< Zekaraya 7 >
1 Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu nke Onyenwe anyị ruru Zekaraya ntị nʼụbọchị nke anọ, nʼọnwa nke itoolu, nke bụ ọnwa Kislev.
A I ka ha o ka makahiki o ke alii o Dariu, hiki mai la ka olelo a Iehova ia Zekaria, i ka po aha o ka iwa o ka malama, o Kiseleu;
2 Nʼoge a, ndị bi nʼobodo Betel ezitela Shareza, na Regem Melek, ha na ndị ọzọ ka ha bịa rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ,
I ka wa i hoouna mai ai lakou ia Serezera laua o Regemeleka, a me na kanaka o laua i ka hale o ke Akua, e pule imua o Iehova,
3 ka ọ jụkwaa ndị nchụaja nọ nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndị amụma, sị, “Ọ bụ m ruo ụjụ, bukwaa ọnụ nʼọnwa nke ise, dịka m si eme kemgbe ọtụtụ afọ ndị a gara aga?”
A e ninau aku i na kahuna o ka hale o Iehova o na kaua, a i na kaula, penei, E kanikau anei au i ka lima o ka malama e hookeai ana, me ka'u i hana'i i keia mau makahiki he nui?
4 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị,
Alaila, hiki mai la ka olelo a Iehova o na kaua ia'u, i ka i ana mai,
5 “Gwanụ ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a, ‘Mgbe unu na-ebu ọnụ nʼọnwa nke ise ọbụla, na nʼọnwa nke asaa ọbụla, iri afọ asaa ndị a niile gara aga, ọ bụ mụ ka unu na-eburu ọnụ?
E hai aku oe i keia mau mea i na kanaka a pau o ka aina, a i na kahuna hoi, penei, Ia oukou i hokeai ai a i kanikau ai i ka lima a me ka hiku o ka malama, a pau kela mau makahiki he kanahiku, i hookeai iki anei oukou no'u?
6 Mgbe unu na-eri na-aṅụkwa, ọ bụ na unu anaghị eme ya maka nʼihi onwe unu?
A ia oukou i ai ai, a i inu ai hoi, aole anei oukou i ai no oukou iho? a i ko oukou inu ana, aole anei oukou i inu no oukou iho?
7 Ihe ndị a ha ọ bụghị okwu niile Onyenwe anyị kpọsara site nʼọnụ ndị amụma mbụ, mgbe Jerusalem na obodo niile dị ya gburugburu nọ nʼudo nwekwa ọganihu, nʼoge ndị mmadụ bi na Negev, ya na ala ndịda ugwu niile?’”
Aole anei keia na olelo a Iehova i hea mai ai ma na kaula mua, i ka wa i nohoia'i o Ierusalema me ka maluhia, a me na kulanakauhale ona e kokoke ana, i ka wa i noho ai na kanaka ma ka aoao hema a ma ka papu?
8 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru Zekaraya ntị na-asị,
A hiki mai la ka olelo a Iehova ia Zekaria, i mai la,
9 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi, meerenụ ibe unu ebere, ma gosikwa ibe unu ọmịiko.
Penei ka Iehova o na kaua e olelo mai nei, E hoopono oukou, a e hoomaopopo kela kanaka keia kanaka i ka lokomaikai a me ko aloha i kona hoahanau.
10 Unu emegbula ụmụ nwanyị di ha nwụrụ maọbụ nwa na-enweghị nne na nna maọbụ ndị ọbịa maọbụ ndị ogbenye. Unu echela echiche ọjọọ nʼobi unu megide ibe unu.’
Mai hana ino i ka wahinekanemake, aole hoi i ke keiki makua ole, aole i ka malihini, aole hoi i ka ilihune, aole hoi e manao ino aku ka naau o kekahi i kona hoahanau.
11 “Ma ha jụrụ ige ntị; ha sitere nʼobiike ha gbakụta m azụ ha, were mkpịsịaka rụchie ntị ha, ka ha ghara ige m ntị.
Aka, hoole lakou i ka hoolohe, a haawi i ka poohiwi kipi a papani ae la i ua pepeiao o lakou, i lohe ole ai lakou.
12 Ha mere ka obi ha sie ike dịka nkume, jụ ige ntị nʼiwu, na nʼokwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sitere na Mmụọ ya zie ndị amụma mbụ ahụ. Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile were oke iwe.
A hoopaakiki iho la i ka lakou mau naau pohaku adama, o lohe auanei lakou i ke kanawai, a me na olelo a Iehova o na kaua i hoouna mai ma kona Uhane, ma na kaula mua: nolaila, kau mai la ka inaina nui o Iehova o na kaua.
13 “‘Ebe ọ bụ na mgbe m kpọrọ ha, ha egeghị ntị, agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọ m,’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
No ia mea, me ka lakou i hoolohe ole ai ia e kahea aku ana, pela hoi lakou i kahea mai ai, aole hoi au i hoolohe aku, wahi a Iehova o na kaua.
14 ‘Eji m oke ifufe gbasasịa ha nʼetiti mba niile, ndị ha na-amaghị. Emere m ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụ inwe ike ịpụ maọbụ ịbata nʼime ya. Otu a ka ha si mee ka ala ọma ahụ ghọọ ala tọgbọrọ nʼefu.’”
Aka, hoopuehu aku la au ia lakou iwaena o na lahuikanaka a pau a lakou i ike ole ai; a ua neoneo ka aina mahope o lakou, i hiki ole ai i kekahi e hele ilaila, aole hoi e hoi ae: no ka mea, ua hooneoneoia ka aina maikai.