< Zekaraya 1 >
1 Nʼọnwa nke asatọ, nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya nwa Berekaya, nwa Ido, bụ onye amụma ntị, na-asị,
Mwezi wachisanu ndi chitatu, mʼchaka chachiwiri cha ulamuliro wa Dariyo, Yehova anayankhula ndi mneneri Zekariya mwana wa Berekiya, mwana wa Ido, kuti:
2 “Onyenwe anyị were oke iwe megide nna unu ha.
“Yehova anakwiya kwambiri ndi makolo anu.
3 Nʼihi ya, gwa ha, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. ‘Lọghachikwutenụ m,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara, ‘Mụ onwe m kwa ga-alọghachikwute unu.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu.
Choncho awuze anthuwa kuti, ‘Yehova Wamphamvuzonse akuti, ‘Bwererani kwa Ine,’ akutero Yehova Wamphamvuzonse. ‘Ndipo Ine ndidzabwerera kwa inu,’ akutero Yehova Wamphamvuzonse.
4 Unu adịla ka ndị nna unu ha, ndị amụma mbụ kpọrọ oku si, Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara: ‘Sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ajọ omume unu chigharịa’ ma ha achọghị ịnụ maọbụ gee m ntị, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Musakhale ngati makolo anu, amene aneneri akale anawalalikira kuti: Yehova Wamphamvuzonse akuti, ‘Tsopano lekani njira zanu zoyipa ndi machitidwe anu oyipawo.’ Koma iwo sanamvere kapena kulabadira za Ine, akutero Yehova.
5 Olee ebe ka nna nna unu ha nọ ugbu a? Ndị amụma ahụ, ha na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?
Kodi makolo anuwo ali kuti tsopano? Nanga aneneri, kodi amakhalapo mpaka muyaya?
6 Ọ bụ na okwu m na iwu bụ nke m nyere ụmụ ohu m ndị amụma, ọ bụ na ha emezughị nʼebe ndị nna nna unu ha nọ? “Mgbe ahụ, ha chegharịrị ma kwuo, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, emesola anyị mmeso dịka ụzọ anyị na omume anyị si dị. O mekwara ya dịka o si zube na ọ ga-eme ya.’”
Kodi mawu anga ndi malangizo anga, amene ndinawawuza atumiki anga aneneri, suja anawachitira makolo anu? “Tsono iwo analapa ndi kunena kuti, ‘Yehova Wamphamvuzonse watichitira zomwe zikuyenera njira zathu ndi machitidwe athu, monga anatsimikiza kuti adzachita.’”
7 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nke ọnwa iri na otu, bụ ọnwa Shebat, nʼafọ abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya onye amụma, bụ nwa Berekaya, nwa Ido ntị, na-asị:
Tsiku la 24 la mwezi wa 11, mwezi wa Sebati, chaka chachiwiri cha ulamuliro wa Dariyo, Yehova anayankhula ndi Zekariya mwana wa Berekiya, mwana wa Ido.
8 Nʼabalị ahụ, ahụrụ m nʼọhụ, otu nwoke na-agba ịnyịnya na-acha ọbara ọbara. O guzokwa nʼetiti osisi mietul, nke dị nʼebe miri emi nke mgbawa dị nʼala. Nʼazụ ya, ọtụtụ ịnyịnya na-acha ọbara ọbara, ndị na-acha ka ahịhịa kpọrọ nkụ, na ndị na-acha ọcha dịkwa.
Nthawi ya usiku ndinaona masomphenya. Ndinaona munthu atakwera pa kavalo wofiira. Iye anayima pakati pa mitengo ya mchisu mʼchigwa. Kumbuyo kwake kunali akavalo ofiira, akhofi ndi oyera.
9 Ajụrụ m, “Nna m ukwu, gịnị bụ ihe ndị a?” Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu sịrị m, “Aga m egosi gị ihe ha bụ.”
Ine ndinafunsa kuti, “Mbuye wanga, kodi zimenezi ndi chiyani?” Mngelo amene amayankhula nane anayankha kuti, “Ndidzakuonetsa kuti zimenezi ndi chiyani.”
10 Mgbe ahụ onye ahụ guzo nʼetiti osisi mietul ndị ahụ sịrị, “Ndị a bụ ndị Onyenwe anyị zitere ka ha jegharịa nʼụwa niile.”
Pamenepo munthu amene anayima pakati pa mitengo ya mchisu anafotokoza kuti, “Amenewa ndiwo amene Yehova wawatuma kuti ayendere dziko lonse lapansi.”
11 Ha sịrị mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nke na-eguzo nʼetiti osisi mietul ahụ, “Anyị ejegharịala nʼụwa niile, ma lee anyị chọpụtara na ụwa niile nọ nʼudo, dịkwa jụụ.”
Ndipo okwera pa akavalo enawo anafotokoza kwa mngelo wa Yehova, amene anayima pakati pa mitengo ya mchisu kuti, “Ife tayendera dziko lonse lapansi ndipo tapeza kuti dziko lonselo lili pa bata ndi mtendere.”
12 Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị sịrị, “Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide hapụ imere Jerusalem na obodo niile nke Juda ebere, bụ obodo ị na-eweso iwe iri afọ asaa ndị a gara aga?”
Tsono mngelo wa Yehova anati, “Yehova Wamphamvuzonse, kodi mpaka liti mudzakhala osaonetsa chifundo chanu kwa Yerusalemu ndi mizinda ya Yuda, amene mwawakwiyira kwa zaka izi 70?”
13 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara mmụọ ozi ahụ guzo na-agwa m okwu, okwu nkasiobi na okwu ọma dị iche iche.
Choncho Yehova anayankhula mawu abwino ndi achitonthozo kwa mngelo amene ankayankhula nane.
14 Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu gwara m sị, “Kwusaa ozi a, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru sị, ‘Ekworo m dị ukwuu nʼebe Jerusalem na Zayọn nọ,
Pamenepo mngelo amene ankayankhula nane anati, “Lengeza mawu awa: Yehova Wamphamvuzonse akuti, ‘Ine ndikuchitira nsanje Yerusalemu ndi Ziyoni,
15 ma iwe m dị ukwuu megide ndị mba niile ahụ onwe ha juru afọ. Nʼihi na mgbe iwe m dị nta, ha nyere aka ime ka ahụhụ ahụ karịa njọ.’
koma ndakwiya kwambiri ndi anthu a mitundu ina amene akuganiza kuti ali pa mtendere. Ndinakwiyira anthu anga pangʼono pokha, koma iwo anawonjeza kuzunza anthu angawo.’
16 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eji obi ebere lọghachi na Jerusalem. Nʼebe ahụ kwa ka a ga-ewugharị ụlọnsọ ukwuu m. A ga-esetikwa eriri e ji atụ ihe nʼelu Jerusalem.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
“Choncho, Yehova akuti, ‘Ndidzabwerera ku Yerusalemu ndi mtima wachifundo, nyumba yanga adzayimanganso kumeneko. Ndipo adzatenganso chingwe choyezera kuti amange Yerusalemu,’ akutero Yehova Wamphamvuzonse.
17 “Kwusaakwa ọzọ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọganihu ga-adịkwa nʼobodo m niile ọzọ. Onyenwe anyị ga-akasị Zayọn obi ọzọ, ma họpụtakwa Jerusalem.’”
“Lengezanso kuti, Yehova Wamphamvuzonse akuti, ‘Mizinda yanga idzakhalanso ndi zokoma zosefukira ndipo Yehova adzatonthoza Ziyoni ndi kusankhanso Yerusalemu.’”
18 Mgbe ahụ, eweliri m anya m abụọ elu hụ mpi anọ.
Kenaka ndinayangʼananso, ndipo patsogolo panga panali nyanga zinayi.
19 Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sị, “Gịnị ka ihe ndị a bụ?” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ mpi ndị ahụ chụsasịrị Juda, na Izrel, na Jerusalem.”
Ndinamufunsa mngelo amene amayankhula nane kuti, “Kodi zimenezi ndi chiyani?” Iye anandiyankha kuti, “Izi ndi nyanga zimene zinabalalitsa Yuda, Israeli ndi Yerusalemu.”
20 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri m ndị ọkpụ ụzụ anọ.
Kenaka Yehova anandionetsa amisiri azitsulo anayi.
21 Asịrị m, “Gịnị ka ndị na-abịa ime?” Ọ zaghachiri m, “Ndị a bụ mpi anọ ndị ahụ chụsasịrị Juda, ime ka onye ọbụla ghara inwe ike iwelite isi ya. Ma ndị a abịala imenye ha ụjọ, na ịtụda mpi mba niile, bụ ndị ahụ buliri mpi ha imegide ala Juda, na ịchụsa ndị ya.”
Ndinafunsa kuti, “Amisiri a zitsulowa akudzachita chiyani?” Iye anayankha kuti, “Izi ndi nyanga zimene zinabalalitsa Yuda kotero kuti panalibe wina amene akanalimbana nazo, koma amisiri a zitsulowa abwera kudzaziopseza ndi kugwetsa nyanga zimenezi za mitundu ya anthu amene analimbana ndi dziko la Yuda ndi kubalalitsa anthu ake.”