< Mkpughe 19 >

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya! Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị.
Emva kwalezizinto ngasengisizwa ilizwi elikhulu elexuku elikhulu ezulwini, lisithi: Haleluya! Usindiso lobukhosi lodumo lamandla kungokweNkosi uNkulunkulu wethu;
2 Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.”
ngoba izigwebo zakhe ziqotho zilungile; ngoba usilahlile isifebe esikhulu, esonakalise umhlaba ngobufebe baso, usephindisele igazi lenceku zakhe esandleni saso.
3 Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
Basebesithi ngokwesibili: Haleluya! Lentuthu yaso ithunqa kuze kube nini lanini. (aiōn g165)
4 Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Amen, Haleluya!”
Labadala abangamatshumi amabili lane lezidalwa ezine eziphilayo zawela phansi zakhonza uNkulunkulu ohlezi esihlalweni sobukhosi zisithi: Ameni! Haleluya!
5 Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị, “Toonu Chineke anyị, unu ndị ohu ya niile, ndị ukwu na ndị nta, unu ndị na-atụ egwu ya.”
Ilizwi laseliphuma livela esihlalweni sobukhosi, lisithi: Mdumiseni uNkulunkulu wethu, lina lonke zinceku zakhe, labamesabayo, labancinyane, labakhulu.
6 Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị, “Haleluya! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị.
Ngasengisizwa kungathi yilizwi lexuku elikhulu, njalo kungathi ngumdumo wamanzi amanengi, njalo kungathi ngumsindo wemidumo elamandla, kusithi: Haleluya! Ngoba iNkosi uNkulunkulu uSomandla uyabusa.
7 Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọkwaa anyị ụtọ. Ka anyị nye ya otuto. Nʼihi na ọlụlụ di na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruola, nwunye ya edoziekwala onwe ya.
Asithokoze sithabe kakhulu, besesisipha udumo kuye; ngoba umtshado weWundlu usufikile, lomkalo usezilungisele.
8 E nyela ya ezi akwa ọcha nke na-enweghị ntụpọ ọbụla, na nke dị nnọọ ezi ọcha ka o yikwasị onwe ya.” (Ezi akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ezi omume nke ndị nsọ rụrụ.)
Kwasekuphiwa kuye ukuthi embathe ilembu elicolekileyo kakhulu elihlanzekileyo lelikhazimulayo; ngoba ilembu elicolekileyo kakhulu liyikulunga kwabangcwele.
9 Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.”
Yasisithi kimi: Bhala uthi: Babusisiwe labo ababizelwe ekudleni kwantambama komtshado weWundlu. Yasisithi kimi: La ngamazwi aqotho kaNkulunkulu.
10 Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.”
Ngasengiwela phansi enyaweni zayo ukuyikhonza; yasisithi kimi: Qaphela ungakwenzi; ngiyinceku kanye lawe labazalwane bakho abalobufakazi bukaJesu; khonza uNkulunkulu; ngoba ubufakazi bukaJesu bungumoya wesiprofetho.
11 Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha.
Ngasengibona izulu livuliwe, khangela-ke ibhiza elimhlophe, loligadileyo ubizwa ngokuthi oThembekileyo loQotho, njalo ngokulunga uyahlulela alwe.
12 Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu.
Lamehlo akhe afanana lelangabi lomlilo, lekhanda lakhe kulemiqhele eminengi; njalo ulebizo elilotshiweyo, okungelamuntu olaziyo ngaphandle kwakhe,
13 E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke.
wasesembatha isembatho esicwiliswe egazini; lebizo lakhe libizwa ngokuthi, nguLizwi likaNkulunkulu.
14 Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya.
Lamabutho ayesezulwini amlandela egade amabhiza amhlophe, embethe ilembu elicolekileyo kakhulu elimhlophe lelihlanzekileyo.
15 Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. “Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha.” Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
Emlonyeni wakhe kwasekuphuma inkemba ebukhali, ukuze atshaye izizwe ngayo; njalo yena uzazibusa ngentonga yensimbi; yena-ke uzanyathela isikhamelo sevini sewayini lentukuthelo lolaka lukaNkulunkulu uSomandla.
16 Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya: Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile.
Njalo esembathweni lethangazini lakhe ulebizo elibhalwe ukuthi: INKOSI YAMAKHOSI LOMBUSI WABABUSI.
17 Mgbe ahụ, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nʼime anyanwụ na-eti mkpu nʼoke olu, na-akpọku ụmụ nnụnụ niile na-efe nʼetiti mbara eluigwe, “Bịanụ! Zukọọnụ maka oke oriri nke Chineke.
Ngasengibona ingilosi eyodwa imi elangeni; yasimemeza ngelizwi elikhulu, isithi enyonini zonke eziphaphayo phakathi laphakathi kwezulu: Wozani libuthaniswe ekudleni kwantambama kukaNkulunkulu omkhulu,
18 Bịanụ soro rie anụ ahụ ndị eze, na ndị ọchịagha, na ndịisi agha. Sorokwanụ rie anụ ahụ ịnyịnya na anụ ahụ ndị nọkwasịrị nʼelu ha. Riekwanụ anụ ahụ ndị mmadụ, ndị ukwu na ndị nta, ndị ohu na ndị nweere onwe ha.”
ukuze lidle inyama yamakhosi, lenyama yenduna ezinkulu, lenyama yabalamandla, lenyama yamabhiza leyabagadi bawo, lenyama yabo bonke, abakhululekileyo kanye labayizigqili, labancinyane labakhulu.
19 Mgbe ahụ, ahụrụ m anụ ọhịa ọjọọ ahụ ya na ndị eze niile dị nʼụwa, na ndị agha ha, ka ha zukọtara ibu agha megide onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ahụ na ndị agha ya.
Ngasengibona isilo, lamakhosi omhlaba lamabutho awo ebuthanele ukulwa impi laye ogade ibhiza, kanye lebutho lakhe.
20 Ma e jidere anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ onye nke nọọrọ nʼihu ya gosi ihe ịrịbama nke o jiri duhie ndị niile natara akara nke anụ ọhịa ahụ, ya na ndị kpọọrọ ihe oyiyi ya isiala. A tụnyere anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ya na ndụ nʼime ọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. (Limnē Pyr g3041 g4442)
Isilo sasesibanjwa, njalo kanye laso umprofethi wamanga owenza izibonakaliso phambi kwaso, aduhisa ngazo labo ababelophawu lwesilo, lalabo abakhonza umfanekiso waso; labo bobabili baphoselwa bephila echibini lomlilo elivutha isibabule; (Limnē Pyr g3041 g4442)
21 Ndị agha ha fọdụrụnụ ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nʼọnụ onye ahụ nọ nʼelu ịnyịnya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe rikwara ozu ha.
labaseleyo babulawa ngenkemba yogade ibhiza, ephuma emlonyeni wakhe; lenyoni zonke zasutha inyama yabo.

< Mkpughe 19 >