< Zekaraya 3 >

1 Mgbe ahụ, o gosiri m Joshua onyeisi nchụaja ka ọ na-eguzo nʼihu mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, na ekwensu ka ọ na-eguzo nʼaka nri ya ibo ya ebubo.
He showed me Joshua the high priest standing before the angel of Jehovah, and Satan standing at his right hand to be his adversary.
2 Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Onyenwe anyị basiere gị mba ike, gị ekwensu. Onyenwe anyị, onye họpụtara Jerusalem, basiere gị mba ike. Nwoke a, ọ bụghị ọlọkọ ọkụ na-ere ere, nke e si nʼime ọkụ gụpụta?”
Jehovah said to Satan, "Jehovah rebuke you, Satan. Yes, Jehovah who has chosen Jerusalem rebuke you. Isn't this a burning stick plucked out of the fire?"
3 Mgbe Joshua guzo nʼihu mmụọ ozi ahụ, uwe ya ruru unyi.
Now Joshua was clothed with filthy garments, and was standing before the angel.
4 Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ahụ guzo ya nʼihu, “Yipụnụ ya uwe a ruru unyi.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya okwu sị, “Lee, ewepụla m mmehie gị, ma ugbu a, aga m eyikwasị gị uwe mmemme ndị a.”
He answered and spoke to those who stood before him, saying, "Take the filthy garments off of him." To him he said, "Look, I have caused your iniquity to pass from you, and I will clothe you with rich clothing."
5 Ekwuru m, “Ka ha were ezi akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi.” Ya mere ha weere akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi, yikwasịkwa ya uwe ọhụrụ. Mmụọ ozi Onyenwe anyị guzokwa nʼebe ahụ.
I said, "Let them set a clean turban on his head." So they set a clean turban on his head, and clothed him; and the angel of Jehovah was standing by.
6 Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nyere Joshua ndụmọdụ sị,
The angel of Jehovah protested to Joshua, saying,
7 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ bụrụ na i jee ije nʼụzọ m niile, ọ bụrụkwa na i debe ihe niile m nyere gị nʼiwu, ị ga-abụ onyeisi ezinaụlọ m, ị ga-elekọta ụlọnsọ m anya, aga m enyekwa gị ọnọdụ nʼetiti ndị a niile guzo nʼebe a.
"Thus says Jehovah of hosts: 'If you will walk in my ways, and if you will follow my instructions, then you also shall judge my house, and shall also keep my courts, and I will give you a place of access among these who stand by.
8 “‘Gee m ntị, gị Joshua, onyeisi nchụaja na unu ndị nchụaja ndị ọzọ nọ nʼihu gị, ndị bụ ihe ngosi banyere ihe ọma niile nke gaje ịbịa. Agaje m ịkpọta nwaodibo m, onye bụ Ngalaba ahụ.
Hear now, Joshua the high priest, you and your fellows who sit before you; for they are men who are a sign: for, look, I will bring forth my servant, the Branch.
9 Lee, nkume nke m guzobere nʼihu Joshua. Nkume ahụ nwere akụkụ asaa nʼahụ ya, aga m egbunye akara dee ihe nʼelu ya. Aga m ewezugakwa mmehie nke ala a nʼotu ụbọchị.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
For, look, the stone that I have set before Joshua; on one stone are seven eyes: look, I will engrave its engraving,' says Jehovah of hosts, 'and I will remove the iniquity of that land in one day.
10 “‘Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-akpọbata mmadụ ibe ya, ka ọ bịa soro ya nọdụ nʼokpuru osisi vaịnị ya, na nʼokpuru osisi fiig ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”
In that day,' says Jehovah of hosts, 'you will invite every man his neighbor under the vine and under the fig tree.'"

< Zekaraya 3 >