< Abụ nke Abụ 7 >

1 Lee ka ụkwụ gị si dị mma nʼime akpụkpọụkwụ gị ada nwa eze. Apata ụkwụ gị abụọ dị ezi mma dịka nkume oke ọnụahịa, ọrụ aka nke ezigbo onye ọkwa ǹka.
Iwe namwali waufumu, mapazi ako ngokongola mu nsapato wavalazo! Ntchafu zako nʼzowumbika bwino ngati miyala yamtengowapatali, ntchito ya manja ya mmisiri waluso.
2 Otubo gị mara mma dịka iko nke a gbajuru mmanya. Ukwu gị dị ka ukwu ọka e ji okoko urodi gbaa gburugburu.
Mchombo wako uli ngati chikho chowumbika bwino chimene nthawi zonse ndi chodzaza ndi vinyo. Chiwuno chako ndi choningʼa ngati mtolo wa tirigu utazunguliridwa ndi maluwa okongola.
3 Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ nke otu nne mụrụ nʼotu oge.
Mawere ako akuoneka ngati ana awiri a mbawala, ngati mphoyo zamapasa.
4 Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo. Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim. Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn nke chere Damaskọs ihu.
Khosi lako lili see! ngati nsanja ya mnyanga wa njovu. Maso ako ali ngati mayiwe a ku Hesiboni, amene ali pafupi ndi chipata cha Bati Rabimu. Mphuno yako ili ngati nsanja ya ku Lebanoni, yoyangʼana ku Damasiko.
5 Isi gị guzo nʼahụ gị ka ugwu Kamel. Agịrị isi nke isi gị dịkwa ogho odo odo. Ịma mma nke agịrị isi gị emela eze onye a dọtara nʼagha.
Mutu wako uli bwinobwino nengʼaa ngati phiri la Karimeli. Tsitsi lako lili ngati nsalu yakuda yaufumu; mfumu yakopeka ndi maonekedwe ake okongola.
6 Lee ka i si maa mma nke ukwuu, nʼezie, ị mara mma. Ị dịkwa ụtọ nke ukwuu, gị onye m hụrụ nʼanya.
Ndiwe wokongola kwambiri ndiponso wosangalatsa, iwe wokondedwa, namwali wokondweretsawe!
7 Ị dị ogologo dịka osisi nkwụ; ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ osisi.
Msinkhu wako uli ngati mtengo wa mgwalangwa, ndipo mawere ako ali ngati phava la zipatso.
8 Ekwuru m sị, “Aga m arịgoro elu osisi nkwụ ahụ, jidekwa mkpụrụ ya aka.” Ugbu a, ka ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ vaịnị, ka isisi nke iku ume gị dịkwa ka mkpụrụ osisi apụl,
Ndinati, “Ndikwera mtengo wa mgwalangwa; ndidzathyola zipatso zake.” Mawere ako ali ngati maphava a mphesa, fungo la mpweya wako lili ngati ma apulosi,
9 ka okpo ọnụ gị dịka mmanya makarịsịrị na mma. Onye a hụrụ nʼanya Ka mmanya ahụ gbadaa nwayọọ nye onye m hụrụ nʼanya, na-asọda nwayọọ nʼelu egbugbere ọnụ ya na eze ya.
ndipo pakamwa pako pali ngati vinyo wokoma kwambiri. Mkazi Tsono vinyo ameneyu amuthirire wachikondi wanga, ayenderere bwino pa milomo yake ndi mano ake.
10 Abụ m nke onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa m ka ọ chọrọ.
Wokondedwayo ine ndine wake, ndipo chilakolako chake chili pa ine.
11 Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị gaa nʼime obodo, ka anyị nọọ ọnọdụ abalị nʼobodo nta.
Bwera wachikondi wanga, tiye tipite ku madera a ku midzi, tikagone ku midzi.
12 Ka anyị bilie ngwangwa nʼisi ụtụtụ pụọ jee nʼubi lee ma osisi vaịnị ha amaala ifuru, ma okoko ya agbawaala, ma osisi pomegranet agbawaala okoko. Nʼebe ahụ ka m ga-egosi gị ịhụnanya m.
Tiye tilawirire mmamawa kupita ku minda ya mpesa, tikaone ngati mitengo ya mpesa yayamba kuphukira, ngati maluwa ake ayamba kuoneka, komanso ngati makangadza ayamba kuonetsa maluwa. Kumeneko ndidzakuonetsa chikondi changa.
13 Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nụ isi nke mandreki na-ewepụta; mkpụrụ osisi niile na-atọ ụtọ ga-adịkwa nʼọnụ ụzọ anyị, ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie, nʼihi na edokọtaala m ha maka onye m hụrụ nʼanya.
Mitengo ya mankhwala a chisulo ikupereka fungo lake labwino, ndipo pa khomo pathu pali zipatso zonse zokoma, zatsopano ndi zakale zomwe, zimene ndakusungira wokondedwa wanga.

< Abụ nke Abụ 7 >