< Zekaraya 6 >

1 Elelikwara m anya elu ọzọ hụ ụgbọ ịnyịnya anọ nke si nʼetiti ugwu abụọ na-apụta. Ugwu ndị a bụ ugwu e ji bronz mee.
Again I looked up, and saw four chariots come from between two mountains. The mountains were mountains of bronze.
2 Ụgbọ ịnyịnya nke mbụ ka ịnyịnya na-acha ọbara ọbara na-adọkpụ. Nke abụọ ka ịnyịnya na-eji nji na-adọkpụ.
The first chariot had red horses. The second chariot had black horses,
3 Nke atọ ka ịnyịnya dị ọcha na-adọkpụ, ma nke anọ ka ịnyịnya tụrụ agwa siekwa ike na-adọkpụ.
the third chariot white horses, and the fourth chariot dappled horses.
4 Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Gịnị ka ihe ndị a bụ, nna m ukwu?”
Then I said to the messenger who talked with me, “What are these, my lord?”
5 Mmụọ ozi ahụ zara m, sị, “Ndị a bụ mmụọ anọ nke eluigwe, ka ha na-apụ mgbe ha guzochara nʼihu Onyenwe elu ụwa niile.
The messenger answered me, “These are the four winds of heaven going out after standing before the Lord of all the earth.
6 Ụgbọala nke ịnyịnya ndị dị oji na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ugwu. Nke ịnyịnya ndị dị ọcha na-adọkpụ na-aga nʼọdịda anyanwụ. Nke ahụ ndị ịnyịnya na-adịghị ezi ọcha na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ndịda.”
The black horses are going toward the north country and the white toward the west and the dappled toward the south country.”
7 Mgbe ịnyịnya ndị ahụ dị ike pụtara, chọọ ka e nye ha ike ijegharị nʼụwa niile, ọ gwara ha sị, “Gaanụ jegharịa nʼụwa niile.” Nʼihi ya, ha pụrụ jegharịa nʼụwa niile.
The strong horses came out, and were impatient to patrol the earth. So he said, “Go, patrol the earth,” and they did so.
8 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Ndị ahụ jere nʼakụkụ ugwu emeela ka Mmụọ m dajụọ nʼala dị nʼakụkụ ugwu.”
Then he cried out to me, “The horses that went to the north country will quiet my spirit in the north country.”
9 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Now this message of the Lord came to me:
10 “Gaa nata Heldai, Tobaija na Jedaya, ndị a dọtara nʼagha si Babilọn lọta ọlaọcha na ọlaedo. Nʼotu ụbọchị ahụ, gakwaa nʼụlọ Josaya nwa Zefanaya.
Take the gifts from the exiles Heldai, Tobijah and Jedaiah who have come from Babylon and go at once to Josiah the son of Zephaniah.
11 Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi.
Take their silver and gold and make a crown and set it on the head of the high priest, Joshua son of Jehozadak.
12 Gwa ya na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nke a bụ nwoke ahụ aha ya bụ Ngalaba. Ọ ga-esi nʼebe nke ya wapụta wuo ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Tell him: “Thus says the Lord of hosts: Behold, the man whose name is the Branch. He will branch out from his place and rebuild the temple of the Lord.
13 Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’
He will rebuild the temple and will sit and rule upon his throne, receiving the honor due to a king. A priest will stand by his throne and they will work together in peace and harmony.
14 Okpueze ahụ ka a ga-enye Heldaya, Tobaija, Jedaya na Hen, nwa Zefanaya, ka ọ bụrụ ihe ncheta nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
The crown will be a memorial in the temple of the Lord for Heldai and Tobijah and Jedaiah, and Josiah the son of Zephaniah.
15 Ndị nọ nʼebe dị anya ga-esi ebe ahụ bịa nye aka nʼọrụ iwu ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Unu ga-amatakwa na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu. Ihe ndị a niile ga-eme ma ọ bụrụ na unu akpachapụ anya rubere Onyenwe anyị Chineke unu isi.”
People from far away will come and build in the temple of the Lord and you will know that the Lord of hosts has sent me to you. This will happen if you diligently obey the voice of the Lord your God.”

< Zekaraya 6 >