< Zekaraya 3 >

1 Mgbe ahụ, o gosiri m Joshua onyeisi nchụaja ka ọ na-eguzo nʼihu mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, na ekwensu ka ọ na-eguzo nʼaka nri ya ibo ya ebubo.
Yawe alakisaki ngai Jozue, mokonzi ya Banganga-Nzambe, oyo azalaki ya kotelema liboso ya Anjelu ya Yawe. Alakisaki ngai lisusu Satana oyo azalaki ya kotelema na ngambo ya loboko ya mobali ya Jozue mpo na kofunda ye.
2 Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Onyenwe anyị basiere gị mba ike, gị ekwensu. Onyenwe anyị, onye họpụtara Jerusalem, basiere gị mba ike. Nwoke a, ọ bụghị ọlọkọ ọkụ na-ere ere, nke e si nʼime ọkụ gụpụta?”
Yawe alobaki na Satana: — Satana, tika ete Yawe apamela yo! Tika ete Yawe oyo apona Yelusalemi apamela yo! Boni, moto oyo azali te lokola koni ya moto oyo balongoli na moto?
3 Mgbe Joshua guzo nʼihu mmụọ ozi ahụ, uwe ya ruru unyi.
Nzokande, Jozue alataki bilamba ya salite tango atelemaki liboso ya Anjelu.
4 Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ahụ guzo ya nʼihu, “Yipụnụ ya uwe a ruru unyi.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya okwu sị, “Lee, ewepụla m mmehie gị, ma ugbu a, aga m eyikwasị gị uwe mmemme ndị a.”
Bongo Anjelu alobaki na ba-oyo bazalaki kotelema liboso na ye: — Bolongola ye bilamba wana ya salite! Mpe alobaki na Jozue: — Tala, nalongoli masumu na yo mpe nakolatisa yo bilamba ya talo.
5 Ekwuru m, “Ka ha were ezi akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi.” Ya mere ha weere akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi, yikwasịkwa ya uwe ọhụrụ. Mmụọ ozi Onyenwe anyị guzokwa nʼebe ahụ.
Nalobaki: — Bolatisa ye kitendi ya peto oyo bakangaka na moto. Boye, bakangaki ye kitendi ya peto na moto mpe balatisaki ye bilamba mosusu wana Anjelu ya Yawe atelemaki pene na ye.
6 Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nyere Joshua ndụmọdụ sị,
Anjelu ya Yawe ayebisaki na Jozue maloba oyo:
7 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ bụrụ na i jee ije nʼụzọ m niile, ọ bụrụkwa na i debe ihe niile m nyere gị nʼiwu, ị ga-abụ onyeisi ezinaụlọ m, ị ga-elekọta ụlọnsọ m anya, aga m enyekwa gị ọnọdụ nʼetiti ndị a niile guzo nʼebe a.
— Tala liloba oyo Yawe, Mokonzi ya mampinga, alobi: « Soki otamboli na nzela na Ngai mpe obateli mitindo na Ngai, okokamba ndako na Ngai mpe okobatela lopango na Ngai, mpe nakotia yo na molongo ya ba-oyo batelemaka awa.
8 “‘Gee m ntị, gị Joshua, onyeisi nchụaja na unu ndị nchụaja ndị ọzọ nọ nʼihu gị, ndị bụ ihe ngosi banyere ihe ọma niile nke gaje ịbịa. Agaje m ịkpọta nwaodibo m, onye bụ Ngalaba ahụ.
Jozue, mokonzi ya Banganga-Nzambe, yo elongo na bandeko na yo, Banganga-Nzambe oyo basalaka elongo na yo, bozali bilembo oyo etalisaka makambo oyo ekoya. Nakobimisa Mosali na Ngai; bakobenga Ye: Moto ya nzete oyo ebimaka na mobimbi.
9 Lee, nkume nke m guzobere nʼihu Joshua. Nkume ahụ nwere akụkụ asaa nʼahụ ya, aga m egbunye akara dee ihe nʼelu ya. Aga m ewezugakwa mmehie nke ala a nʼotu ụbọchị.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Tala, natie libanga liboso ya Jozue. Libanga yango ezali na miso sambo, nakokoma makomi na likolo na yango, » elobi Yawe, Mokonzi ya mampinga, « mpe nakolongola masumu ya mokili oyo na mokolo moko.
10 “‘Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-akpọbata mmadụ ibe ya, ka ọ bịa soro ya nọdụ nʼokpuru osisi vaịnị ya, na nʼokpuru osisi fiig ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”
Na mokolo wana, moko na moko kati na bino akobengisa moninga na ye mpo ete bavanda na se ya nzete ya vino mpe ya figi, » elobi Yawe, Mokonzi ya mampinga.

< Zekaraya 3 >