< Abụ nke Abụ 1 >

1 Abụ nke abụ nke Solomọn.
The song of Songs, which is Solomon's.
2 Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ, nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya.
Let him give me the kisses of his mouth: for his love is better than wine.
3 Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma, aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta, ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya.
Sweet is the smell of your perfumes; your name is as perfume running out; so the young girls give you their love.
4 Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa. Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya. Ndị Enyi Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị. Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya. Onye a hụrụ nʼanya Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.
Take me to you, and we will go after you: the king has taken me into his house. We will be glad and full of joy in you, we will give more thought to your love than to wine: rightly are they your lovers.
5 Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya, unu ụmụ agbọghọ Jerusalem. Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.
I am dark, but fair of form, O daughters of Jerusalem, as the tents of Kedar, as the curtains of Solomon.
6 Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji. Ọ bụ anwụ gbajiri m. Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m, zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị, ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.
Let not your eyes be turned on me, because I am dark, because I was looked on by the sun; my mother's children were angry with me; they made me the keeper of the vine-gardens; but my vine-garden I have not kept.
7 Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya, ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri? Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie? Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị.
Say, O love of my soul, where you give food to your flock, and where you make them take their rest in the heat of the day; why have I to be as one wandering by the flocks of your friends?
8 Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma, soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.
If you have not knowledge, O most beautiful among women, go on your way in the footsteps of the flock, and give your young goats food by the tents of the keepers.
9 Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.
I have made a comparison of you, O my love, to a horse in Pharaoh's carriages.
10 Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma, olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.
Your face is a delight with rings of hair, your neck with chains of jewels.
11 Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo, nke e ji ọlaọcha chọọ mma.
We will make you chains of gold with ornaments of silver.
12 Mgbe eze nọ na tebul ya, mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile.
While the king is seated at his table, my spices send out their perfume.
13 Onye m hụrụ dị m ka ụda máá e kechiri nʼakpa nke dị nʼetiti ara m abụọ.
As a bag of myrrh is my well-loved one to me, when he is at rest all night between my breasts.
14 Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.
My love is to me as a branch of the cypress-tree in the vine-gardens of En-gedi.
15 Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya. Leenụ ka ị si maa mma! Anya gị dịka nduru.
See, you are fair, my love, you are fair; you have the eyes of a dove.
16 Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke. E, ị mara mma. Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ.
See, you are fair, my loved one, and a pleasure; our bed is green.
17 Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida, ntuhie ya bụkwa osisi fịa.
Cedar-trees are the pillars of our house; and our boards are made of fir-trees.

< Abụ nke Abụ 1 >