< Taịtọs 1 >

1 Akwụkwọ ozi a si nʼaka m, Pọl, odibo Chineke, na onyeozi Jisọs Kraịst, onye ahọpụtara ime ka okwukwe ndị Chineke, na nghọta banyere ịmara eziokwu ahụ na-eduba na ndụ ịsọpụrụ Chineke gaa nʼihu,
Mina Phawuli inceku kaNkulunkulu lompostoli kaJesu Khristu wokukholwa kwabakhethiweyo bakaNkulunkulu lokwazi iqiniso eliholela ekwesabeni uNkulunkulu,
2 nke a dabere nʼolileanya maka ndụ ebighị ebi, nke Chineke onye na-adịghị agha ụgha kwerelarị na nkwa tupu mmalite nke oge. (aiōnios g166)
ukukholwa lokwazi okweyame ethembeni lokuphila okulaphakade okwathenjiswa ekudatshulweni komhlaba nguNkulunkulu (aiōnios g166)
3 Mgbe oge imezu nkwa ahụ ruru, o mere ka okwu ya pụta ìhè site na nkwusa oziọma, nke e nyefere m nʼaka idebe, dị ka Chineke Onye nzọpụta anyị si nye ya nʼiwu.
njalo ngesikhathi sakhe esimisiweyo wabonakalisa ilizwi lakhe ngentshumayelo engayiphathiswa ngomlayo kaNkulunkulu uMsindisi wethu,
4 Ọ bụ gị Taịtọs, ezi nwa m nwoke nʼime okwukwe nke anyị nwekọrọ. Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị dịrị gị.
KuThithu indodana yami ngokukholwa kwethu sonke ngithi: Umusa lokuthula okuvela kuNkulunkulu uBaba lakuKhristu uJesu uMsindisi wethu.
5 Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ụfọdụ a na-edozibeghị, ka ị họpụtakwa ndị okenye nʼobodo niile, dị ka m siri nye gị nʼiwu.
Engakutshiyela khona eKhrethe yikuthi uqondise lokho okwasala kungaphelanga njalo ubeke abadala bebandla emizini yonke njengokukulaya kwami.
6 Ọ ga-abụ onye a na-enweghị ihe ịta ụta, ọ ga-abụ onye na-alụ otu nwanyị. Ụmụ ya bụ ndị kwere ekwe, ndị ama na ha anaghị ebi ndụ ọjọọ, maọbụ na-eme isiike.
Umdala webandla kumele abe ngongasolekiyo, indoda elomfazi oyedwa, indoda elabantwana abakholwayo njalo abangelacala lobudlwangudlwangu loba ukwedelela.
7 Ebe ọ bụ na onye nlekọta nʼahụ ihe banyere chọọchị Chineke, ọ ga-abụ onye na-enweghị ihe ịta ụta. Ọ gaghị abụ onye nganga, onye na-ewe iwe ọkụ, onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-alụ ọgụ mgbe niile, onye hụrụ ego nʼanya.
Njengoba umthungameli ephathiswe umsebenzi kaNkulunkulu, kumele angabi lasici, angazikhukhumezi, ongazondi masinyane, ongasisosidakwa, ongathandi ukulwa, ongadingi inzuzo ngobuqili.
8 Ọ ga-abụ onye na-anabata ndị ọbịa, na onye na-ahụ ezi ihe nʼanya. Ọ ga-abụ onye na-akwanyere onwe ya ugwu, ezi mmadụ ụzọ ya kwụ ọtọ, onye dị nsọ, na onyeisi zuruoke.
Kodwa kumele abe ngophatha kuhle izihambi, othanda okuhle, ozikhuzayo, oqondileyo, ongcwele lozithibayo.
9 Ọ ga-abụkwa onye jidesiri oziọma ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi aka ike dịka eziri ya. Nke ga-eme ka o nwe ike gbaa ndị ọzọ ume site na ozizi ahụ nke zuruoke, nakwa ịtụ ndị ahụ na-eguzogide ya mmehie ha nʼihu.
Kumele abambelele elizwini eliqotho njengokufundiswa kwalo ukuze akhuthaze abanye ngemfundiso eqotho njalo amelane lalabo abayiphikisayo.
10 Nʼihi na e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-ekweghị, ndị na-ekwu okwu efu, na ndị aghụghọ, nke ka nke, ndị si nʼotu ndị obibi ugwu pụta.
Ngoba banengi abantu abahlamukayo, abakhulumayo nje kanye labakhohlisi ikakhulu abeqembu lokusoka.
11 Aghaghị ịkwụsị ha maka na ha na-akụzi ihe ha ekwesighị ikuzi nʼihi ego, si otu ahụ na-eme ka ọtụtụ ezinaụlọ gbasaa.
Kumele bathuliswe ngoba bachitha imizi epheleleyo ngokufundisa izinto okungamelanga bazifundise besenzela ukuthola inzuzo ngobuqili lenkohliso.
12 Ọ bụ otu onye nʼime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit niile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nʼazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.”
Omunye wabaphrofethi babo wathi, “AbaseKhrethe ngabantu bamanga, izilo ezimbi, izihwaba ezingamavila.”
13 Nʼezie, okwu a bụ eziokwu. Nʼihi nke a, baara ha mba nʼolu ike banyere mmehie ha ka ha nwee ike zuo oke nʼokwukwe,
Ubufakazi lobu buliqiniso. Ngakho-ke, bakhuze ngamandla ukuze baqine ekukholweni
14 ka ha kwụsị ige ntị nʼakụkọ ifo ndị Juu na-akọ, maọbụ iwu nke ndị jụrụ ịnabata eziokwu nyere.
bangalaleli izinganekwane zamaJuda loba imilayo yalabo abadela iqiniso.
15 Ihe niile dị ọcha nʼebe ndị dị ọcha nọ, o nweghị ihe ọbụla dị ọcha nʼebe ndị rụrụ arụ na ndị na-ekweghị ekwe nọ. Nʼihi na uche ha na akọnuche ha rụrụ arụ.
Kwabahlambulukileyo izinto zonke zihlambulukile kodwa kulabo abaxhwalileyo njalo bengakholwa akulalutho oluhlambulukileyo. Ngempela, ingqondo lezazela zabo konke kuxhwalile.
16 Ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ma ha ji omume ha na-agọnarị ya. Ha bụkwa ndị na-akpọ mmadụ ibe ha asị, ndị isiike, na ndị na-adịghị ike nʼezi ọrụ ọbụla.
Bathi uNkulunkulu bayamazi kodwa ngezenzo zabo bayamphika. Bayenyanyeka, bayadelela njalo kabafanelanga ukwenza loba kuyini okuhle.

< Taịtọs 1 >