< Zekaraya 6 >
1 Elelikwara m anya elu ọzọ hụ ụgbọ ịnyịnya anọ nke si nʼetiti ugwu abụọ na-apụta. Ugwu ndị a bụ ugwu e ji bronz mee.
Ndakasimudzazve meso angu ndikaona, hapo pamberi pangu paiva nengoro ina dzaibuda kubva pakati pamakomo maviri, makomo endarira!
2 Ụgbọ ịnyịnya nke mbụ ka ịnyịnya na-acha ọbara ọbara na-adọkpụ. Nke abụọ ka ịnyịnya na-eji nji na-adọkpụ.
Ngoro yokutanga yakanga ine mabhiza matsvuku, yechipiri ine matema,
3 Nke atọ ka ịnyịnya dị ọcha na-adọkpụ, ma nke anọ ka ịnyịnya tụrụ agwa siekwa ike na-adọkpụ.
yechitatu ine machena uye yechina ine mapfumbu, ose aiva nesimba.
4 Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Gịnị ka ihe ndị a bụ, nna m ukwu?”
Ndakabvunza mutumwa akanga achitaura neni ndikati, “Zviiko izvi, ishe wangu?”
5 Mmụọ ozi ahụ zara m, sị, “Ndị a bụ mmụọ anọ nke eluigwe, ka ha na-apụ mgbe ha guzochara nʼihu Onyenwe elu ụwa niile.
Mutumwa akandipindura akati, “Iyi ndiyo mweya mina yokudenga, inobuda payakanga imire pamberi paIshe wenyika yose.
6 Ụgbọala nke ịnyịnya ndị dị oji na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ugwu. Nke ịnyịnya ndị dị ọcha na-adọkpụ na-aga nʼọdịda anyanwụ. Nke ahụ ndị ịnyịnya na-adịghị ezi ọcha na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ndịda.”
Ine mabhiza matema iri kuenda kunyika yokumusoro, ine mabhiza machena iri kuenda kumadokero, uye ine mabhiza mapfumbu iri kuenda kunyika yezasi.”
7 Mgbe ịnyịnya ndị ahụ dị ike pụtara, chọọ ka e nye ha ike ijegharị nʼụwa niile, ọ gwara ha sị, “Gaanụ jegharịa nʼụwa niile.” Nʼihi ya, ha pụrụ jegharịa nʼụwa niile.
Mabhiza ane simba paakabuda akanga achitsvaka kuti aende nomunyika yose. Uye iye akati, “Endai munyika yose!” Saka akaenda nomunyika yose.
8 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Ndị ahụ jere nʼakụkụ ugwu emeela ka Mmụọ m dajụọ nʼala dị nʼakụkụ ugwu.”
Ipapo akadanidzira kwandiri achiti, “Tarira, ayo anoenda kunyika yokumusoro, apa Mweya wangu zororo munyika yokumusoro.”
9 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Shoko raJehovha rakasvika kwandiri richiti,
10 “Gaa nata Heldai, Tobaija na Jedaya, ndị a dọtara nʼagha si Babilọn lọta ọlaọcha na ọlaedo. Nʼotu ụbọchị ahụ, gakwaa nʼụlọ Josaya nwa Zefanaya.
“Tora sirivha negoridhe kubva kuvatapwa vanoti Heridhai, naTobhiya uye naJedhaya, vasvika vachibva kuBhabhironi. Enda, zuva rimwe chetero, kuimba yaJosia mwanakomana waZefania.
11 Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi.
Tora sirivha negoridhe ugadzire korona, uye ugoidzika pamusoro womuprista mukuru, Joshua mwanakomana waJehozadhaki.
12 Gwa ya na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nke a bụ nwoke ahụ aha ya bụ Ngalaba. Ọ ga-esi nʼebe nke ya wapụta wuo ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Muudze kuti zvanzi naJehovha Wamasimba Ose: ‘Houno murume anonzi Davi, achakura panzvimbo yake uye achavaka temberi yaJehovha.
13 Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’
Ndiye achavaka temberi yaJehovha, uye achapfekedzwa ukuru agogara achitonga pachigaro chake. Uye achava muprista pachigaro chake. Uye pachava norugare pakati pezviviri izvi.’
14 Okpueze ahụ ka a ga-enye Heldaya, Tobaija, Jedaya na Hen, nwa Zefanaya, ka ọ bụrụ ihe ncheta nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Korona ichapiwa kuna Heridhai, naTobhiya, naJedhaya uye naHeni mwanakomana waZefania sechiyeuchidzo mutemberi yaJehovha.
15 Ndị nọ nʼebe dị anya ga-esi ebe ahụ bịa nye aka nʼọrụ iwu ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Unu ga-amatakwa na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu. Ihe ndị a niile ga-eme ma ọ bụrụ na unu akpachapụ anya rubere Onyenwe anyị Chineke unu isi.”
Avo vari kure vachauya kuzobatsira kuvaka temberi yaJehovha, uye iwe uchaziva kuti Jehovha Wamasimba Ose andituma kwauri. Izvi zvichaitika kana ukateerera zvakanaka Jehovha Mwari wako.”