< Ndị Rom 16 >

1 Ana m eme ka unu mata nwanna anyị nwanyị, Fibi, onye na-ejere nzukọ ozi na chọọchị dị nʼobodo Senkria.
Namkabidhi kwenu Fibi dada yetu, ambaye ni mtumishi wa kanisa ambalo liko Kenkrea,
2 Biko nabatanụ ya nʼime Onyenwe anyị dịka o kwesiri ndị ya. Nyekwaranụ ya aka nʼụzọ niile unu nwere ike, nʼihi na o nyerela mụ na ọtụtụ ndị ọzọ aka.
ili kwamba mnaweza kumpokea katika Bwana. Fanyeni hivi katika kicho cha thamani cha waumini, na msimame pamoja naye katika jambo lolote atakalokuwa na uhitaji nalo. Maana yeye mwenyewe amekuwa mhudumu wa wengi, na kwa ajili yangu mwenyewe.
3 Keleerenụ m Prisila na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs.
Msalimu Priska na Akila, watenda kazi pamoja nami katika Kristo Yesu,
4 Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha.
ambao kwa maisha yangu waliyahatarisha maisha yao wenyewe. Ninatoa shukrani kwao, na siyo tu mimi, bali pia kwa makanisa yote ya mataifa.
5 Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyi m Epinetus. Nwoke a bụ onye buru ụzọ nabata Kraịst nʼobi ya, nʼakụkụ Eshịa niile.
Lisalimie kanisa ambalo liko nyumbani kwao. Msalimie Epanieto mpendwa wangu, ambaye ni mzaliwa wa kwanza wa Kristo katika Asia.
6 Keleerenụ m Meri, onye rụsịrị ọrụ ike nʼetiti unu.
Msalimie Mariamu ambaye ametenda kazi kwa bidii kwa ajili yenu.
7 Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nʼụlọ mkpọrọ. Ndị ozi niile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst.
Msalimie Androniko na Yunia, jamaa zangu, na wafungwa pamoja nami. Ni wa muhimu miongoni mwa mitume, ambao pia walitangulia kumjua Kristo kabla yangu.
8 Kelekwaaranụ m Ampliatọs onye m hụrụ nʼanya nʼime Onyenwe anyị.
Msalimie Ampliato, mpendwa wangu katika Bwana.
9 Keleenụ Ọbanọs, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ Kraịst, na Stakis ezi enyi m.
Msalimie Urbano, mtenda kazi pamoja nami katika Kristo, na Stakisi mpendwa wangu.
10 Otu a kwa, keleenụ Apelis onye anwapụtarala nguzosike ya nʼime Kraịst. Keleenụ ndị ezinaụlọ Aristobulọs.
Msalimie Apele, mwenye kukubaliwa katika Kristo. Wasalimie wote ambao walio katika nyumba ya Aristobulo.
11 Keleerenụ m Herodian onye ikwu m. Keleekwanụ ndị bi nʼụlọ Nasisọs. Ha bụ ndị nke Chineke.
Nisalimie Herodioni, jamaa yangu. Nisalimie wote walio katika nyumba ya Narkiso, ambao wako katika Bwana.
12 Keleekwanụ Traịfina na Traịfosa ndị a na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike. Keleekwanụ Pesis, onye m hụrụ nʼanya na onye na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike.
Nisalimie Trifaina na Trifosa, wanaotenda kazi kwa bidii katika Bwana. msalimie Persisi mpendwa, ambaye ametenda kazi zaidi kwa Bwana,
13 Keleere m Rufọs onye Onyenwe anyị nʼonwe ya họpụtara, na nne ya, onye na-emekwara m ka nne.
Nisalimie Rufo, aliyechaguliwa katika Bwana na mama yake na wangu.
14 Ana m ekele unu Asinkritọs, Flegọn, Hamis, Patrobas, Hamis na ụmụnna anyị niile ndị ha na ha nọ.
Msalimie Asinkrito, Flegon, Herme, Patroba, Herma, na ndugu wote walio pamoja nao.
15 Keleerenụ m Filologọs, Juliya, Nerus na nwanne ya nwanyị. Keleekwanụ Olimpas na ndị nsọ niile ha na ha nọ.
Nisalimie Filologo naYulia, Nerea na dada yake, na Olimpa, na waumini wote walio pamoja nao.
16 Werenụ isurita ọnụ dị nsọ, kelerịta onwe unu. Nzukọ Kraịst niile nọ nʼebe a na-ekelekwa unu.
Nisalimie kila mmoja kwa busu takatifu. Makanisa yote katika Kristo yawasalimu.
17 Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu.
Sasa nawasihi, ndugu, kutafakari juu ya hao ambao wanasababisha mgawanyiko na vipingamizi. Wanakwenda kinyume na mafundisho ambayo mmekwisha kujifunza. Geukeni mtoke kwao.
18 Ndị dị otu a abụghị ndị ozi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ha na-arụ naanị nʼihi akpa ha. Ha maara otu e si eji ire ụtọ edufu ndị obi ha na-esighị ike.
Kwa maana watu kama hawa hawamtumikii Kristo Bwana, bali matumbo yao wenyewe. Kwa maneno yao laini na pongezi za uongo wanadanganya mioyo ya wasio na hatia.
19 Mmadụ niile anụla maka nrube isi unu na-erubere oziọma ahụ. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi unu. Achọrọ m ka unu bụrụ ndị maara ihe banyere ezi ihe, ka unu bụrụ ndị na-amaghị ihe nʼihe banyere ihe ọjọọ.
Kwa mfano wa utii wenu mwamfikia kila mmoja. Kwa hiyo, nafurahi juu yenu, lakini nawataka ninyi mwe na busara katika hali ya wema, na kutokuwa na hatia mbele ya uovu.
20 Mgbe na-adịghị anya, Chineke nke udo ga-azọpịa ekwensu nʼokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.
Mungu wa amani hatakawia kumwangamiza shetani chini ya nyayo zenu. Neema ya Bwana Yesu Kristo iwe pamoja nanyi.
21 Timoti onye so m na-arụkọ ọrụ, na Lusiọs, na Jesin na Sosipata, ndị ikwu m na-ekele unu.
Timotheo, mtendakazi pamoja nami, awasalimu, na Lukio, Yasoni na Sospeter, jamaa zangu.
22 Mụ onwe m bụ Tatiọs, onye dere akwụkwọ a, na-ekelekwa unu nʼaha Onyenwe anyị.
Mimi, Tertio, niliyeuandika waraka huu, nawasalimu katika jina la Bwana.
23 Gaiọs, onye na-ele mụ na nzukọ niile ọbịa nʼebe a, na-ekelekwa unu. Otu a kwa, ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ya na-ekelekwa unu. Erastọs, onye na-elekọta ihe ndị obodo a na nwanna anyị nwoke Kwatọs, na-ekelekwa unu.
Gayo, aliyenitunza na kwa kanisa lote, lawasalimu. Erasto, mtunza hazina wa mji, awasalimu, pamoja na Kwarto aliye ndugu.
24 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyeere unu niile. Amen.
(Zingatia: Katika nakala halisi za kwanza, mstari huu haupo. Tazama Warumi 16: 20. “Neema ya Bwana Yesu Kristo ikae nanyi nyote. Amina.”)
25 Ana m enyefe unu nʼaka onye ahụ pụrụ ime ka unu guzosie ike site nʼoziọma m kwusaara unu, nakwa nkwupụta nke Jisọs Kraịst, dịka mkpughe nke ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ọtụtụ ọgbọ ndị gara aga siri dị. (aiōnios g166)
Sasa kwake yeye aliye na uwezo kufanya msimame kulingana na injili na mafundisho ya Yesu Kristo, kulingana na ufunuo wa siri iliyofichwa kwa muda mrefu, (aiōnios g166)
26 Ma ugbu a, e kpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè site nʼihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ, ka ndị mba ọzọ niile maara ya dịka ihe Chineke ebighị ebi nyere nʼiwu ya si dị, ka ha mụta irube isi nke na-esite nʼokwukwe. (aiōnios g166)
lakini sasa imekwisha funuliwa na kufanywa kujulikana na maandiko ya unabii kulingana na amri ya Mungu wa milele, kwa utii wa imani miongoni mwa mataifa yote? (aiōnios g166)
27 Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen. (aiōn g165)
Kwa Mungu pekee mwenye hekima, kupitia Yesu Kristo, kuwe na utukufu milele yote. Amina (aiōn g165)

< Ndị Rom 16 >