< Mkpughe 4 >

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m hụ ọnụ ụzọ dị nʼeluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa, gbagota nʼebe a, ka m gosi gị ihe ga-emezuriri mgbe ihe ndị a gasịrị.”
Baada ya mambo haya nilitazama, nikaona kuwa mlango ulikuwa umefunguliwa mbinguni. Ile sauti ya kwanza, ikizungumza nami kama tarumbeta, ikisema, “Njoo hapa, nitakuonesha yatakayotokea baada ya mambo haya.”
2 Nʼotu oge ahụ, e mere ka m nọọ nʼime mmụọ, ma lee, ahụrụ m onwe m nʼeluigwe, hụkwa ka e debere otu ocheeze nke otu onye na-anọkwasị nʼelu ya.
Mara moja nilikuwa katika Roho, niliona kulikuwa na kiti cha enzi kimewekwa mbinguni, na mtu amekikalia.
3 Ụdịdị onye nọkwasịrị nʼocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dịka nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa na kanelian. Eke na egwurugwu dịka nkume oke ọnụahịa. Emeralụdụ gbara ocheeze ahụ gburugburu.
Mmoja aliyekuwa amekikalia alionekana kama jiwe la yaspi na akiki. Kulikuwa na upinde wa mvua umekizunguka kiti cha enzi. Upinde wa mvua ulionekana kama zumaridi.
4 Iri ocheeze abụọ na anọ ọzọ, gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu. Ndị nọkwasịrị nʼocheeze ndị a bụ iri ndị okenye abụọ na anọ, ndị yi uwe ọcha. Ha kpukwa okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha.
Kukizunguka kiti cha enzi kulikuwa na viti vya enzi vingine ishirini na vinne, na waliokaa kwenye viti vya enzi walikuwa wazee ishirini na wanne, wamevikwa mavazi meupe na taji za dhahabu vichwani mwao.
5 Mgbe ahụ, ụda dịka ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke sitere nʼocheeze ukwu ahụ na-ada na-achapụtakwa. Nʼihu ocheeze ukwu ahụ, e nwere oriọna asaa na-enwu ọkụ. Oriọna ndị a bụ mmụọ asaa nke Chineke.
Kutoka katika kiti cha enzi kulitoka miale ya radi, muungurumo na radi. Taa saba zilikuwa zikiwaka mbele ya kiti cha enzi, taa ambazo ni roho saba za Mungu.
6 Nʼihu ocheeze ahụ e nwere ihe dịka oke osimiri e ji enyo mee, nke na-enwu dịka kristal. Nʼetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ya, e nwere anụ anọ dị ndụ nwere anya nʼakụkụ ahụ ha niile, ihu na azụ.
Tena mbele ya kiti cha enzi kulikuwa na bahari, iliyowazi kama kioo. Wote kuzunguka kiti cha enzi kulikuwa na wenye uhai wanne, waliojaa macho mbele na nyuma.
7 Nke mbụ nʼime anụ ndị ahụ dị ndụ nwere oyiyi dịka ọdụm. Nke abụọ dịka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dịka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe.
Kiumbe wa kwanza mwenye uhai alikuwa kama simba, kiumbe wa pili mwenye uhai alikuwa kama ndama, kiumbe wa tatu mwenye uhai alikuwa na uso kama wa mwanadamu, na yule mwenye uhai wa nne alikuwa kama tai apaaye.
8 Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị,
Viumbe wenye uhai wanne kila mmoja alikuwa na mabawa sita, wamejaa macho juu na chini yake. Usiku na mchana hawakomi kusema, “Mtakatifu, mtakatifu, mtakatifu ni Bwana Mungu, mtawala juu ya wote, aliyekuwepo, na aliyepo na atakayekuja.”
9 Mgbe ọbụla anụ ndị ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi otuto na nsọpụrụ na ekele, (aiōn g165)
Kila wakati viumbe wenye uhai walipotoa utukufu, heshima, na kushukuru mbele za aliyekuwa ameketi kwenye hicho kiti cha enzi, yeye aishiye milele na daima, (aiōn g165)
10 iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị, (aiōn g165)
wazee ishirini na wanne walisujudu wenyewe mbele yake aliyekikalia kiti cha enzi. Waliinama chini kwake aishiye milele na daima na kutupa chini taji zao mbele ya kiti cha enzi wakisema, (aiōn g165)
11 “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, kwesiri ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nʼihi na gị onwe gị kere ihe niile, ọ bụkwa site nʼọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”
“Wastahili wewe, Bwana wetu na Mungu wetu, kupokea utukufu na heshima na nguvu. Kwa kuwa uliviumba vitu vyote, na kwa mapenzi yako, vilikuwepo na viliumbwa.”

< Mkpughe 4 >