< Mkpughe 18 >

1 Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa.
Baada ya vitu hivi nilimwona malaika mwingine akishuka chini kutoka mbinguni. Yeye alikuwa na mamlaka kuu, na nchi iliangazwa kwa utukufu wake.
2 O ji olu dị ike tie mkpu, “‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’ Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha, nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ.
Alilia kwa sauti kuu, akisema, “Umeanguka, umeanguka, ule mji mkuu Babeli! Umekuwa sehemu yakaapo mapepo, na sehemu ikaapo kila roho chafu, na sehemu akaapo kila mchafu na ndege achukizaye.
3 Nʼihi na mba niile aṅụọla site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya. Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko, ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.”
Kwa kuwa mataifa yote yamekunywa mvinyo ya tamaa ya uasherati wake ambayo humletea ghadhabu. Wafalme wa nchi wamezini naye. Wafanyabiashara wa nchi wamekuwa matajiri kwa nguvu ya maisha yake ya anasa.”
4 Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.
Kisha nilisikia sauti nyingine kutoka mbinguni iikisema, “Tokeni kwake watu wangu, ili msije mkashiriki katika dhambi zake, na ili msije mkapokea mapigo yake yoyote.
5 Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke echetakwala ajọ omume ya niile.
Dhambi zake zimerundikana juu kama mbingu, na Mungu ameyakumbuka matendo yake maovu.
6 Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu. Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere. Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ.
Mlipeni kama alivyowalipa wengine, na mkamlipe mara mbili kwa jinsi alivyotenda; katika kikombe alichokichanganya, mchanganyishieni mara mbili kwa ajili yake.
7 Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya. Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ, iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’
Kama alivyojitukuza yeye mwenyewe, na aliishi kwa anasa, mpeni mateso mengi na huzuni. Kwa kuwa husema moyoni mwake, 'Nimekaa kama malkia; wala siyo mjane, na wala sitaona maombolezo.'
8 Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị, ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike.
Kwa hiyo ndani ya siku moja mapigo yake yatamlemea: kifo, maombolezo, na njaa. Atateketezwa kwa moto, kwa kuwa Bwana Mungu ni mwenye nguvu, na ni mhukumu wake.”
9 “Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya.
Wafalme wa nchi waliozini na kuchanganyikiwa pamoja naye watalia na kumwombolezea watakapouona moshi wa kuungua kwake.
10 Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị, “‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara. Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’
Watasimama mbali naye, kwa hofu ya maumivu yake wakisema, “Ole, ole kwa mji mkuu, Babeli, mji wenye nguvu! Kwa saa moja hukumu yako imekuja.”
11 “Ndị ahịa nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa ụjụ nʼihi ya, nʼihi na ọ dịkwaghị onye na-azụ ihe ahịa ha ọzọ.
Wafanyabiashara wa nchi lieni na kuomboleza kwa ajili yake, kwa kuwa hakuna hata mmoja anunuaye bidhaa zake tena -
12 Ngwa ahịa ọlaedo gị, na ọlaọcha, na ọla e ji achọ mma na nkume oke ọnụahịa, ezi akwa ọcha, na akwa uhie uhie, na akwa lọrịlọrị, na akwa odo odo, osisi niile na-esi isi ọma, ihe niile e ji ọdụ enyi mee, ngwa ahịa niile e ji osisi niile dị oke ọnụahịa mee, bronz, igwe na nkume mabụl.
bidhaa za dhahabu, fedha, mawe ya thamani, lulu, kitani nzuri, zambarau, hariri, nyekundu, aina zote za miti ya harufu nzuri, kila chombo cha pembe za ndovu, kila chombo kilichotengenezwa kwa miti ya thamani, shaba, chuma, jiwe,
13 Ha na ụda sinamọn na mmanụ otite nke ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, máá na frankisens, mmanya na mmanụ oliv, ụtụ ọka na wiiti, ehi na atụrụ, ịnyịnya na ụgbọala agha, na ndị na-ere mmadụ ibe ha dịka ohu, na ahụ mmadụ na mkpụrụobi mmadụ.
mdalasini, viungo, uvumba, manemane, ubani, mvinyo, mafuta, unga mzuri, ngano, ng'ombe na kondoo, farasi na magari, na watumwa, na roho za watu.
14 “Ha ga-asị, ‘Mkpụrụ ndị ahụ niile nke na-agụ mkpụrụobi agụ e sitela nʼebe ị nọ gabiga. Ihe ọma niile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụahịa niile i ji azụ afọ gị, efunarịla gị. Apụghị ịchọtakwa ha ọzọ mgbe ọbụla.’
Matunda uliyoyatamani kwa nguvu zako yameondoka kutoka kwako. Anasa zako zote na mapambo yametoweka, hayatapatikana tena.
15 Ndị ahịa ahụ bara ọgaranya site nʼaka ya, ga-anọ nʼebe dị anya, nʼihi oke egwu nke ntaramahụhụ ya, na-eru ụjụ, na-ebesikwa akwa ike.
Wafanyabiashara wa vitu hivi waliopata utajiri kwa mapenzi yake watasimama mbali kutoka kwake kwa sababu ya hofu ya maumivu yake, wakilia na sauti ya maombolezo.
16 “‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ, nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbara nke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche.
Wakisema, “Ole, ole mji ule mkuu uliovikwa kitani nzuri, zambarau, na nyekundu, na kupambwa kwa dhahabu, na vito vya thamani na lulu!”
17 Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’ “Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya,
Ndani ya saa moja utajiri wote huo ulitoweka. Kila nahodha wa meli, kila baharia, na wote wanamaji, na wote wafanyao kazi baharini, walisimama mbali.
18 na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’
Walilia walipouona moshi wa kuungua kwake. Walisema, “Ni mji gani unafanana na mji huu mkubwa?”
19 Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya. Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’
Walitupa mavumbi juu ya vichwa vyao, na walilia, wakitokwa machozi na kuomboleza, “Ole, ole mji mkubwa mahali wote waliokuwa na meli zao baharini walikuwa matajiri kutokana na mali zake. Ndani ya saa moja umeangamizwa.”
20 “Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya, unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ, unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ. Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe nʼihi mmeso ya megide unu.”
“Furahini juu yake, mbingu, ninyi waumini, mitume, na manabii, kwa maana Mungu ameleta hukumu yenu juu yake!”
21 Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị, “Otu a ka a ga-esi tufuo Babilọn obodo ukwu ahụ, agaghị ahụkwa ya ọzọ.
Malaika mwenye nguvu aliinua jiwe kama jiwe kuu la kusagia na alilitupa baharini, akisema, “Kwa njia hii, Babeli, ule mji mkuu, utatupwa chini kwa ukatili na hautaonekana tena.
22 Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ. Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ. Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla nʼime gị ọzọ. Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri nʼime gị ọzọ.
Sauti ya vinanda, wanamuziki, wacheza filimbi, na tarumbeta hawatasikika tena kwenu. Wala fundi wa aina yoyote hataonekana kwenu. Wala sauti ya kinu haitasikika tena kwenu.
23 Ìhè nke sitere nʼoriọna agaghị acha nʼime gị ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa. Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa, ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa.
Mwanga wa taa hautaangaza ndani yako. Sauti ya bwana harusi na bibi harusi hazitasikiwa tena ndani yako, maana wafanyabiashara wako walikuwa wakuu wa nchi, na wa mataifa, wamedanganywa kwa uchawi wako.
24 Nʼime ya ka a hụrụ ọbara ndị amụma niile, na nke ndị nsọ niile, na nke ndị ọzọ ahụ niile e gburu nʼụwa.”
Ndani yake damu ya manabii na waamini ilionekana, na damu ya wote waliouawa juu ya nchi.”

< Mkpughe 18 >