< Mkpughe 21 >
1 Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa.
我又看见一个新天、新地,因为第一个天和第一个地都过去了,海也不再存在了。
2 Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya.
我看见圣城,新耶路撒冷,从天上上帝那里降下来,做好准备,仿佛打扮整齐等候丈夫的新娘。
3 Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha.
我听见宝座那里传来巨大声音,说:“现在上帝的家与人类在一起,他将与他们一起生活,他们将成为他的子民。上帝要亲自与他们同在,作他们的上帝。
4 Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.”
他要从他们的眼中抹去一切眼泪,不再发生死亡,不再有悲哀、哭号或痛苦,因为之前的世界已不复存在。”
5 Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”
坐在宝座上的那一位说:“我让一切都变成新的!”他告诉我:“写下来,因为这些话都是可信的、真实的。”
6 Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye.
他又对我说:“一切都完成了,我是阿拉法,我是欧米茄;我是初始,也是最终。我要把生命的泉水,免费送给那些口渴的人喝。
7 Ndị ọbụla na-emeri emeri ga-enweta ihe nketa ndị a. Aga m abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ụmụ m.
那些获胜的,要继承这一切。我要作他的上帝,他要作我的孩子。
8 Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.” (Limnē Pyr )
但那些胆怯的、不信我的、做出可恶事情的、杀人的、淫乱的、行邪术的、拜神像的和所有说谎的人,他们选择的地点就是那烧着硫磺的火湖。这就是第二次的死亡。” (Limnē Pyr )
9 Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, nke ji efere asaa ahụ nke ihe ntaramahụhụ dị nʼime ya bịakwutere m sị m, “Soro m, ka m gosi gị nwaagbọghọ ahụ bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.”
拿个七碗的七位天使之一,走来对我说:“和我一起来!我像你展示这位新娘,羊羔的妻子。”
10 O buuru m nʼime Mmụọ buga m nʼotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. O gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata.
在灵中,他带我来到一座很高山峰的顶端,向我展示上帝降下来的圣城耶路撒冷,
11 O jupụtara nʼebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkarịsịrị oke ọnụahịa, dịka nkume jaspa, na-enwu dịka kristal.
上帝的荣光让它闪耀,城市的光辉好像极贵的宝石,又像晶莹的碧玉。
12 Mgbidi ya niile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼọnụ ụzọ ama ndị a nʼotu nʼotu.
城墙高大厚实,有十二个门,门口有十二位天使,门上写着以色列十二部落的名字。
13 Ọnụ ụzọ ama atọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, atọ dị nʼakụkụ ugwu, atọ dị nʼakụkụ ndịda, ebe atọ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
东边有三个门,南边有三个门,西边有三个门,北边有三个门。
14 Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Nʼelu nkume ndị a nʼotu nʼotu ka e dere aha ndị ozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.
城墙有十二个根基,根基上有羊羔的十二使徒名字。
15 Onye ahụ na-agwa m okwu ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nʼaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ama ya, na mgbidi ya.
对我说话的天使拿着一根黄金量尺,要丈量那城、城门和城墙。
16 Nʼobodo ahụ, enweghị otu akụkụ nʼime akụkụ anọ nke mgbidi ya karịrị ibe ya. Ogologo ya na obodobo ya ha otu. O ji ihe ọtụtụ tụọ ya, ogologo ya na obodobo nakwa ịdị elu ya ha, ọtụtụ ya dị puku kilomita abụọ na narị kilomita abụọ.
城为四方形状,长宽相同。天使用芦苇丈量那城,共 12,000 弗隆,长、宽、高都一样;
17 Ọ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ, dịka ihe ọtụtụ nke mmụọ ozi ahụ si gụpụta.
他又丈量了城墙,厚 144 腕尺。天使用的就是人类的度量衡。
18 Ihe e ji rụọ mgbidi ya bụ nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa, jiri ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwu dịka enyo dị ọcha rụọ obodo ahụ.
城墙以碧玉制成,城用看起来像是玻璃的纯金打造。
19 E ji nkume niile dị oke ọnụahịa chọọ ntọala mgbidi obodo ahụ mma. Ntọala nke mbụ, bụ nkume a na-akpọ jaspa, ntọala nke abụọ, nkume a na-akpọ safaia, ntọala nke atọ, nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ, nkume a na-akpọ emeralụdụ,
城墙的根基点缀着各样宝石:第一座根基是碧玉,第二座是蓝宝石,第三座是玛瑙,第四座是绿宝石,
20 nke ise, nkume a na-akpọ ọniks, nke isii, nkume a na-akpọ kanelian, nke asaa, nkume a na-akpọ krisolaịt, nke asatọ, nkume a na-akpọ beril, nke itoolu, nkume a na-akpọ topaazi, nke iri, nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu, nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ, nkume a na-akpọ ametisiti.
第五座是红玛瑙,第六座是红宝石,第七座是黄璧玺,第八座是水苍玉,第九座是红璧玺,第十座是翡翠,第十一座是紫玛瑙,第十二座是紫晶。
21 Ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ bụ pieal iri na abụọ, ọnụ ụzọ ama ọbụla ka e ji otu nkume pieal rụọ nʼotu nʼotu. Ihe e ji rụọ okporoụzọ dị nʼobodo ahụ bụ naanị ọlaedo a nụchara anụcha ọbụla, nke dị ọcha dịka enyo e hichaziri nke ọma.
十二个门由珍珠制成,每一个门都用一个珍珠打造。城里的街道是纯金的,好像透明的玻璃。
22 O nweghị ụlọnsọ ukwu ọbụla m hụrụ nʼime obodo ahụ nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọnsọ ukwu obodo ahụ nwere.
我在那里没有看见圣殿,因为主全能的上帝和羊羔就是城的圣殿。
23 Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ.
这城不需要日月照明,因为有上帝的荣耀照明,而羊羔就是城市的灯。
24 Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya.
所有国家要在它的光中行走,地上的国王要把他们的荣耀带到这城来。
25 A naghị emechi ọnụ ụzọ ama obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị niile nʼihi abalị ọbụla adịghịkwa nʼebe ahụ.
城门白天决不关闭。在那里并没有黑夜。
26 Ebube na nsọpụrụ nke mba niile ka a ga-ewebata nʼime ya.
所有国家的荣华尊贵都被带到这城。
27 Ọ dịkwaghị ihe ọbụla rụrụ arụ ga-abata nʼime ya. Otu a kwa, ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, maọbụ onye ụgha ga-abata nʼime ya, kama ọ bụ naanị ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ Nwa Atụrụ ahụ.
不洁净的、拜神像的、说谎的,都不能进入——只有那些写在羔羊生命册上的才可以。