< Abụ nke Abụ 3 >
1 Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya. Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya.
Usiku wonse ndili pa bedi langa ndinafunafuna amene mtima wanga umamukonda; ndinamufunafuna koma osamupeza.
2 Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya, m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya. Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya.
Ndikudzuka tsopano ndipo ndidzayendayenda mu mzinda, mʼmisewu yake ndi mʼmabwalo ake; ndidzamufunafuna amene mtima wanga umamukonda. Kotero ine ndinamufunafuna iyeyo koma osamupeza.
3 Ndị nche na-eche obodo hụrụ m, mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?”
Alonda anandipeza pamene ankayendera mzinda. “Kodi mwamuonako amene mtima wanga umamukonda?”
4 Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.
Nditawapitirira pangʼono ndinamupeza amene mtima wanga umamukonda. Ndinamugwira ndipo sindinamulole kuti achoke mpaka nditamulowetsa mʼnyumba ya amayi anga, mʼchipinda cha amene anandibereka.
5 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta ruo mgbe o masịrị ya.
Inu akazi a ku Yerusalemu, ndithu ndikukupemphani pali gwape ndi mbawala yayikazi zakuthengo: Musachigwedeze chikondi kapena kuchiutsa mpaka pamene chifunire ichocho.
6 Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere?
Kodi ndani amene akubwera kuchokera ku chipululu ngati utsi watolotolo, wonunkhira mure ndi lubani, zopangidwa kuchokera ku zonunkhira zonse za anthu amalonda?
7 Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn. Iri mmadụ isii ndị ọka agha, ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.
Ona! Chimenecho ndi chonyamulira Solomoni, choperekezedwa ndi asilikali 60, anthu amphamvu a ku Israeli,
8 Ha niile ji mma agha; ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha. Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya, ịdị njikere maka ihe egwu abalị.
onse atanyamula lupanga, onse odziwa bwino nkhondo, aliyense ali ndi lupanga pambali pake, kukonzekera zoopsa za usiku.
9 Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ.
Mfumu Solomoni anadzipangira chonyamulirachi; anachipanga ndi matabwa ochokera ku Lebanoni.
10 Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee; ala ya bụkwa ọlaedo. Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa, e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya. Ndị inyom Jerusalem,
Milongoti yake anayipanga yasiliva, kumbuyo kwake kwa golide. Mipando yake inakutidwa ndi nsalu yapepo, anakongoletsa mʼkati mwake ndi chikondi cha akazi a ku Yerusalemu.
11 pụtanụ, bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ Zayọn, bịanụ ka unu hụ Solomọn bụ eze; lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi, nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya, nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.
Tukulani inu akazi a ku Ziyoni ndipo mudzaone mfumu Solomoni atavala chipewa chaufumu, chipewa chaufumu chimene amayi ake anamuveka pa tsiku la ukwati wake, tsiku limene mtima wake unasangalala.