< Zekaraya 7 >

1 Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu nke Onyenwe anyị ruru Zekaraya ntị nʼụbọchị nke anọ, nʼọnwa nke itoolu, nke bụ ọnwa Kislev.
And it came to pass, in the fourth year of King Darius, that the word of Jehovah came to Zechariah, on the fourth day of the ninth month, even in Chisleu;
2 Nʼoge a, ndị bi nʼobodo Betel ezitela Shareza, na Regem Melek, ha na ndị ọzọ ka ha bịa rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ,
when they had sent to the house of God Sherezer and Regem-melech, and their men, to pray before Jehovah,
3 ka ọ jụkwaa ndị nchụaja nọ nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndị amụma, sị, “Ọ bụ m ruo ụjụ, bukwaa ọnụ nʼọnwa nke ise, dịka m si eme kemgbe ọtụtụ afọ ndị a gara aga?”
and to speak to the priests that were in the house of Jehovah of hosts, and to the prophets, saying, “Shall I weep in the fifth month, separating myself, as I have done these so many years?”
4 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị,
Then came the word of Jehovah of hosts to me, saying,
5 “Gwanụ ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a, ‘Mgbe unu na-ebu ọnụ nʼọnwa nke ise ọbụla, na nʼọnwa nke asaa ọbụla, iri afọ asaa ndị a niile gara aga, ọ bụ mụ ka unu na-eburu ọnụ?
Speak to all the people of the land, and to the priests, saying, When ye fasted and mourned in the fifth month and in the seventh month, even those seventy years, did ye at all fast for me, even for me?
6 Mgbe unu na-eri na-aṅụkwa, ọ bụ na unu anaghị eme ya maka nʼihi onwe unu?
And when ye eat and drink, is it not ye that eat, and ye that drink?
7 Ihe ndị a ha ọ bụghị okwu niile Onyenwe anyị kpọsara site nʼọnụ ndị amụma mbụ, mgbe Jerusalem na obodo niile dị ya gburugburu nọ nʼudo nwekwa ọganihu, nʼoge ndị mmadụ bi na Negev, ya na ala ndịda ugwu niile?’”
Are not these the words which Jehovah proclaimed by the former prophets, when Jerusalem was inhabited and in prosperity, and her cities round about her, and when the South and the Plain were inhabited?
8 Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru Zekaraya ntị na-asị,
And the word of Jehovah came to Zechariah, saying,
9 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi, meerenụ ibe unu ebere, ma gosikwa ibe unu ọmịiko.
Thus spake Jehovah of hosts, saying, Judge true judgment, and show mercy and compassion every man to his brother.
10 Unu emegbula ụmụ nwanyị di ha nwụrụ maọbụ nwa na-enweghị nne na nna maọbụ ndị ọbịa maọbụ ndị ogbenye. Unu echela echiche ọjọọ nʼobi unu megide ibe unu.’
And the widow, and the orphan, and the stranger, and the poor, oppress not, and meditate not evil against one another in your heart.
11 “Ma ha jụrụ ige ntị; ha sitere nʼobiike ha gbakụta m azụ ha, were mkpịsịaka rụchie ntị ha, ka ha ghara ige m ntị.
But they refused to hearken, and showed a refractory shoulder, and made their ears dull, that they might not hear;
12 Ha mere ka obi ha sie ike dịka nkume, jụ ige ntị nʼiwu, na nʼokwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sitere na Mmụọ ya zie ndị amụma mbụ ahụ. Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile were oke iwe.
yea, they made their hearts as an adamant stone, that they might not hear the law, and the words which Jehovah of hosts sent through his spirit by the former prophets. Therefore came great anger from Jehovah of hosts.
13 “‘Ebe ọ bụ na mgbe m kpọrọ ha, ha egeghị ntị, agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọ m,’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
And as he called and they would not hear, so they called and I would not hear, saith Jehovah of hosts.
14 ‘Eji m oke ifufe gbasasịa ha nʼetiti mba niile, ndị ha na-amaghị. Emere m ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụ inwe ike ịpụ maọbụ ịbata nʼime ya. Otu a ka ha si mee ka ala ọma ahụ ghọọ ala tọgbọrọ nʼefu.’”
And I scattered them as with a whirlwind among all the nations, which they knew not. And the land was desolate after them, so that no man passed through, nor returned; and thus the beautiful land was made a desolation.

< Zekaraya 7 >