< Abụ nke Abụ 2 >

1 Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn, na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu.
O WAU no ka rose o Sarona, A me ka lilia o na awawa.
2 E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu, otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ.
E like me ka lilia mawaena o na kakalaioa, Pela no ka'u mea i aloha'i mawaena o na kaikamahine.
3 Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa, mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ. Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya, mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ.
E like me ka laau ohia mawaena o na laau o ka nahelehele, Pela ka'u mea i aloha'i mawaena o na keiki kane; Ua noho iho au malalo o kona malu me ka oluolu, A ua ono kona hua i kuu ai ana.
4 Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri, ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya.
Ua hookomo mai oia ia'u iloko o ka halo ahainu, A o kona hae maluna iho o'u, he aloha no ia.
5 Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume; werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike, nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.
E hooluolu mai ia'u i ka pai huawaina, E hanai mai hoi ia'u i ka hua ohia; No ka mea, ua mai au i ke aloha.
6 Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m.
Aia kona lima hema malalo iho o ko'u poo, O kona lima akau hoi, ua apo mai ia'u.
7 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị: Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta, ruo mgbe ọ masịrị ya.
Ke kauoha aku nei au ia oukou, e na kaikamahine o Ierusalema, Ma na anetelope a me na dia o ke kula, E hooluliluli ole aku oukou, a e hoala ole aku i ka'u mea i aloha'i, a ala wale mai ia.
8 Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya! Lee ya ka ọ na-abịa, na-amali elu nʼelu ugwu niile, na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile.
He leo ka, no ka'u mea i aloha'i Aia hoi, e hiki mai ana ia, E lele ana maluna o na mauna, E lehai ana hoi maluna o na puu.
9 Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele. Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị, ọ na-esikwa na oghereikuku na nʼoghere dị ya na-elebata anya.
Ua like ka'u mea i aloha'i, me ka anetelope, A me ka dia keiki hoi; Aia ka, ku iho la oia mahope o ko makou pa, E nana ana ma na puka makani, E makaikai ana ma na puka olepelepe.
10 Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m, “Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ, onye m mara mma, soro m.
Olelo mai la ka'u mea i aloha'i, i mai ia'u, E ka'u mea i aloha'i, e ko'u mea nani, e ku ae, a e hele mai oe:
11 Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala.
No ka mea, aia hoi, ua hala ka hooilo, Ua pau ka ua, a ua malie;
12 Okoko osisi epupụtala nʼala; oge eji agụ egwu eruokwala, a na-anụ abụ nduru nʼala anyị niile.
Ua ikeia mai na pua ma ka honua; Ua hiki mai ka wa e oki ai, Ua loheia hoi ka leo o ke kuhukuku ma ko makou aina;
13 Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ, isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”
O ka laau fiku ua hua mai ia i kona hua opiopio, Ua aala mai ka pua o ka waina. E ka'u mea i aloha'i, e ko'u mea maikai, e ala, a e hele mai oe.
14 Nduru m nọ nʼọgba nkume, nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu, gosi m ihu gị, mee ka m nụ olu gị, nʼihi na olu gị dị ụtọ, ihu gị makwara mma.
E ko'u nunu, ma na wahi malu o ka pohaku, a me na wahi hunaia o ka pali, E ae mai e ike au i kou helehelena. A e lohe hoi i kou leo; No ka mea, ua oluolu kou leo, a o kou helehelena, ua maikai no ia.
15 Jidenụ nkịta ọhịa, ụmụ nkịta ọhịa niile na-emebiri anyị ubi, ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.
E hopu aku no makou i na alopeke, I na alopeke liilii, na mea i ino ai na malawaina; No ka mea, ua pua mai ko kakou malawaina.
16 Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi,
No'u no ka'u mea i aloha'i, A nona hoi au; E ai ana oia mawaena o na lilia.
17 tutu chi ụtụtụ abọọ mgbe onyinyo niile na-agabigakwa. Tụgharịa, onye m hụrụ nʼanya, dị ka mgbada maọbụ nwa ele nke nọ nʼelu ugwu.
A i ka wa oluolu o ka la, a auhee na aka, E huli oe, e ka'u mea i aloha'i. A lilo oe i anetelope, A i dia keiki paha maluna o na mauna palipali.

< Abụ nke Abụ 2 >