< Mkpughe 2 >

1 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị nʼEfesọs, sị ya: Ihe ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ na-ejide kpakpando asaa nʼaka ya, ma na-ejegharịkwa nʼetiti ihe ịdọba oriọna ọlaedo asaa ndị ahụ.
你給厄弗所教會的天使寫:「那右手握著七顆星,而在那七盞金燈臺當中行走的這樣說:
2 Amaara m ihe niile banyere ọrụ gị niile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachiobi gị. Amaara m na ị dịghị anagide ndị ajọ omume, na ị nwaleela ndị ahụ niile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nʼezie, chọpụtakwa na ha bụ ndị ụgha.
我知道你的作為、你的苦勞和你的堅忍;也知道你不能容忍惡人,並且你也會查驗出那些自稱為宗徒而實非宗徒的人,發現他們是撒謊的人;
3 I jirila ntachiobi nagide nhụju anya nʼihi aha m, ma ike agwụghị gị.
也知道你有堅忍,為了我的名字受了苦,而毫不厭倦。
4 Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere.
可是,我有反對你的一條,就是你拋棄了你起初的愛德,
5 Cheta ọnọdụ i si na ya daa. Chegharịa, mekwa ihe ndị ahụ ị na-eme na mbụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m abịa wepụ ihe ịdọba oriọna gị site nʼọnọdụ ya.
所以你該回想你是從那裏跌下的,你該悔改,行先前所行的事:若你不悔改,我就要臨於你,把你的燈臺從原處挪去。
6 Ọ bụladị otu a, o nwere ihe ụfọdụ dị mma banyere gị. Ị kpọrọ ọrụ ọjọọ nke ndị Nikolaitan asị, dịka mụ onwe m si kpọọ ya asị.
不過你有一條:就是你惱恨了尼苛勞黨人的行為,這也是我所惱恨的。
7 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye ike iri mkpụrụ sitere nʼosisi ndụ ahụ nke dị na paradaịs nke Chineke.
有耳朵的,應聽聖神向各教會說的話:勝利的,我要把天主樂園中生命樹的果實,賜給他吃。」
8 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smyrna, sị ya: Ihe ndị a bụ okwu ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe niile. Onye nwụrụ anwụ ma dịkwa ndụ ọzọ.
你給斯米那教會的天使寫:「那身為元始和終末,曾死過而復生的這樣說:
9 Amaara m mkpagbu gị niile na ịda ogbenye gị. Ma nʼezie, ị bụ ọgaranya. Amaara m ihe banyere nkwutọ niile ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị Juu na-ekwutọ gị, ma ha abụghị ndị Juu, nʼezie ha bụ ụlọ nzukọ ekwensu.
我知道你的困苦和貧窮,其實你是富足的;也知道你由那些自稱為猶太人的人受的誹謗,其實他們不是猶太人,而是撒殫的會眾。
10 Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ.
不要怕你要受的苦!看,魔鬼要把你們中的一些人投在監裏,叫你們受試探;你們要遭受困難十天之久。你應當忠信至死,我必要賜給你生命的華冠。
11 Onye ọbụla nwere ntị ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Onye ọbụla na-emeri emeri, ọnwụ nke ugboro abụọ agaghị emekpa ya ahụ.
有耳朵的,應聽聖神向各教會說的話:勝利的必不受第二次死亡的害。」
12 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị Pegamọm, sị ya: Ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ ji mma agha ahụ dị nkọ nke nwere ihu abụọ nʼaka ya.
你給培爾加摩教會的天使寫:「那持有雙刃利劍的這樣說:
13 Amaara m ebe i bi, bụ obodo ebe ekwensu nwere ocheeze ya. Ma ị na-anọgidesi ike nʼaha m. Ị jụrụ ịgọnarị okwukwe gị nʼime m, ọ bụladị nʼoge Antipas onyeama m kwesiri ntụkwasị obi, bụ onye e gburu nʼobodo unu, ebe ekwensu bi.
我知道你居住的地方,在那裏有撒殫的寶座;當我忠信的見證安提帕在你們中間,即在撒殫居住的地方被殺的時日,你仍堅持了我的名字,從未否認對我的信仰。
14 Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko.
可是,我有反對你的幾條,就是:在你們那裏,你容忍了一些堅持巴郎教訓的人;巴郎曾教巴拉克在以色列子民前安放了絆腳石,叫他們吃祭肉,行邪淫;
15 Nʼotu aka ahụ, i nwekwara ụfọdụ mmadụ ndị jidesiri nkuzi Nikolaitan ike.
同樣,你也容忍了一些堅持尼苛勞黨人教訓的人。
16 Ya mere, chegharịa! Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị ọsịịsọ jiri mma agha dị m nʼọnụ buso ha agha.
所以你應當悔改,不然,我就要迅速臨於你,用我口中的利劍攻擊他們。
17 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Ọ bụ naanị onye na-emeri emeri ka m ga-enye ụfọdụ nʼime achịcha mánà ahụ e zoro ezo. Aga m enyekwa onye ahụ ezi nkume ọcha ahụ, nke edekwasịrị aha ọhụrụ nʼelu ya, nke onye ọbụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ natara ya.
有耳朵的,應聽聖神向各教會說的話:勝利的,我要賜給他隱藏的「瑪納」,也要賜給他一塊刻有新名號的白石,除領受的人外,誰也不認得這名號。」
18 “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Tiatira, sị ya: Ndị a bụ okwu sitere nʼaka Ọkpara Chineke, onye anya ya na-enwuba nʼebe niile dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya kwa na-egbu maramara dị ka bronz a nụchara nke ọma.
你給提雅提辣教會的天使寫:「那位眼睛有如火燄,雙腳有如光銅的天主子這樣說:
19 Amaara m ọrụ gị niile, na ịhụnanya gị, na okwukwe gị. Amakwaara m ije ozi gị na ntachiobi gị, na-ahụkwa na ị na-arụ ọrụ ugbu a karịa ka i mere na mbụ.
我知道你的作為、你的愛德、信德、服務和堅忍,也知道你末後的作為比先前的更多。
20 Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyịnye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja.
可是我有反對你的一條,就要你曾容許那自稱為先知的婦人依則貝耳教訓我的僕人,並引誘他們行邪淫,吃祭肉。
21 Enyela m ya ohere ka o si na mmehie ya chegharịa, ma ọ jụrụ ichegharị site na ndụ ịkwa iko.
我原給了她悔改的時間,可是她不肯悔改自己的淫行。
22 Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. Ọ bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha.
看,我要把她投在病床上,並且把那些與她行邪淫的人,若他們對她的惡行不予以悔改,也投到重大的困苦中,
23 Ma nʼebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ niile ga-amata na abụ m onye na-enyocha mmụọ na mkpụrụobi niile. Aga m akwụghachikwa onye ọbụla nʼime unu ụgwọ ọrụ kwesiri ọrụ ya.
並將她的子女置於死地;這樣各教會都知道我是洞察人心和肺腑的主,並且我要按照你們的行為,報應你們每一個人。
24 Ugbu a, ana m agwa unu ndị fọdụrụ na Tiatira, unu ndị na-agbasoghị ozizi ya, ndị na-amụtabekwaghị ihe ndị ahụ ekwensu kpọrọ ihe nzuzo dị omimi, ‘O nweghị ibu arọ ọzọ m ga-ebokwasị unu,
至於你們其餘的提雅提辣人,凡不隨從這種教訓,不認識那所謂「撒殫奧義」的人,我對你們說:我不再把別的重擔加在你們身上,
25 ma ọ bụghị, unu jidesienụ ihe unu nwere aka ike tutu ruo mgbe m ga-abịa.’
可是你們應該堅持已有的,直到我來。
26 Ma onye ọbụla na-emeri emeri, na-anọgidekwa na-eme uche m ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka m ga-enye ikike nʼebe mba niile nọ.
勝利的,並且到最末堅守我事業的人,我必賜給他治理萬民的權柄--
27 Onye ahụ, ‘ga-eji mkpara igwe chịa ha, dịka mgbe a kụwachara ite aja na mpekele na mpekele.’Ọ bụladị ka Nna m si nye m ike,
他將用鐵杖管轄他們,有如打碎瓦器--
28 a ga-enye onye nke meririnụ kpakpando ụtụtụ.
正如我由我父所領受的權柄一樣;我還要賜給他那顆晨星。
29 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.
有耳朵的,應聽聖神向各教會說的話。」

< Mkpughe 2 >