Nkolo Yawe, pamba te mokolo ya Yawe ekomi pene! Yawe abongisi mbeka, abulisi babengami na Ye.
8 “Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ, aga m ata ndịisi niile na ụmụ eze niile, na ndị niile na-eyi uwe e si na mba ọzọ bubata ahụhụ.
Na mokolo ya mbeka ya Yawe, nakopesa etumbu epai ya bakambi, epai ya bana mibali ya mokonzi mpe epai ya bato nyonso oyo balataka bilamba ya bapaya.
9 Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụ bụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata, ndị ji ihe ike na aghụghọ na-emejupụta ụlọ arụsị ha.
Na mokolo wana, nakopesa etumbu epai ya bato nyonso oyo bapumbwaka ekotelo ya tempelo, bato oyo batondisaka tempelo ya banzambe na bango ya bikeko na makambo ya kanza mpe na lokuta.
10 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa, mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ, na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile.
Na mokolo wana, » elobi Yawe, « koganga makasi ekoyokana wuta na Ekuke ya Bambisi, kolela ekoyokana wuta na Mboka ya sika mpe lokito monene wuta na bangomba mikuse.
11 Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị; nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile. Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi.
Bino bavandi ya etuka Makiteshi, bolela, pamba te bato nyonso ya mombongo bakokufa, mpe bato nyonso oyo batekaka palata bakobebisama!
12 Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem. Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ, bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ, ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị, maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’
Na tango wana, nakoluka engumba Yelusalemi na nzela ya mwinda, nakopesa etumbu epai ya bato nyonso oyo bamimonaka ete bakoka mpe bamilobelaka: ‹ Yawe asalaka na Ye eloko te, ezala ya malamu to ya mabe. ›
13 Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike, a ga-akwatukwa ụlọ ha niile. Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi nʼime ha; ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.”
Bakobotola bango bomengo na makasi mpe bakobuka bandako na bango; bakotonga bandako, kasi bakotikala kovanda yango te; bakosala bilanga ya vino, kasi bakotikala komela vino na yango te. »
14 Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso, ọ na-abịakwa ọsịịsọ. Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu. A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ.
Mokolo monene ya Yawe ekomi pene, solo ekomi pene mpe ezali koya noki penza. Boyoka! Makelele ya mokolo na Yawe ekozala bololo; ezala basoda ya mpiko, bakoganga mpo na koluka lisungi.
15 Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nsogbu na mbibi, ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ, ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,
Mokolo yango ekozala mokolo ya kanda makasi, mokolo ya pasi mpe ya somo, mokolo ya komitungisa mpe ya kobebisama, mokolo ya butu mpe ya molili makasi, mokolo ya mapata mpe mapata ya mwindo,
16 ụbọchị opi ike na iti mkpu agha imegide obodo niile e wusiri ike, na imegide akụkụ ụlọ elu niile.
mokolo ya kobeta bakelelo mpe ya makelele ya bitumba mpo na kobundisa bingumba batonga makasi mpe bandako milayi oyo batonga makasi.
17 “Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ, mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì, nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị. A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu, tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ.
Nakotindela bato pasi ya makasi: bakokoma kotambola lokola bato balangwe masanga, pamba te basalaki masumu liboso ya Yawe; bakopanza makila na bango lokola putulu mpe bakobwaka misopo na bango lokola salite.
18 Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị azọpụta ha nʼụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị ahụ.” A ga-erechapụ ụwa niile site nʼọkụ ekworo ya, nʼihi na ọ bụ na mberede ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.
Na mokolo ya kanda na Yawe, ezala palata to wolo na bango ekobikisa bango te. Na moto ya zuwa na Ye, mokili mobimba ekozikisama, pamba te akosukisa na mbalakata bavandi nyonso ya mokili.

< Zefanaya 1 >