< Rut 2 >

1 Ma Naomi nwere otu nwanne di ya, onye bara ụba, bụrụkwa onye a maara nke ọma, onye si nʼagbụrụ Elimelek. Aha nwoke a bụ Boaz.
And Naomi had a kinsman of her husband's, a mighty man of valour, of the family of Elimelech, and his name was Boaz.
2 Rut onye Moab, gwara Naomi okwu sị ya, “Kwere ka m gaa nʼubi ebe a na-aghọ ọka, ka m lee ma m ga-achọta ihuọma nʼihu ndị na-aghọ ọka, ndị ga-ekwere ka m tụtụkọta ọka ndị ha hapụrụ.” Naomi zara sị ya, “Ọ dị mma nwa m, gaa.”
And Ruth the Moabitess said unto Naomi: 'Let me now go to the field, and glean among the ears of corn after him in whose sight I shall find favour.' And she said unto her: 'Go, my daughter.'
3 Ya mere, Rut pụrụ gaa na-atụtụ ọka nʼazụ ndị na-ewe ihe ubi. Ma dịka ihe si dị, Rut chọpụtara na ubi ọ na-atụtụ ọka bụ ubi Boaz, onye si nʼagbụrụ Elimelek.
And she went, and came and gleaned in the field after the reapers; and her hap was to light on the portion of the field belonging unto Boaz, who was of the family of Elimelech.
4 Nʼoge ahụ, Boaz nʼonwe ya si na Betlehem bịarute nʼubi ahụ, kelee ndị ahụ na-aghọ mkpụrụ nʼubi sị ha, “Onyenwe anyị nọnyere unu.” Ha niile zakwara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị.”
And, behold, Boaz came from Beth-lehem, and said unto the reapers: 'The LORD be with you.' And they answered him: 'The LORD bless thee.'
5 Mgbe Boaz hụrụ Rut, ọ jụrụ onyeisi ndị ọrụ ubi ya sị, “Onye ka nwanyị a bụ?”
Then said Boaz unto his servant that was set over the reapers: 'Whose damsel is this?'
6 Onye nlekọta ọrụ ubi ahụ zaghachiri, “Ọ bụ onye Moab ahụ so Naomi lọta.
And the servant that was set over the reapers answered and said: 'It is a Moabitish damsel that came back with Naomi out of the field of Moab;
7 Ọ sịrị, ‘Biko kwere ka m soro ndị ọrụ nʼazụ tụtụkọtaa ukwu ọka ha hapụrụ.’ Kemgbe ụtụtụ ọ bịara, ọ kwụsịbeghị ọrụ ya karịakwa naanị nwa mgbe nta o zuru ike nʼokpuru ndo.”
and she said: Let me glean, I pray you, and gather after the reapers among the sheaves; so she came, and hath continued even from the morning until now, save that she tarried a little in the house.'
8 Ya mere, Boaz gwara Rut okwu sị ya, “Nwa m nwanyị, gee m ntị. Agakwala ịtụtụ ọka nʼubi ọzọ, esitekwala nʼebe a pụọ. Soro ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi nọdụ nʼebe a.
Then said Boaz unto Ruth: 'Hearest thou not, my daughter? Go not to glean in another field, neither pass from hence, but abide here fast by my maidens.
9 Lezie anya nʼubi ebe ndị ikom na-ewe ihe ubi, ma soro ụmụ agbọghọ ndị a. Enyela m ndị ikom ndị a iwu ka ha ghara ịmetụ gị aka. Mgbe ọbụla agụụ mmiri gụrụ gị, gaa nʼite mmiri ndị ahụ ndị ikom gbanyere mmiri kuru mmiri ṅụọ.”
Let thine eyes be on the field that they do reap, and go thou after them; have I not charged the young men that they shall not touch thee? and when thou art athirst, go unto the vessels, and drink of that which the young men have drawn.'
10 Mgbe Boaz na-agwa ya okwu, Rut hulatara isi ya ala. Emesịa o kwuru sị, “Gịnị mere m ji chọta ụdị amara dị otu a nʼebe ị nọ, na ị hụtara m, ebe ị maara na m bụ naanị onye mba ọzọ?”
Then she fell on her face, and bowed down to the ground, and said unto him: 'Why have I found favour in thy sight, that thou shouldest take cognizance of me, seeing I am a foreigner?'
11 Boaz zara sị ya, “Anụla m ihe niile i meere nne di gị site nʼoge di gị nwụrụ, na otu i si hapụ nne gị na nna gị, na ala ebe amụrụ gị, bịa nʼebe a ibi nʼetiti ndị ị na-amaghị na mbụ.
And Boaz answered and said unto her: 'It hath fully been told me, all that thou hast done unto thy mother-in-law since the death of thy husband; and how thou hast left thy father and thy mother, and the land of thy nativity, and art come unto a people that thou knewest not heretofore.
12 Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka Onyenwe anyị onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile.”
The LORD recompense thy work, and be thy reward complete from the LORD, the God of Israel, under whose wings thou art come to take refuge.'
13 Rut zara sị ya, “Ka m gaa nʼihu na-achọta amara nʼebe ị nọ, onyenwe m. Nʼihi na ị kasịela m obi, gwakwa m, odibo nwanyị gị, okwu dị nro. Ọ bụ ezie na m abụghị otu nʼime ndị odibo nwanyị gị.”
Then she said: 'Let me find favour in thy sight, my LORD; for that thou hast comforted me, and for that thou hast spoken to the heart of thy handmaid, though I be not as one of thy handmaidens.'
14 Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.” Mgbe o soro ndị ahụ na-ewe ihe ubi nọdụ ala iri ihe, o nyere ya ụfọdụ ọka a hụrụ nʼọkụ. O riri, rijuo afọ ma nri e nyere ya fọdụrụ.
And Boaz said unto her at meal-time: 'Come hither, and eat of the bread, and dip thy morsel in the vinegar.' And she sat beside the reapers; and they reached her parched corn, and she did eat and was satisfied, and left thereof.
15 Mgbe o biliri ịchịkọtakwa ọka, Boaz nyere ụmụ okorobịa ya iwu, “Hapụnụ ya ka ọ chịkọta ọka ọ bụladị nʼetiti ukwu ọka ndị guzo eguzo, unu agwala ya okwu ihere ọbụla.
And when she was risen up to glean, Boaz commanded his young men, saying: 'Let her glean even among the sheaves, and put her not to shame.
16 Unu sitekwa nʼukwu ọka mịpụtara ya ụfọdụ tụsara ya nʼala ka ọ tụtụrụ. Unu abarala ya mba.”
And also pull out some for her of purpose from the bundles, and leave it, and let her glean, and rebuke her not.'
17 Ya mere, Rut tụtụrụ ọka nʼubi ahụ ruo oge anyasị. Mgbe ọ fuchasịrị ọka balị niile ọ tụtụtara, o nwetara ihe nwere ike iru otu bushel.
So she gleaned in the field until even; and she beat out that which she had gleaned, and it was about an ephah of barley.
18 O buuru ya baa nʼime obodo, bunye ya nne di ya, nyekwa ya nri o rifọrọ mgbe o rijuchara afọ.
And she took it up, and went into the city; and her mother-in-law saw what she had gleaned; and she brought forth and gave to her that which she had left after she was satisfied.
19 Nne di ya jụrụ ya, “Ebee ka ị tụtụrụ ọka taa? Ebee ka ị rụrụ ọrụ? Ka nwoke ahụ hụtara gị bụrụ onye a gọziri agọzi.” Rut kọọrọ nne di ya banyere onye ahụ ọ rụrụ ọrụ na nke ya. Ọ sịrị, “Aha nwoke mụ na ya rụrụ ọrụ bụ Boaz.”
And her mother-in-law said unto her: 'Where hast thou gleaned to-day? and where wroughtest thou? blessed be he that did take knowledge of thee.' And she told her mother-in-law with whom she had wrought, and said: 'The man's name with whom I wrought to-day is Boaz.'
20 Mgbe ahụ Naomi zara nwunye nwa ya sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri ka ọ bụ, onye na-ahapụbeghị igosi ebere ya nye ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nwoke a bụ otu nʼime ndị agbụrụ anyị, otu onye nʼime ndị onye mgbapụta anyị.”
And Naomi said unto her daughter-in-law: 'Blessed be he of the LORD, who hath not left off His kindness to the living and to the dead.' And Naomi said unto her: 'The man is nigh of kin unto us, one of our near kinsmen.'
21 Mgbe ahụ Rut, onye Moab sịrị, “Ihe ọ sịkwara m bụ, ‘Nọnyere ndị ọrụ m tutu ruo mgbe ha ghọchara ọka niile dị nʼubi m.’”
And Ruth the Moabitess said: 'Yea, he said unto me: Thou shalt keep fast by my young men, until they have ended all my harvest.'
22 Naomi sịrị Rut, nwunye nwa ya, “Nwa m nwanyị, ọ kaara gị mma ime dịka o kwuru. Soro ụmụ agbọghọ nọ nʼubi ya nʼazụ tụtụọ ọka ị na-atụtụ, nʼihi na nʼubi onye ọzọ, e nwere ike imerụ gị ahụ.”
And Naomi said unto Ruth her daughter-in-law: 'It is good, my daughter, that thou go out with his maidens, and that thou be not met in any other field.'
23 Ya mere, Rut sogidere ụmụ agbọghọ Boaz na-atụtụ ọka, tutu ruo ọgwụgwụ ịghọ ọka balị na wiiti. Ya na nne di ya bigidekwara.
So she kept fast by the maidens of Boaz to glean unto the end of barley harvest and of wheat harvest; and she dwelt with her mother-in-law.

< Rut 2 >