< Abụ nke Abụ 4 >

1 Leenụ ka i si maa mma, onye m hụrụ nʼanya, e, ị mara mma! Anya gị abụọ nke dị nʼazụ akwa mkpuchi ihu gị dị ka nduru. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịda nʼakụkụ ugwu Gilead.
Oh mwasi na ngai ya motema, ozali kitoko, ozali penza kitoko makasi! Miso na yo, na se ya vwale, elala lokola ebenga; suki na yo ezali lokola etonga ya bantaba ya basi oyo ekitaka na ngomba Galadi.
2 Eze gị dị ka igwe atụrụ a ka kpachapụrụ ajị ha ọhụrụ, nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke gba aka nwa nʼetiti ha.
Minu na yo ezali lokola etonga ya bameme oyo balongoli bapwale, bongo bawuti kosukola yango. Meme moko na moko ezali na lipasa na yango; moko te ezangi mwana.
3 Egbugbere ọnụ gị abụọ dị ka ogho uhie. Ọnụ gị dị mma ile anya. Agba nti gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet e kere abụọ.
Bibebu na yo ezali lokola kitendi ya motane, mpe elobeli na yo epesaka esengo; matama na yo ezali lokola mbuma ya grenade, na se ya vwale.
4 Olu gị dị ka ụlọ elu Devid, nke e wuziri nke ọma. E konyere puku ọta na ya, ha niile bụ ọta nke ndị ọka nʼagha.
Kingo na yo ezali lokola ndako molayi ya Davidi, oyo batongi mpo na kobomba bibundeli; banguba nkoto moko ediembisami kuna, banguba ya basoda ya mpiko.
5 Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ, nke otu nne mụrụ nʼotu oge, ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi.
Mabele na yo nyonso mibale ezali lokola bana mapasa mibale ya mboloko, oyo ezali kolia kati na bafololo oyo babengaka lisi.
6 Tutu chi ụtụtụ abọọ, tutu onyinyo agbalaga, aga m aga nʼugwu ụda máá na nʼugwu insensi.
Kino tongo ekotana mpe molili ekolimwa, nakokende na ngomba ya mire mpe na ngomba moke ya ansa.
7 Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya, ọ dịkwaghị ntụpọ ọbụla dị gị nʼahụ.
Mwasi na ngai ya motema, mobimba na yo ezali kitoko mingi; ata elembo moko te emonani mabe kati na yo.
8 Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ. Si na Lebanọn bịa soro m; rịdata site nʼugwu Amana, nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon, site nʼọgba ọdụm nʼugwu niile ebe agụ bi.
Longwa na Libani mpe yaka elongo na ngai, mwasi na ngai ya motema; longwa na Libani, yaka elongo na ngai. Tala wuta na basonge ya bangomba Amana, Seniri mpe Erimoni epai wapi ezali na ndako ya bankosi mpe ngomba ya bankoyi.
9 I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m; i riela m obi, i werela ile anya gị na ihe olu i yi rie obi m.
Obetisi ngai motema makasi, Oh ndeko na ngai ya mwasi, mwasi na ngai ya motema; obetisi ngai motema na komona etaleli ya miso na yo, mpe na komona moko ya sheneti ya kingo na yo.
10 Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya, isisi ụtọ nke mmanụ otite gị na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla.
Solo, bolingo na yo eleki elengi, ndeko na ngai ya mwasi, mwasi na ngai ya motema! Solo, bolingo na yo eleki vino na kitoko; solo ya mafuta na yo eleki malasi nyonso na kitoko.
11 Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m, mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị, isisi ụtọ nke uwe gị na-esi ka Lebanọn
Bibebu na yo ezali kobimisa mafuta ya elengi, mwasi na ngai ya motema; se ya lolemo na yo etondi na mafuta ya nzoyi mpe na miliki, mpe solo ya bilamba na yo ezali lokola solo ya Libani.
12 Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ. Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.
Ozali elanga ekangama, ndeko na ngai ya mwasi, mwasi na ngai ya motema; ozali etima oyo ezipami mpe liziba oyo ekangami.
13 Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa, nke nwere henna na naad,
Ozali kopesa pio lokola elanga ya banzete ya grenade, oyo ezali na bambuma kitoko, elongo na banzete ya solo kitoko: ene mpe nare,
14 naad na safron, kalamus na sinamọn, na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda máá, na aloos na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ.
nare mpe safarani, kaneli ya solo kitoko, sinamoni, elongo na lolenge nyonso ya banzete oyo epesaka malasi ya ansa, ya aloe mpe ya mire, mpe malasi nyonso oyo eleki kitoko.
15 I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige, olulu mmiri dị ndụ nke si na Lebanọn asọdata.
Ozali liziba kati na elanga, etima oyo etiolaka wuta na Libani.
16 Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu; bịakwa gị ifufe si na ndịda, fekwasị ubi m a gbara ogige, ka isisi ụda ya dị ụtọ fesaa ebe niile, ka onye m hụrụ nʼanya bịa nʼubi ya a gbara ogige, ka ọ bịa rie mkpụrụ dị iche iche dị nʼime ya nke dị oke ọnụahịa.
Oh mopepe ya nor, lamuka; oh mopepe ya sude, yaka! Pepa kati na elanga na ngai, mpe tika ete solo kitoko na yango epanzana kino mosika! Tika ete mwasi na ngai ya motema aya kati na elanga na ye mpe alia mbuma na yango ya elengi makasi!

< Abụ nke Abụ 4 >