< Zekaraya 11 >

1 Meghee ọnụ ụzọ gị niile, gị Lebanọn. Ka ọkụ repịa osisi sida gị niile.
Ṣí àwọn ìlẹ̀kùn rẹ sílẹ̀, ìwọ Lebanoni, kí iná bá lè jẹ igi kedari rẹ run.
2 Kwasie akwa ike, gị osisi junipa, nʼihi na osisi sida adaala, nʼihi na e mebiela osisi ukwu ndị niile ahụ mabigara mma oke. Kwasienụ akwa ike, unu osisi ook nke Bashan, nʼihi na e gbudachala oke ọhịa ahụ!
Hu, igi junifa; nítorí igi kedari ṣubú, nítorí tí a ba àwọn igi tí o lógo jẹ́: hu, ẹ̀yin igi óákù tí Baṣani, nítorí gé igbó àjàrà lulẹ̀.
3 Gee ntị nʼụzụ akwa nke ndị ọzụzụ atụrụ, e mebiela ebe ịta nri mara mma nke anụ ụlọ ha. Gee ntị ka unu nụrụ olu mbigbọ nke ụmụ ọdụm, nʼihi na e bibiela oke ọhịa nke Jọdan.
Gbọ́ ohun igbe àwọn olùṣọ́-àgùntàn; ògo wọn bàjẹ́; gbọ́ ohùn bíbú àwọn ọmọ kìnnìún nítorí ògo Jordani bàjẹ́.
4 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke m kwuru, “Zụọnụ igwe ewu na atụrụ ndị a ga-egbu egbu nri.
Báyìí ni Olúwa Ọlọ́run mi wí: “Bọ́ ọ̀wọ́ ẹran àbọ́pa.
5 Ndị na-azụrụ ha na-egbu ha ma ọ dịghị ahụhụ na-abịakwasị ha. Ndị na-erekwa ha na-asị, ‘Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na abụ m ọgaranya.’ Ndị ọzụzụ ha adịghị enwe ọmịiko nʼahụ ha.
Tí àwọn olúwa wọn ń pa wọ́n, tí wọn kò sì ka ara wọn sí pé wọn jẹ̀bi: àti àwọn tí ń tà wọ́n wí pé, ‘Ìbùkún ni fún Olúwa, nítorí tí mo dí ọlọ́rọ̀!’ Àwọn olùṣọ́-àgùntàn wọn kò sì ṣàánú wọn.
6 Nʼihi na mụ onwe m agakwaghị egosi ndị ala a obi ebere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m ewere onye ọbụla nʼime ha nyefee nʼaka onye agbataobi ya, na nʼaka eze ha. Ha ga-ebibi ala a kpamkpam, ma mụ onwe m agaghị anapụta onye ọbụla site nʼaka ha.”
Nítorí èmi kì yóò ṣàánú fún àwọn ara ilẹ̀ náà mọ́,” ni Olúwa wí, “Ṣí kíyèsi í, èmi yóò fi olúkúlùkù ènìyàn lé aládùúgbò rẹ̀ lọ́wọ́, àti lé ọwọ́ ọba rẹ̀, wọn yóò sì fọ́ ilẹ̀ náà, èmi kì yóò sì gbà wọ́n lọ́wọ́ wọn.”
7 Nʼihi ya, azụrụ m igwe ewu na atụrụ ndị ahụ a ga-egbu egbu, nke ka nke, ndị ahụ a na-emegbu emegbu. Eweere m mkpanaka abụọ, kpọọ otu nʼime ha Amara, kpọọ nke ọzọ Ịdị nʼotu. Azụkwara m igwe atụrụ ndị ahụ.
Èmi yóò sì bọ́ ẹran àbọ́pa, àní ẹ̀yin òtòṣì nínú ọ̀wọ́ ẹran. Mo sì mu ọ̀pá méjì sọ́dọ̀; mo pè ọ̀kan ni Oore-ọ̀fẹ́, mo pè èkejì ni Àmùrè; mo sì bọ́ ọ̀wọ́ ẹran náà.
8 Nʼime otu ọnwa, ewezugara m ndị ọzụzụ atụrụ atọ. Igwe ewu na atụrụ ndị ahụ kpọkwazịrị m asị, enwezighị m ike nweere ha ndidi.
Olùṣọ́-àgùntàn mẹ́ta ni mo sì gé kúrò ní oṣù kan. Ọkàn mi sì kórìíra wọn, ọkàn wọn pẹ̀lú sì kórìíra mi.
9 Nʼihi ya, ekwuru m si, “Agaghị m abụkwa onye ọzụzụ atụrụ unu ọzọ. Nke ọbụla na-anwụ, ya nwụọ, ọzọ, nke na-ala nʼiyi, ya laa nʼiyi. Ka ndị fọdụrụ rie anụ ahụ ibe ha.”
Mo sì wí pé, “Èmi kì yóò bọ́ yin: èyí ti ń ku lọ, jẹ́ kí òkú o kú; èyí tí a o ba sì gé kúrò, jẹ́ kí a gé e kúrò; ki olúkúlùkù nínú àwọn ìyókù jẹ́ ẹran-ara ẹnìkejì rẹ̀.”
10 Mgbe ahụ, eweere m mkpanaka m, nke a kpọrọ Amara gbajie ya abụọ, igosi na emebiela m ọgbụgba ndụ nke mụ na ndị mmadụ gbara.
Mo sì mu ọ̀pá mi, ti a ń pè ní Oore-ọ̀fẹ́, mo ṣẹ́ si méjì, ki èmi bá lè da májẹ̀mú mi tí mo tí bá gbogbo àwọn ènìyàn náà dá.
11 Nʼụbọchị ahụ ka e mere ka ọgbụgba ndụ ahụ gharakwa ịdị. Mgbe ahụ, ndị ahụ a na-akpagbu nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, bụ ndị na-ele m anya matara na ọ bụ okwu Onyenwe anyị.
Ó sì dá ni ọjọ́ náà, bẹ́ẹ̀ ni àwọn òtòṣì nínú ọ̀wọ́ ẹran náà tí ó dúró tì mí mọ̀ pé, ọ̀rọ̀ Olúwa ni.
12 Mgbe ahụ, agwara m ha, “Ọ bụrụ na ọ masịrị unu, unu kwụọ m ụgwọ ọrụ m, ọ bụrụkwa na ọ masịghị unu, deberenụ onwe unu ego unu.” Nʼihi nke a, ha gụpụtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, jiri ya kwụọ m ụgwọ.
Mo sì wí fún wọn pé, “Bí ó bá dára ní ojú yin, ẹ fún mi ni owó ọ̀yà mi; bí bẹ́ẹ̀ kọ́, ẹ mú un lọ́wọ́.” Bẹ́ẹ̀ ni wọ́n wọn ọgbọ̀n owó fàdákà fún iye owó ọ̀yà mi.
13 Onyenwe anyị gwara m, “Tụpụrụ ya ọkpụ ite,” bụ ọnụahịa magburu onwe ya bụ nke ha rụrụ nʼisi m. Ya mere, eweere m iri ọlaọcha atọ ahụ tụpụrụ ya ọkpụ ite nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Olúwa sì wí fún mi pé, “Sọ ọ sí amọ̀kòkò.” Iye dáradára náà, tí wọn yọ owó mi sí. Mo sì mu ọgbọ̀n owó fàdákà náà, mo sì sọ wọ́n sí àpótí ìṣúra ní ilé Olúwa.
14 Mgbe ahụ, agbajiri m mkpanaka m nke abụọ a na-akpọ Ịdị nʼotu, izipụta na njikọta maọbụ ịdị nʼotu dị nʼetiti Juda na Izrel adịghịkwa.
Mo sì ṣẹ́ ọ̀pá mi kejì, àní Àmùrè, sí méjì, kí èmi lè ya ìbátan tí ó wà láàrín Juda àti láàrín Israẹli.
15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m, “Chịrịkwa ngwa ọrụ nke onye ọzụzụ atụrụ nzuzu ahụ,
Olúwa sì wí fún mi pé, “Tún mú ohun èlò aṣiwèrè olùṣọ́-àgùntàn kan sọ́dọ̀ rẹ̀.
16 nʼihi na ana m aga ịkpọlite otu onye ọzụzụ atụrụ nke na-agaghị elekọta ụmụ atụrụ furu efu, maọbụ chọọ ndị na-etolite, maọbụ gwọọ ndị merụrụ ahụ, maọbụ nye ndị ahụ dị ike nri. Kama ọ ga-eri anụ atụrụ ndị ahụ ahụ ha dị mma, nyakapụkwa ụkwụ ha niile.
Nítorí Èmi o gbé Olùṣọ́-àgùntàn kan dìde ni ilẹ̀ náà, tí kí yóò bẹ àwọn tí ó ṣègbé wò, ti kì yóò sì wá èyí tí ó yapa; tí kì yóò ṣe ìtọ́jú èyí tí a pa lára tàbí kí ó bọ́ àwọn tí ara wọn dá pépé: Ṣùgbọ́n òun yóò jẹ ẹran èyí tí ó ni ọ̀rá, àwọn èyí tiwọn fi èékánná wọn ya ara wọn pẹ́rẹpẹ̀rẹ.
17 “Ahụhụ dịrị onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-abaghị uru, nke na-adịghị elezi igwe ewu na atụrụ ya anya. Ka mma agha gbupụ ya otu aka, ghụpụkwa ya anya aka nri ya. Ka ogwe aka ya kpọnwụọkwa kpamkpam. Otu a, anya aka nri ya ga-akpọkwa.”
“Ègbé ni fún olùṣọ́-àgùntàn asán náà, tí ó fi ọ̀wọ́ ẹran sílẹ̀! Idà yóò gé apá rẹ̀ àti ojú ọ̀tún rẹ̀: apá rẹ̀ yóò gbẹ pátápátá, ojú ọ̀tún rẹ̀ yóò sì fọ́ pátápátá!”

< Zekaraya 11 >