< Zekaraya 13 >

1 “Nʼụbọchị ahụ, a ga-emeghe isi iyi mmiri nye ụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem. Ọ ga-abụ isi iyi a ga-eji sachapụ mmehie na adịghị ọcha ha niile.
Katika siku hiyo kijito kitafunguliwa kwa ajili ya nyumba ya Daudi na wenyeji wa Yerusalemu, kwa ajili ya dhambi na uchafu wao.
2 “Nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri, aga m ebipụ aha arụsị niile dị nʼala ahụ, a gaghị echetakwa ha ọzọ. Aga m esitekwa nʼala a wezuga ma ndị amụma ma mmụọ nke adịghị ọcha niile.
Katika siku hiyo - asema Yahwe wa majeshi - kwamba nitaondoa majina ya sanamu katika nchi ili kwamba yasikumbukwe tena. Nitawaondoa pia katika nchi manabii wa uongo na roho wao mchafu
3 Ọ bụrụkwa na onye ọbụla a ga nʼihu na-ebu amụma, nne na nna ndị mụrụ ya ga-asị ya, ‘Ị ghaghị ịnwụ nʼihi na i kwuola okwu ụgha nʼaha Onyenwe anyị.’ Mgbe onye dị otu a bukwara amụma, ọ bụ nne na nna ya ga-eji ùbe magbuo ya.
Ikiwa mtu yeyote ataendelea kutoa unabii, baba yake na mama yake waliomzaa watamwambia, 'Hautaishi, kwa kuwa umenena uongo kwa jina la Yahwe! Ndipo baba na mama waliomzaa watakapomchoma wakati akitabiri.
4 “Nʼụbọchị ahụ, ihere ga-emekwa ndị amụma nʼihi ibu amụma banyere ọhụ nke ha hụrụ. Ha agaghị eyikwa uwe ajị anụ nke ndị amụma na-eyi nʼihi iduhie ndị mmadụ,
Katika siku hiyo kila nabii ataonea aibu maono yake aelekeapo kutoa unabii. Manabii hawa hawatavaa tena vazi la singa, ili kuwadanganya watu.
5 Onye ọbụla nʼime ha ga-asịkwa, ‘Abụghị m onye amụma, onye ọrụ ubi ka m bụ, ọ bụ ihe si nʼala ka m ji azụ onwe m site na mgbe m bụ okorobịa.’
Kwa maana kila mmoja atasema, 'Mimi siyo nabii! mimi ni mkulima, kwa maana ardhi ndiyo kazi yangu tangu ujana wangu!
6 Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’
Lakini mtu mwingine atamwambia, 'Majeraha haya kati ya mikono yako ni ya nini?' naye atajibu, nilijeruhiwa na waliokuwa katika nyumba ya rafiki zangu.”
7 “Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m, na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa. Aga m eweli aka m megide ndị dị nta.
Upanga! inuka mwenyewe dhidi ya mchungaji wangu, mtu asimamaye karibu nami - hivi ndivyo asemavyo Yahwe wa majeshi. Mpige mchungaji, na kondoo watatawanyika! Kwa maana nitageuza mkono wangu dhidi ya wadogo.
8 Nʼala ahụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida, ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya.
Kisha itakuwa kwamba katika nchi yote - hivi ndivyo asemavyo Yahwe - kwamba theluthi mbili yake itaondolewa! Watu hao wataangamia; theluthi moja tu ndiyo itakayosalia.
9 Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ. Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha, jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo. Ha ga-akpọku aha m, aga m azakwa ha. Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’ Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.’”
Nitaipitisha hiyo ya tatu motoni na kuwasafisha kama fedha isafishwavyo; nitawajaribu kama dhahabu ijaribiwavyo. Wataliitia jina langu nami nitawajibu na kusema, 'Hawa ni watu wangu!' nao watasema, Yahwe ndiye Mungu wangu!”

< Zekaraya 13 >