< Mkpughe 19 >
1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya! Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị.
After these things I heard as it were a great voice of a vast multitude in the heaven, saying, Hallelujah! Salvation, and glary, and power, belong to our God:
2 Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.”
because his judgments are true and righteous; because he has judged the great harlot, who corrupted the earth by her fornication, and he has avenged the blood of his servants from her hand.
3 Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn )
And a second time they said, Hallelujah! and her smoke is going up unto the ages of the ages. (aiōn )
4 Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Amen, Haleluya!”
And the twenty-four elders and the four living creatures fell down and worshiped God who sitteth upon the throne, saying Amen; Hallelujah!
5 Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị, “Toonu Chineke anyị, unu ndị ohu ya niile, ndị ukwu na ndị nta, unu ndị na-atụ egwu ya.”
And a voice came out from the throne, saying, Praise our God, all ye his servants, ye who fear him, small and great.
6 Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị, “Haleluya! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị.
And I heard as it were the voice of a great multitude, and as the sound of many waters, and as the sound of mighty thunders, saying, Hallelujah! because the Lord our God Omnipotent reigned.
7 Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọkwaa anyị ụtọ. Ka anyị nye ya otuto. Nʼihi na ọlụlụ di na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruola, nwunye ya edoziekwala onwe ya.
Let us rejoice and be glad, and give glory to him! because the marriage of the Lamb has come, and his wife has made herself ready.
8 E nyela ya ezi akwa ọcha nke na-enweghị ntụpọ ọbụla, na nke dị nnọọ ezi ọcha ka o yikwasị onwe ya.” (Ezi akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ezi omume nke ndị nsọ rụrụ.)
And it was given unto her that she should be clothed in linen, bright and clean. For the linen is the righteous acts of the saints.
9 Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.”
And he says to me, Write, Blessed are they who have been called to the marriage supper of the Lamb. And He says to me, These are the true words of God.
10 Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.”
And I fell down before his feet to worship him. And he says to me; See that you do it not: I am your fellow-servant, and one of your brethren who have the testimony of Jesus; worship God. For the testimony of Jesus is the spirit of prophecy.
11 Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha.
And I saw the heaven open, and behold a white horse; and one sitting on him called, Faithful and True, in righteousness he both judges and wages war.
12 Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu.
And his eyes are a flame of fire, and upon his head are many diadems; having a name written, which no one knows, but himself,
13 E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke.
and being clothed with a garment sprinkled with blood: and his name has been called, The Word of God.
14 Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya.
Armies in the heaven follow him on white horses, clothed in linen, white and clean.
15 Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. “Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha.” Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
And out of his mouth goes forth a sharp sword, that with it he may smite the nations; and he will shepherdize them with an iron rod: and he treads the winepress of the wrath of the indignation of God Almighty.
16 Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya: Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile.
And he has on his vesture and on his thigh a name written, King of kings, and Lord of lords.
17 Mgbe ahụ, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nʼime anyanwụ na-eti mkpu nʼoke olu, na-akpọku ụmụ nnụnụ niile na-efe nʼetiti mbara eluigwe, “Bịanụ! Zukọọnụ maka oke oriri nke Chineke.
And I saw one angel standing on the sun; and he cried with a great voice, saying to all the birds which fly in the midst of heaven, Come, gather yourselves to the great banquet of God;
18 Bịanụ soro rie anụ ahụ ndị eze, na ndị ọchịagha, na ndịisi agha. Sorokwanụ rie anụ ahụ ịnyịnya na anụ ahụ ndị nọkwasịrị nʼelu ha. Riekwanụ anụ ahụ ndị mmadụ, ndị ukwu na ndị nta, ndị ohu na ndị nweere onwe ha.”
in order that you may eat the flesh of kings, and the flesh of chiliarchs, and the flesh of mighty men, and the flesh of horses and of those sitting on them, and the flesh of all free men and slaves also, both small and great.
19 Mgbe ahụ, ahụrụ m anụ ọhịa ọjọọ ahụ ya na ndị eze niile dị nʼụwa, na ndị agha ha, ka ha zukọtara ibu agha megide onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ahụ na ndị agha ya.
And I saw the beast, and the kings of the earth, and their armies, assembled to make war with the one sitting on the horse, and with his army.
20 Ma e jidere anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ onye nke nọọrọ nʼihu ya gosi ihe ịrịbama nke o jiri duhie ndị niile natara akara nke anụ ọhịa ahụ, ya na ndị kpọọrọ ihe oyiyi ya isiala. A tụnyere anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ya na ndụ nʼime ọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. (Limnē Pyr )
And the beast, and the false prophet along with him, who wrought miracles in his presence, by which he deceived those having received the mark of the beast, and those worshiping his image; and the two were cast alive into the lake of fire which burns with brimstone. (Limnē Pyr )
21 Ndị agha ha fọdụrụnụ ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nʼọnụ onye ahụ nọ nʼelu ịnyịnya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe rikwara ozu ha.
And the rest were slain with the sword proceeding out from the mouth of him, the one sitting on the horse: and all the birds were filled with their flesh.