< Zekaraya 9 >
1 Okwu Amụma. Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak, na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike, nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile na ebo niile nke Izrel dị.
Hili ni tamko la neno la Yahwe kuhusu nchi ya Hadraki na Damesiki. Kwa maana jicho la Yahwe liko juu ya wanadamu wote, na juu ya kabila zote za Israeli pia.
2 Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso; tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.
Azimio hili pia linaihusu Hamathi, inayopakana na Damesiki, na linahusu Tiro na Sidoni, japokuwa ni werevu sana.
3 Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike, tụkọba ọlaọcha dịka aja, na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.
Tiro amejijengea ngome na kurundika fedha kama mavumbi na dhahabu safi kama matope mitaani.
4 Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri, ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.
Tazama! Bwana atamnyang'anya na kuharibu nguvu zake juu ya bahari, kwa hiyo atateketezwa kwa moto.
5 Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme. Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu. Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla. A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya. Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.
Ashikeloni ataona na kuogopa! Gaza pia atatemeka sana! Ekroni, tumanini lake litatikiswa! Mfalme ataangamizwa kuanzia Gaza, na Ashikeloni haitakuwa na watu tena!
6 Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd, aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị.
Wageni watafanya makao yao katika Ashidodi, nami nitakiondoa kiburi cha Wafilisiti.
7 Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha, wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya. Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị, ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda. Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus.
Kwani nitaondoa damu yao katika vinywa vyao na machukizo yao kutoka kati ya meno yao. Ndipo watakapokuwa masalia kwa Mungu wetu kama ukoo katika Yuda, na Ekironi atakuwa kama Wayebusi.
8 Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche, ka ndị iro ghara ịbata na ya. Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha, nʼihi na anọ m na nche ugbu a.
Nitaweka kambi kuzunguka nchi yangu kinyume cha majeshi ya adui hata hakuna atakayeweza kupita ndani yake tena, kwani hakuna mtesaji atakayeipita tena. Kwa kuwa sasa nitaangalia nchi yangu kwa macho yangu mwenyewe!
9 Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn! Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem! Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị, onye ezi omume na onye nwere mmeri, onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.
Piga kelele kwa furaha, ewe binti Sayuni! Piga kelele kwa shangwe, ewe binti Yerusalem! Tazama! Mfalme wako anakuja kwako pamoja na uadilifu na anakuokoa. Ni mnyenyekevu, amepanda punda, mwanapunda.
10 Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem, na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem; a ga-agbajikwa ụta agha. Ọ ga-ewetara mba niile udo, ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa.
Ndipo nitakapoondoa kibandawazi kutoka Efraimu na farasi kutoka Yerusalemu, na upinde utaondolewa katika vita; kwani atasema amani kwa mataifa, na utawala wake utakuwa kutoka bahari hata bahari, na kutoka katika mto hadi miisho ya dunia!
11 Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha, nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara.
Lakini kwenu, kwa sababu ya damu ya agano langu nanyi, nitawaweka wafungwa wenu huru kutoka shimoni pasipo na maji.
12 Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya. Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ.
Rudini ngomeni, wafungwa wa matumaini! Hata leo natamka kwamba nitawarudishia mara mbili, kwani nimempinda Yuda kama upinde wangu.
13 Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m, tinye Ifrem dịka àkụ. Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn, ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis. Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha.
Hata nimelijaza podo langu pamoja na Efraimu. Nimewainua wana wenu, Sayuni, kinyume cha wana wenu, Ugiriki, na amekufanya wewe, Sayuni, kama upanga wa shujaa!
14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha, àkụ ya ga-efekwa dịka amụma. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike, ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.
Yahwe atawatokea, na mishale yake itapiga kama radi! Kwa maana Yahwe Bwana wangu atapiga tarumbeta naye ataendelea pamoja na dhoruba kutoka Temani.
15 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha. Ha ga-ebibi, zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile. Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya; ha ga-ejupụta dịka efere, dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta.
Yahwe wa majeshi atawatetea, nao watawararua na kuyashinda mawe ya kombeo. Ndipo watakapo kunywa na kupiga kelele kama mtu aliyelewa kwa mvunyo, nao watajazwa na mvinyo kama mabakuri, kama pembe za madhabahu.
16 Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya, dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya. Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa e tinyere nʼokpueze si na-egbuke.
Hivyo Yahwe Mungu wao atawaokoa siku hiyo; watakuwa kama kundi la kondoo lililo na watu wake, kwani watakuwa mapambo ya taji, yaliyoinuliwa juu ya nchi yake.
17 Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu! Mkpụrụ ubi ga-eme ka ụmụ okorobịa tozuo oke nke ọma, mmanya vaịnị ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ doo ahụ.
Jinsi gani watakavyokuwa wazuri na warembo! vijana watastawi juu ya nafaka na bikra juu ya divai tamu!