< Abụ nke Abụ 5 >

1 Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Achịkọtala m máá ya na ụda m, arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ. Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m. Ndị Enyi Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi; ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya.
U A komo au iloko o ko'u kihapai, e ko'u kaikuwahine, e ka'u wahine; Ua ohi au i ko'u mura mea ala; Ua ai au i ko'u waihona meli me ko'u meli; Ua inu au i ko'u waina me ko'u waiu; E ai, e ko'u poe makamaka, E inu, oia hoi, e inu nui, e ka'u poe i aloha'i.
2 A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya. Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ. “Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya, nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. Igirigi ezokwasịla m nʼisi, agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.”
Ua hiamoe au. ua ala no nae ko'u naau: He leo ka! o ka'u mea i aloha'i e kikeke ana, [me ka i mai, ] E wehe ae no'u, e ko'u kaikuwahine, e ka'u mea i aloha'i, e ka'u manu nunu, e ko'u mea maemae; No ka mea, ua paapu ko'u poo i ka hau, A me ko'u wili lauoho i na paka ua o ka po.
3 Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?
Ua wehe au i ko'u kapa komo; Pehea la wau e komo hou aku ai ia? Ua holoi au i ko'u mau wawae; Pehea la wau e hoopaumaelo hou aku ai?
4 Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ, mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike.
Ua hookomo mai ka'u mea i aloha'i i kona lima ma kahi hakahaka, A haehae ko'u opu nona.
5 Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá, mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi, nʼelu ihe mkpọchi nke ibo.
Ua ku au iluna e wehe ae no ka'u mea i aloha'i, A kulu ka mura mai ko'u mau lima aku, A kahe hoi ka mura maemae loa mai ko'u mau manamana lima, Maluna o ka mea e paa ai ka puka.
6 Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala. Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara. Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla. Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị.
Ua wehe ae au no ka'u mea i aloha'i; Aka, o ka'u mea i aloha'i, ua huli ae ia, a hele aku la; Ua lele ko'u oili i kana olelo ana mai; Ua imi au ia ia, aole nae i loaa, Ua kahea aku au ia ia, aole nae i ekemu mai.
7 Ndị nche hụrụ m mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ha tiri m ihe merụọ m ahụ. Ndị nche mgbidi obodo napụrụ m akwa mkpuchi m.
Ua loaa au i ka poe kiai i ko lakou hele ana a puni ke kulanakauhale, Ua pepehi mai lakou ia'u a eha au; O ka poe kiai maluna o ka pa, ua kaili ae lakou i ko'u aahu.
8 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya, gịnị ka unu ga-agwa ya? Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ.
Ua kauoha aku au ia oukou, e na kaikamahine o Ierusalema, Ina e loaa ia oukou ka'u mea i aloha'i, E hai aku oukou ia ia, ua mai au i ke aloha.
9 Gị nwanyị kachasị mma, olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ? Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ nke i ji enye anyị iwu dị otu a?
Heaha kau mea i aloha'i, mamua o kekahi mea i aloha'i, E ka mea maikai mawaena o na wahine; Heaha kau mea i aloha'i mamua o kekahi mea i aloha'i, I kauoha mai ai oe ia makou pela?
10 Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya. Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri.
O ka'u mea i aloha'i, ua keokeo ia a me ka ulaula hoi, Ua oi nui aku ia mamua o na tausani he umi.
11 Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha, agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ, na-ejikwa nji dịka ugolọma.
O kona poo, he gula maemae ia, O kona wili lauoho, na loloa ia, A eleele hoi me he manu koraka la.
12 Anya ya abụọ dịka nduru nọ nʼakụkụ mmiri iyi nke e jiri mmiri ara ehi sachaa, dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị.
O kona mau maka, ua like ia me ko ka manu nunu ma na kahawai, I holoiia i ka waiu, E noho ana me ka maikai.
13 Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ. Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi, nke na-agbụsị mmanụ máá.
O kona mau papalina, ua like ia me ka mala o na mea ala, A me ka ulaula ala hoi; O kona lehelehe, ua like ia me na lilia e kahe mai ana he mura maemae loa.
14 Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi, nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya. Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma.
O kona mau lima, ua like ia me na komo lima gula, I paapu i ka topaza. O kona opu, ua like ia me ka niho elepani, I uhiia hoi i ka sapeira.
15 Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ, nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha. Ụdịdị ya dị ka Lebanọn, dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya.
O kona uha, ua like ia me na kia pohaku keokeo, Ua kukuluia maluna iho o na kumu gula maemae: O kona helehelena, ua like ia me Lebanona, Maikai hoi e like me na laau kedera.
16 Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya, ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya. Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m.
O kona waha, he mea ono no ia; Oiaio, he mea makemake nui loa ia oia. Oia ka'u mea i aloha'i, oia ko'u makamaka, E na kaikamahine o Ierusalema.

< Abụ nke Abụ 5 >