< Ndị Rom 10 >
1 Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha.
Bamwangu, intakazo ye inkulo yangu ni inkupo yangu kwa Ireeza, kuhazwa kwabo.
2 Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke.
Sina haniha bupaki kuamana nabo kuti bena inchiseho kwa Ireeza, kono isiñi chokuya che inzibo.
3 Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke.
Kakuti kabezi kuluka kwa Ireeza, imi basaka kuzaka kuluka kwabo bene. Kena babali tuli kunsi yo kuluka kwa Ireeza.
4 Kraịst bụ ọgwụgwụ iwu. Ya mere, ezi omume ga-adịrị onye ọbụla nke kwere.
Kakuti Kirisite nji mwi zuzilikizi wo mulao cho kuluka kwa zumwi ni zumwi yo zumina.
5 Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, “Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha.”
Kakuti Mushe uñola kuamana ni kuluka kuzwa ku mulao: “Muntu yo panga kuluka kwa mulao kahale cho ku kuluka.”
6 Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’” (nke bụ, ikudata Kraịst)
Kono kuluka kuzwa kwi intumelo kuwamba ichi, “Kanji u wambi mwi inkulo yako, 'Njeni yese akambame mwi wulu?' (cho kuti, kuleta Kirisite hansi);
7 “maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). (Abyssos )
imi kanji uti, 'Njeni yesa shetumukile mwilindi lisena ma manimani?”' (cho kuti, ku zikula Kirisite kuba fwile). (Abyssos )
8 Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,” ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa.
Kono iwamba nzi? “Linzwi lina he mbali nawe, mukaholo kako imi ni mwi inkulo yako.” Ilyo nji linzwi lye intumelo, li tuwamba.
9 Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị.
Mukuti haiba cha kaholo kako uwamba kuti Jesu nji Simwine, imi ni kuzumina mwi inkulo yako kuti Ireeza aba mubusi kuba fwile, kohazwe.
10 Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị.
Kakuti che inkulo muntu uzumina cho kuluka, imi cha kaholo u lemuha cha kuhazwa.
11 Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
Kakuti iñolo liwamba, “Yense yo zumina kwali kese na swabiswe.”
12 Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke.
Kakuti kakwina inshutano mukati ka Mujunda ni Mugerike. Kakuti Simwine uswana nji Simwine wa bonse, imi ufumite kubonse basumpa kwali.
13 Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.”
Kakuti yense yo sumpa he zina lya Simwine ka hazwe.
14 Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị?
Cwale linu kaba sumpe bule kwali ubasena ba bazumini? Mu ba zumine bule mwali ibasena ba bazuwi? Mu ba zuwe bule nikusena mukutazi?
15 Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.”
Cwale kaba kutaze bule, kwanda haba tumwa? Sina mukuñolelwe, “Malotu bule mantende abo bawamba makande a zintu zi lotu!”
16 Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?”
Kono bonse kena ba tekelezi kwi ivangeli. Mukuti Isaya uwamba, “Simwine, njeni ya ba zumini iñusa lyetu?
17 Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.
Linu intumelo iza cha kuzuwa, imi ni kuzuwa cha linzwii lya Kirisite.
18 Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie. “Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”
Kono ni wamba, “Kana baba zuwi?” Eee, cho buniti. “Mulumo wabo ubayendi mwi inkanda zonse, imi manzwi abo ku mamani mani e inkanda.”
19 Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị, “Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu; aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.”
Nihakubabulyo, ni wamba, “Kana Isiraele kana abezi?” Intanzi Mushe uti, “Kani mitangole cha muna kecho chisali che inkanda. Cha mukwa we inkanda ni kusena kuzuwisisa, kani mi tangole mane mubenge.”
20 Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị, “Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m, ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.”
Linu Isaya abena bundume ha wamba, “Niba wanwa kwabo basana babali kunigana. Niba libonahazi kwabo basana babani kumbili.”
21 O kwuru banyere ndị Izrel, “Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niile nye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike.”
Kono kwa Isiraele uwamba, “Musihali onse ni ba wololi mayanza angu kubasa kuteki ni bantu bamahañi.”