< Abụ nke Abụ 3 >

1 Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya. Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya.
By night on my bed I sought him whom my soul loves. I sought him, but I did not find him.
2 Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya, m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya. Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya.
I said, I will rise now, and go around the city. In the streets and in the broad ways I will seek him whom my soul loves. I sought him, but I did not find him.
3 Ndị nche na-eche obodo hụrụ m, mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?”
The watchmen who go about the city found me. I said, Did ye see him whom my soul loves?
4 Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.
It was but a little that I passed from them when I found him whom my soul loves. I held him, and would not let him go until I had brought him into my mother's house, and into the chamber of her who conceived me.
5 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta ruo mgbe o masịrị ya.
I adjure you, O daughters of Jerusalem, by the roes, or by the hinds of the field, that ye stir not up, nor awake love, until it please.
6 Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere?
Who is this who comes up from the wilderness like pillars of smoke, perfumed with myrrh and frankincense, with all powders of the merchant?
7 Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn. Iri mmadụ isii ndị ọka agha, ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.
Behold, it is the litter of Solomon. Sixty mighty men are around it, of the mighty men of Israel.
8 Ha niile ji mma agha; ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha. Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya, ịdị njikere maka ihe egwu abalị.
They all handle the sword, and are expert in war. Every man has his sword upon his thigh, because of fear in the night.
9 Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ.
King Solomon made himself a palanquin of the wood of Lebanon.
10 Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee; ala ya bụkwa ọlaedo. Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa, e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya. Ndị inyom Jerusalem,
He made the pillars thereof of silver, the bottom thereof of gold, the seat thereof of purple, the midst thereof being paved with love, from the daughters of Jerusalem.
11 pụtanụ, bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ Zayọn, bịanụ ka unu hụ Solomọn bụ eze; lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi, nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya, nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.
Go forth, O ye daughters of Zion, and behold king Solomon with the crown with which his mother has crowned him in the day of his espousals, and in the day of the gladness of his heart.

< Abụ nke Abụ 3 >