< Ndị Rom 9 >

1 Ana m ekwu eziokwu nʼime Kraịst. Anaghị m ekwu okwu ụgha. Akọnuche m nke Mmụọ Nsọ na-achị na-agbakwara m ama.
I am speaking the truth in Christ. My conscience confirms through the Holy Spirit that I am not lying when I say
2 A nọ m nʼọnọdụ oke ihe mwute na ihe mgbu dị ukwuu nʼobi m.
that I have great sorrow and unceasing pain in my heart.
3 A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe mee, ejikeere m ịbụ onye a bụrụ ọnụ na onye e wepụrụ site nʼebe Kraịst nọ nʼihi ụmụnna m na ndị ikwu m,
For I could wish that I myself were accursed, cut off from Christ for the sake of my brothers, my kinsmen according to the flesh.
4 bụ ndị Izrel. Ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ụmụ ya, ndị o nyere ebube ya na ọgbụgba ndụ ya. O nyekwara ha iwu na ife ofufe nʼụlọnsọ ukwu ahụ na ọtụtụ nkwa dị iche iche.
They are Israelites, and to them belong the adoption as sons, the glory, the covenants, the giving of the law, the temple service, and the promises.
5 Ha si nʼagbụrụ nna nna anyị ochie ha. Kraịst nʼonwe ya, nʼụdịdị mmadụ, sikwa nʼagbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
To them belong the patriarchs, and from them, according to the flesh, came the Christ, who is God over all, blessed forever. Amen. (aiōn g165)
6 Ọ bụghị dị ka a ga-asị na okwu Chineke na-ala azụ. Nʼihi na ọ bụghị onye ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị Izrel bụ onye Izrel.
It is not as though the word of God has failed. For not all Israelites truly belong to Israel,
7 Na ha sitere nʼagbụrụ Ebraham pụta emeghị ka ha bụrụ ụmụ Ebraham nʼezie. Ma nʼakụkụ nke ọzọ, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.”
and not all of Abraham's children are his true descendants, but, “Through Isaac yoʋr descendants will be counted.”
8 Nke a na-egosi na ọ bụghị ndị niile a mụrụ na-anụ ahụ bụ ụmụ Chineke, kama ụmụ ndị ahụ e kwere na nkwa bụ ndị a na-agụnye dị ka ụmụ Ebraham site na nkwa ahụ.
That is, it is not the children of the flesh who are the children of God; rather, the children of the promise are counted as descendants.
9 Lee ka e si kwee nkwa ahụ, “Mgbe oge ahụ a kara aka ruru, aga m alọghachi, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”
For this is what God promised: “About this time next year I will come, and Sarah will have a son.”
10 Ọ bụghị naanị nke a. Ụmụ Ribeka si nʼotu nna, ya bụ nna nna anyị Aịzik.
Not only that, but when Rebecca had conceived by one man, our father Isaac,
11 Ma tupu a mụọ ụmụ ejima ndị a, ma ọ bụkwanụ tupu ha emee ihe ọbụla dị mma maọbụ nke dị njọ, iji mee ka ọchịchọ Chineke banyere nhọpụta ha guzoro,
though her sons were not yet born and had done nothing good or evil, in order for the purpose of God's choice to stand (not because of works but because of him who calls),
12 ọ bụghị site nʼọrụ kama ọ bụ site nʼonye ahụ nke na-akpọ, nʼihi na a gwara ya sị, “Nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”
she was told, “The older will serve the younger.”
13 Dịka e dere ya, “Jekọb ka m hụrụ nʼanya ma Ịsọ ka m kpọrọ asị.”
As it is written, “Jacob I loved, but Esau I hated.”
14 Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ bụ onye ajọ omume? Mba!
What then shall we say? Is there injustice with God? Certainly not!
15 Nʼihi na ọ gwara Mosis, “Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.”
For he says to Moses, “I will have mercy on whom I have mercy, and I will have compassion on whom I have compassion.”
16 Ya mere, ọ dabereghị nʼọchịchọ nke mmadụ maọbụ ịrụsị ọrụ ike ya kama ọ dabere nʼebere Chineke.
So then, it does not depend on human will or effort, but on God's mercy.
17 Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ gwara Fero, “Emere m ka ị bụrụ ihe ị bụ nʼihi nke a, ka m were gị zipụta ike m, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.”
For the Scripture says to Pharaoh, “I have raised yoʋ up for the very purpose of showing my power in yoʋ, so that my name might be declared in all the earth.”
18 Ọ pụtara ihe na ọ bụ naanị ndị Chineke chọrọ ka ọ na-emere ebere, ndị ọ chọkwara ka ọ na-eme ka ha bụrụ ndị obi ha kpọchiri akpọchi.
So then, God has mercy on whom he wants to have mercy, and he hardens whom he wants to harden.
19 Ma eleghị anya unu pụrụ ịgwa m, “Gịnị kwanụ mere o ji ata anyị ụta? Onye kwanụ pụrụ iguzogide ihe o zubere ime?”
Yoʋ will say to me then, “Why does he still find fault? For who can resist his will?”
20 Onye ka ị bụ gị mmadụ efu, iji ajụ Chineke ajụjụ? “Nkata mmadụ na-akpa ọ ga-ajụ onye na-akpa ya ajụjụ, ‘Onye sị gị kpaa m otu a?’”
On the contrary, O man, who are yoʋ to answer back to God? Shall the thing formed say to him who formed it, “Why did yoʋ make me like this?”
21 Otu a kwa, onye ọkpụ ite o nweghị ike isite nʼotu ụrọ ahụ o nwere kpụọ ụdị ite ọbụla masịrị ya, ụfọdụ ite pụrụ iche na ụfọdụ e ji eje ozi nʼụlọ?
Does the potter not have a right over the clay, to make out of the same lump one vessel for honorable use and another for dishonorable use?
22 Ọ bụrụkwanụ na Chineke ekpebie igosi iwe ya na ime ka a mara ike ya site nʼinwe oke ndidi banyere ndị oke iwe ya ga-adakwasị bụ ndị a kwadoro maka mbibi?
What if God, although willing to show his wrath and to make his power known, endured with much patience vessels of wrath fitted for destruction,
23 Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a.
in order to make known the riches of his glory upon vessels of mercy that he has prepared in advance for glory,
24 Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ?
namely us whom he has called, not from the Jews only but also from the Gentiles?
25 Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya, “Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m. Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.”
As he says in Hosea, “Those who were ‘not my people’ I will call ‘my people,’ and those who were ‘not beloved’ I will call ‘beloved.’
26 Ma, “Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ nke Chineke dị ndụ.’”
And in the place where it was said to them, ‘You are not my people,’ there they will be called ‘sons of the living God.’”
27 Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel, “Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri, maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta.
And Isaiah cries out concerning Israel, “Though the number of the sons of Israel be as the sand of the sea, only the remnant will be saved.
28 Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe. Ọ ga-eme ọsịịsọ nʼikpe ahụ ma kpebie ya.”
For the Lord will settle the matter swiftly and justly; his sentence will be executed upon the earth without delay.”
29 Ọ bụkwa dịka Aịzaya kwuru na mbụ, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ahapụrụghị anyị ụmụ ụmụ, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.”
And just as Isaiah foretold, “If the Lord of hosts had not left us any descendants, we would have been like Sodom and become like Gomorrah.”
30 Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na o enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ha gbasoro ezi omume, ma ha natara ya, bụ ezi omume nke sitere nʼokwukwe,
What then shall we say? That Gentiles who were not pursuing righteousness have obtained righteousness, that is, the righteousness that is by faith.
31 ma ndị Izrel na-agbaso iwu nke ezi omume, enwebeghị ike ime onwe ha ndị a ga-anabata.
But Israel, although they pursued a law of righteousness, did not attain a law of righteousness.
32 Gịnị gbochiri ha? Ọ bụ nʼihi na ha agbasoghị ya site nʼokwukwe. Kama ha chere na ọ bụ site nʼọrụ. Ha zọhiere ụkwụ nʼoke nkume ịsọ ngọngọ ahụ.
Why? Because they did not pursue it by faith, but as though it were by works of the law. They stumbled over the stone of stumbling,
33 Dịka e dere ya, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ma onye nke kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
as it is written, “Behold, I am placing in Zion a stone of stumbling and a rock of offense, yet no one who believes in him will be put to shame.”

< Ndị Rom 9 >