< Mkpughe 17 >

1 Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa.
Then one of the seven angels who held the seven bowls came and spoke to me. ‘Come here,’ he said, ‘and I will show you the sentence passed on that Great Harlot who is seated at the meeting of many waters,
2 Ndị eze ụwa esorola ya kwaa iko nʼotu ihe ndina, emeekwara ka ndị niile bi nʼụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.”
and with whom all the kings of the earth have had licentious intercourse; while all who live on the earth have been make drunk by the wine of her licentiousness.’
3 O duuru m nʼime mmụọ baa nʼọzara. Nʼebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nʼelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Aha ndị e dere anụ ọhịa ahụ nʼahụ bụ naanị okwu ikwulu Chineke.
And he bore me away in a trance to a lonely place, and I saw a woman seated on a scarlet Beast, which was covered with blasphemous names; it had seven heads and ten horns.
4 Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara, gbarakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa na pieal kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nʼaka ya nke jupụtara nʼihe arụ na ihe ure niile o ji na-akwa iko ya.
The woman was clothed in purple and scarlet, and glittering with gold ornaments, precious stones, and pearls. In her hand she held a gold cup, full of idolatrous abominations, and the unclean fruits of her licentiousness;
5 Aha e dekwasịrị ya nʼegedege ihu bụ ihe omimi: Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn, nne ndị na-akwa iko na nke ihe arụ niile nke ụwa.
while on her forehead there was written this mystic name – ‘BABYLON THE GREAT, THE MOTHER OF HARLOTS AND OF ALL IDOLATROUS ABOMINATIONS ON EARTH.’
6 Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị ama Jisọs. Mgbe m hụrụ ya, ọ gbagwojuru m anya.
And I saw the woman drunk with the blood of Christ’s people and with the blood of the martyrs for Jesus. When I saw her, I was amazed beyond measure;
7 Ma mmụọ ozi ahụ sịrị m, “Gịnị mere ihe ị hụrụ ji ju gị anya? Aga m akọwara gị ihe omimi banyere nwanyị a na anụ ọhịa ahụ nke na-ebugharị ya, bụ nke nwere isi asaa na mpi iri.
but the angel said to me – ‘Why were you amazed? I will tell you the mystic meaning of the vision of this woman, and of the Beast, with the seven heads and ten horns, that carries her.
8 Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ, nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị. Ma ọ ga-esi nʼolulu Abis ahụ pụta banye na mbibi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nʼime akwụkwọ ndụ ahụ site nʼoge e kere ụwa anya. Nʼihi na e nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị, ma ọ ga-emesi bịa. (Abyssos g12)
The Beast that you saw was, but is not, and is about to rise out of the bottomless pit, and is on its way to destruction. Those who are living on earth will be amazed – those whose names have not been written in the book of life from the foundation of the world – when they see that the Beast was, but is not, and yet will come.’ (Abyssos g12)
9 “Nke a chọrọ uche nke nwere amamihe. Isi asaa ahụ nọchiri anya ugwu asaa ahụ nke nwanyị ahụ na-anọdụ nʼelu ha. Ha na-anọchikwa anya ndị eze asaa.
(Here there is need for the discerning mind.) The seven heads are seven mountains on which the woman is seated.
10 Ise nʼime ha adaala, otu ka nọ, nke ọzọ abịabeghị. Mgbe ọ bịara, ọ ga-anọ nwantakịrị oge.
They are also seven kings; of whom five have fallen and one remains, while one is not yet come. When he comes, he must stay for a little while.
11 Anụ ọhịa ahụ nke dịrịị ma ọ dịkwaghị, bụ onye nke asatọ, ọ bụ onye otu ndị eze asaa ahụ ma a lakwara ya nʼiyi.
So must the Beast that was, but is not. He counts as an eighth king, although he is one of the seven, and is on his way to destruction.
12 “Mpi iri ahụ ị hụrụ nọchiri anya ndị eze iri na-anatabeghị alaeze. Ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ike ọchịchị dịka eze sọọsọ otu awa.
The ten horns that you saw are ten kings, who have not yet received their kingdoms, but for an hour they receive the authority of kings, together with the Beast.
13 Ha ji otu obi na-enye anụ ọhịa ahụ ike ha na ịchị isi ha.
These kings are of one mind in surrendering their power and authority to the Beast.
14 Ha ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha nʼihi na ọ bụ Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile nakwa Eze kachasị ndị eze niile. Ndị so ya bụkwa ndị a kpọrọ, na ndị a họpụtara, ndị ya kwesikwara ntụkwasị obi.”
They will fight with the Lamb, but the Lamb will conquer them, for he is Lord of lords and King of kings; so, too, will those with him who have received the call and are chosen and faithful.
15 Mgbe ahụ ọ sịrị m, “Mmiri ndị ahụ ị hụrụ, ebe nwanyị akwụna ahụ nọ, bụ ndị mmadụ dị iche iche, igwe mmadụ, na mba dị iche iche na nʼasụsụ dị iche iche.
And the angel said to me – ‘The waters that you saw, where the Harlot is seated, are throngs of people and men of all nations and languages.
16 Anụ ọhịa ahụ na mpi iri ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwanyị akwụna ahụ asị. Ha ga-agba ya ọtọ, laakwa ya nʼiyi, ha ga-eri anụ ya, werekwa ọkụ rechapụ ya.
The ten horns that you saw, and the Beast – they will hate the Harlot, and cause her to become deserted and strip her bare; they will eat her flesh and utterly consume her with fire.
17 Chineke etinyela ya nʼobi ha imejupụta nzube ya site nʼinwe otu obi nakwa inyefe anụ ọhịa ahụ ikike ọchịchị alaeze ha, tutu ruo mgbe a ga-emezu okwu Chineke.
For God has put it into their minds to carry out his purpose, in carrying out their common purpose and surrendering their kingdoms to the Beast, until God’s decrees will be executed.
18 Ma nwanyị a ị hụrụ bụ obodo ukwu ahụ na-achị ndị eze niile nke ụwa.”
As for the woman whom you saw, she is the great city that holds sway over all the kings of the earth.’

< Mkpughe 17 >