< Mkpughe 18 >

1 Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa.
Derefter saa jeg en anden Engel stige ned fra Himmelen; han havde stor Magt, og Jorden blev oplyst af hans Herlighed.
2 O ji olu dị ike tie mkpu, “‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’ Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha, nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ.
Og han raabte med stærk Røst og sagde: Falden, falden er Babylon den store, og den er bleven Dæmoners Bolig og et Fængsel for alle Haande urene Aander og et Fængsel for alle Haande urene og afskyede Fugle!
3 Nʼihi na mba niile aṅụọla site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya. Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko, ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.”
Thi af hendes Utugts Harmes Vin have alle Folkeslagene drukket, og Jordens Konger have bolet med hende, og Jordens Købmænd ere blevne rige af hendes Yppigheds Fylde.
4 Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.
Og jeg hørte en anden Røst fra Himmelen, som sagde: Gaar ud fra hende, mit Folk! for at I ikke skulle blive meddelagtige i hendes Synder og ikke rammes af hendes Plager.
5 Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke echetakwala ajọ omume ya niile.
Thi hendes Synder ere opdyngede indtil Himmelen, og Gud har kommet hendes Uretfærdigheder i Hu.
6 Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu. Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere. Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ.
Betaler hende, som hun har betalt eder, og gengælder hende dobbelt efter hendes Gerninger; skænker hende dobbelt i det Bæger, som hun har iskænket.
7 Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya. Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ, iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’
Saa meget, som hun har forherliget sig selv og levet i Yppighed, saa meget skulle I give hende af Pine og Sorg! Fordi hun siger i sit Hjerte: Jeg sidder som en Dronning og er ikke Enke, og Sorg skal jeg ingenlunde se,
8 Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị, ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike.
derfor skulle hendes Plager komme paa een Dag: Død og Sorg og Hunger, og hun skal opbrændes med Ild; thi stærk er den Herre Gud, som har dømt hende.
9 “Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya.
Og Jordens Konger, som have bolet og levet yppigt med hende, skulle græde og hyle over hende, naar de se Røgen af hendes Brand,
10 Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị, “‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara. Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’
medens de staa langt borte af Frygt for hendes Pinsel og sige: Ve! ve! du store Stad, Babylon, du stærke Stad, thi paa een Time er din Dom kommen.
11 “Ndị ahịa nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa ụjụ nʼihi ya, nʼihi na ọ dịkwaghị onye na-azụ ihe ahịa ha ọzọ.
Og Jordens Købmænd græde og sørge over hende, fordi ingen mere køber deres Ladning:
12 Ngwa ahịa ọlaedo gị, na ọlaọcha, na ọla e ji achọ mma na nkume oke ọnụahịa, ezi akwa ọcha, na akwa uhie uhie, na akwa lọrịlọrị, na akwa odo odo, osisi niile na-esi isi ọma, ihe niile e ji ọdụ enyi mee, ngwa ahịa niile e ji osisi niile dị oke ọnụahịa mee, bronz, igwe na nkume mabụl.
Ladning af Guld og Sølv og Ædelstene og Perler og fint Linned og Purpur og Silke og Skarlagen og alle Haande vellugtende Træ og alle Haande Arbejde af Elfenben og alle Haande Arbejde af kostbart Træ og af Kobber og Jern og Marmor,
13 Ha na ụda sinamọn na mmanụ otite nke ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, máá na frankisens, mmanya na mmanụ oliv, ụtụ ọka na wiiti, ehi na atụrụ, ịnyịnya na ụgbọala agha, na ndị na-ere mmadụ ibe ha dịka ohu, na ahụ mmadụ na mkpụrụobi mmadụ.
og Kanelbark og Haarsalve og Røgelser og Salve og Virak og Vin og Olie og fint Mel og Hvede og Okser og Faar og Heste og Vogne og Slaver, ja, Menneskesjæle.
14 “Ha ga-asị, ‘Mkpụrụ ndị ahụ niile nke na-agụ mkpụrụobi agụ e sitela nʼebe ị nọ gabiga. Ihe ọma niile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụahịa niile i ji azụ afọ gị, efunarịla gị. Apụghị ịchọtakwa ha ọzọ mgbe ọbụla.’
Og den Frugt, din Sjæl lystedes ved, er vegen fra dig, og alt det lækre og glimrende er forbi for dig, og man skal aldrig finde det mere.
15 Ndị ahịa ahụ bara ọgaranya site nʼaka ya, ga-anọ nʼebe dị anya, nʼihi oke egwu nke ntaramahụhụ ya, na-eru ụjụ, na-ebesikwa akwa ike.
De, som handlede dermed og ere blevne rige ved hende, skulle staa langt borte af Frygt for hendes Pinsel grædende og sørgende og sige:
16 “‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ, nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbara nke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche.
Ve! ve! den store Stad, som var klædt i fint Linned og Purpur og Skarlagen og straalede af Guld og Ædelstene og Perler; thi i een Time er saa stor en Rigdom lagt øde.
17 Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’ “Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya,
Og alle Styrmænd og alle Skippere og Søfolk og alle, som arbejde paa Havet, stode langt borte
18 na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’
og raabte, da de saa Røgen af hendes Brand, og sagde: Hvor var der Mage til den store Stad?
19 Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya. Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’
Og de kastede Støv paa deres Hoveder og raabte grædende og sørgende og sagde: Ve! ve! den store Stad, hvori alle, som havde Skibe paa Havet, berigedes ved dens Pragt; thi i een Time er den bleven lagt øde.
20 “Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya, unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ, unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ. Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe nʼihi mmeso ya megide unu.”
Fryd dig over den, du Himmel, og I hellige og Apostle og Profeter! fordi Gud har skaffet eder Ret over den.
21 Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị, “Otu a ka a ga-esi tufuo Babilọn obodo ukwu ahụ, agaghị ahụkwa ya ọzọ.
Og en vældig Engel løftede en Sten som en stor Møllesten og kastede den i Havet og sagde: Saaledes skal Babylon, den store Stad, nedstyrtes i Hast og ikke findes mere.
22 Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ. Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ. Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla nʼime gị ọzọ. Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri nʼime gị ọzọ.
Og Lyd af Harpespillere og Sangere og Fløjtespillere og Basunblæsere skal ikke høres i dig mere; og ingen Kunstner i nogen Kunst skal findes i dig mere; og Lyd af Mølle skal ikke høres i dig mere;
23 Ìhè nke sitere nʼoriọna agaghị acha nʼime gị ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa. Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa, ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa.
og Lys af Lampe skal ikke skinne i dig mere, og Brudgoms og Bruds Røst skal ikke høres i dig mere, fordi dine Købmænd vare Jordens Stormænd, fordi alle Folkeslagene bleve forførte ved dit Trylleri.
24 Nʼime ya ka a hụrụ ọbara ndị amụma niile, na nke ndị nsọ niile, na nke ndị ọzọ ahụ niile e gburu nʼụwa.”
Og i den blev Profeters og helliges Blod fundet og alle deres, som ere myrdede paa Jorden.

< Mkpughe 18 >