< Taịtọs 2 >
1 Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe.
Ɛsɛ sɛ woma nkyerɛkyerɛ pa a wɔagye ato mu.
2 Gwa ndị okenye nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuruoke, ka ha bụrụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nʼanya, na ndị nwekwara ntachiobi.
Ka kyerɛ nkwakoraa na wɔmma wɔn ani nna hɔ, wɔnyɛ anyansafo, na wɔnhyɛ wɔn ho so; wɔn gyidi mu nyɛ den, wonnya ɔdɔ na wontumi ntena ɔhaw mu.
3 Nʼotu aka ahụ, gwa ndị okenye nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-agba asịrị maọbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya oke. Kama ha na-akụzi ihe dị mma.
Saa ara nso na ka kyerɛ mmerewa na wɔmmɔ ɔbra a ɛyɛ kronkron. Wonnni nseku na wɔnnyɛ asadweam nso. Wɔnkyerɛ akyerɛ pa,
4 Ha ga-esi otu a kuziere ụmụ agbọghọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha nʼanya.
sɛnea ɛbɛyɛ a wɔnam so betumi ama mmabaa adɔ wɔn kununom ne wɔn mma,
5 Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuruoke, ndị dị ọcha nʼobi, ndị na-edozi ezinaụlọ di ha, ndị na-eme ebere, ndị na-edo onwe ha nʼokpuru di ha, ka onye ọbụla ghara ikwulu okwu Chineke.
ama wɔatumi ahyɛ wɔn ho so, ayɛ kronkron na wɔayɛ awarefo pa a wotie wɔn kununom asɛm, na obi anka bɔne amfa Onyankopɔn asɛm no ho.
6 Nʼotu ụzọ ahụ kwa, gbaakwa ụmụ okorobịa ume ka ha jide onwe ha.
Saa ara na hyɛ mmerante na wonnya ahohyɛso.
7 Nʼihe niile ị na-eme, mee onwe gị ihe ịma atụ ndị ọzọ ga na-eṅomi nʼime ezi omume. Na nkuzi gị niile, gosikwa izuoke na ikwesi ntụkwasị obi.
Nneɛma nyinaa mu no, fa wo ho yɛ nhwɛso pa wɔ nnwuma payɛ mu. Di nokware na ma wʼani nku wo nkyerɛkyerɛ ho.
8 Ka ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ apụghị ịma ikpe, ka ihere mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na onweghi ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị.
Ka nsɛm a ho tew na obi antumi antia mu na ama atamfo ani awu sɛ wonnya asɛm bɔne nka mfa yɛn ho.
9 Gwa ndị ohu ka ha na-erubere ndị nwe ha isi, ka ha na-eme ihe ga-atọ onyenwe ha ụtọ mgbe niile. Ka ha hapụ ịsa ndị nwe ha okwu,
Ɛsɛ sɛ asomfo tie wɔn wuranom, na ade nyinaa mu no, wɔsɔ wɔn wuranom ani. Ɛnsɛ sɛ woyiyi nsɛm ano
10 ka ha ghara izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Nʼụzọ dị otu a, ha ga-ewetara ihe anyị na-akụzi maka Chineke Onye nzọpụta anyị otuto nʼihe niile ha na-eme.
anaa wɔbɔ wɔn korɔn. Ɛsɛ sɛ wɔyɛ papa mmere nyinaa na wodi nokware na anam so ama biribiara a wɔyɛ no de anuonyamhyɛ aba nkyerɛkyerɛ a ɛfa Onyankopɔn a ɔyɛ yɛn Agyenkwa no ho no.
11 Nʼihi na Chineke emela ka amara ya nke wetaara mmadụ niile nzọpụta pụta ìhè.
Onyankopɔn adom a ɛde nkwagye ba no ayi no ho adi akyerɛ nnipa nyinaa.
12 Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a. (aiōn )
Nʼadom no kyerɛ yɛn sɛ, yɛmpa asetena a ɛho ntew no ne wiase akɔnnɔ akyi na yɛntena ase ahohyɛso, kronkronyɛ ne Onyamesuro mu wɔ wiase ha. (aiōn )
13 Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị bụ ọbịbịa nke otuto nke Chineke anyị dị ukwuu, na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst.
Yɛwɔ anidaso wɔ bere a yɛretwɛn Onyankopɔn tumfo a ɔne Agyenkwa Yesu Kristo no ba a ɔbɛba bio wɔ anuonyam mu no.
14 Ọ bụ ya jiri onwe ya chụọ aja nʼihi anyị, ka ọ gbapụta anyị site nʼajọ omume anyị niile, na ido ndị ga-abụ ndị nke ya ọcha nye onwe ya, ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe niile.
Ɔde ne ho maa yɛn de gyee yɛn fii bɔne mu, ɔyɛɛ yɛn nnipa a yɛpɛ papayɛ no kronkron de yɛn yɛɛ ne nko ara de.
15 Na-akụzi ihe ndị a, werekwa ha na-adụ ndị gị ọdụ site nʼikike niile i nwere. Werekwa ha na-atụ ha mmehie ha nʼihu. Ka mmadụ ọbụla ghara ilelị gị anya.
Kyerɛkyerɛ saa nneɛma yi na gyina wo tumi so hyɛ wʼatiefo nkuran, ka wɔn anim. Mma wɔn mu bi mmmu wo abomfiaa.