< Ndị Rom 13 >
1 Ka onye ọbụla doo onwe ya nʼokpuru ndị na-achị achị, nʼihi na ikike ọchịchị ọbụla agaghị adị ma ọ bụrụ na Chineke akwadoghị ya. Ọ bụkwa Chineke tọrọ ntọala ikike ọchịchị niile e nwere.
Každý se má podřídit pozemské vládě, neboť vládní moc má svůj původ od Boha.
2 Ya mere, onye ọbụla na-enupu isi nʼokpuru ọchịchị, na-emegide ihe Chineke hiwere, ndị na-eme nke a ga-ewetara onwe ha ikpe ọmụma.
Kdo se staví proti ní, staví se proti řádu, který Bůh ustanovil, a přivolává na sebe trest.
3 Ndị na-eme ezi ihe anaghị atụ egwu ndị nọ nʼọchịchị, kama ndị na-atụ ha egwu bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ya mere ọ bụrụ na ị chọghị ịtụ ndị na-achị achị egwu, mee ihe dị mma, ha ga-etokwa gị.
Vláda tu není od toho, aby naháněla strach za dobré jednání, nýbrž za špatné. Jednej v souladu se zákony a nemusíš se jí bát.
4 Nʼihi na ọ bụ onyeozi Chineke maka ọdịmma nke gị, ma ọ bụrụ na unu mere ihe na-adịghị mma, tụọnụ egwu, nʼihi na onye na-achị achị nwere ezi nkwado ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. Ọ bụ onyeozi Chineke bụrụkwa onye na-eji ọnụma na-ata ndị mmebi iwu ahụhụ.
Jejím úkolem od Boha je sloužit občanům k dobru. Kdo ovšem páchá zlo, má se proč bát; ne nadarmo má vláda také meč. I to je jejím posláním od Boha, aby trestala zlo.
5 Ya mere unu kwesiri irubere ndị na-achị achị isi, ọ bụghị naanị maka ahụhụ dịrị ndị nnupu isi, kama nʼihi akọnuche.
Proto je nutno vládu respektovat nejen ze strachu před trestem; to je i věc svědomí.
6 Ọ bụkwa nke a kpatara unu ji na-atụ ụtụ isi nke taks, nʼihi na ndị na-achị achị na-ejere Chineke ozi mgbe ha na-aga nʼihu nʼezi ọchịchị.
Ze stejného důvodu například platíme daně. Stát je vybírá v zájmu veřejného blaha a také výběrčí svým způsobem slouží všem, když plní tento svěřený úkol.
7 Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, ọ bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, ọ bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, ọ bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu.
Dávejte tedy každému, co mu náleží: Komu daň – tomu daň, komu clo – tomu clo, komu úcta – tomu úcta, komu čest – tomu čest.
8 Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ.
Nedělejte si dluhy. Jediný dluh nikdy nesplatíte: vzájemnou lásku mezi vámi. Kdo druhé lidi miluje, ten plní zákon.
9 Iwu niile e nyere, “Gị akwala iko,” “Egbula mmadụ,” “Ezula ohi,” “Enwela anya ukwu nʼihe mmadụ ibe gị nwere,” nakwa iwu ndị ọzọ niile e nyere ka a chịkọtara nʼotu nke a sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị nʼanya dịka onwe gị.”
Vždyť všechna ta přikázání jako „nebudeš cizoložit, zabíjet, krást, toužit po cizím vlastnictví“a kterákoliv jiná jsou zahrnuta v tomto jediném: Miluj svého bližního jako sám sebe.
10 Ịhụnanya adịghị echere onye agbataobi ya echiche ọjọọ, ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu niile.
Láska neumí ublížit, proto láska je naplněním zákona.
11 Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya abịala nso. Ya mere, sitenụ nʼụra bilie, nʼihi na nzọpụta anyị adịla nso ugbu a karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ.
Mějte to vše na paměti tím spíše, že víte, v jak kritické době žijeme. Přišel už čas probrat se z netečnosti. Očekávané vysvobození se blíží.
12 Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ. Ka anyị yipụ uwe ọrụ nke ọchịchịrị, ma yikwasị ngwa agha nke ìhè.
Noc se chýlí ke konci, den je přede dveřmi. Nechme tedy všeho, co patří do říše tmy, jako jsou pitky a nevázané zábavy, nemravnosti a bezuzdnosti, sváry a závist a připravujme se vstříc světlu.
13 Bụrụnụ ndị dị ọcha, dịka ndị na-akpagharị nʼehihie. Ọ bụghị nʼịgba egwu ruru unyi, maọbụ nʼịṅụbiga mmanya oke, ọ bụghị nʼịkwa iko, na imefe ihe ụwa oke. Ọ bụghị nʼesemokwu, na ekworo.
14 Kama yirinụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịka uwe. Unu enyekwala ahụ unu ohere inweta ihe niile nke na-agụ ya.
Všechno vaše jednání ať určuje Ježíš Kristus. Nevěnujte příliš pozornosti tělu, abyste se nestali otroky jeho potřeb.