< Mkpughe 14 >

1 Elere m anya hụ Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo nʼugwu Zayọn. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya nʼegedege ihu ha.
Zvino ndakaona, uye tarira, Gwayana ramira pagomo Ziyoni, uye rine zvuru zana nemakumi mana nevana, vane zita raBaba varo rakanyorwa pahuma dzavo.
2 Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ.
Zvino ndakanzwa inzwi richibva kudenga, senzwi remvura zhinji, uye senzwi remutinhiro mukuru; ndikanzwawo inzwi revaridzi veudimbwa vachiridza udimbwa hwavo.
3 Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta.
Zvino vakaimba serwiyo rutsva pamberi pechigaro cheushe, nepamberi pezvisikwa zvipenyu zvina, nevakuru; uye hakuna wakagona kudzidza rwiyo, kunze kwezvuru zana nemakumi mana nevana, vakatengwa munyika.
4 Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ.
Ava ndivo vasina kusvibiswa nevakadzi; nokuti imhandara. Ava ndivo vanotevera Gwayana kupi zvako kwarinoenda. Ava vakatengwa kubva pavanhu, zvibereko zvekutanga kuna Mwari nekuGwayana.
5 Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a hụrụ nʼọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta.
Uye mumuromo wavo hamuna kuwanikwa kunyengera, nokuti havana chavanopomerwa pamberi pechigaro cheushe chaMwari.
6 Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa. (aiōnios g166)
Zvino ndakaona umwe mutumwa achibhururuka pakati pedenga, ane evhangeri yekusingaperi, kuparidzira vanogara panyika, nekurudzi rwese, nedzinza, nerurimi, nevanhu. (aiōnios g166)
7 O jiri oke olu kwuo sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile.”
Achiti nenzwi guru: Ityai Mwari, uye mupe rumbidzo kwaari, nokuti nguva yemutongo wake yasvika; uye namatai iye wakaita denga nenyika negungwa nezvitubu zvemvura.
8 Mgbe ahụ mmụọ ozi nke abụọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “‘Ọ daala! Ọ daala, bụ Babilọn obodo ukwu ahụ,’ bụ nke mere ka mba niile ṅụọ mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.”
Zvino umwe mutumwa wakatevera achiti: Rawa, rawa, Bhabhironi, guta guru, nokuti rakapa marudzi ese kunwa zvewaini yekutsamwa kweupombwe hwaro.
9 Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọbụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ si nʼime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nʼegedege ihu maọbụ nʼaka ya,
Zvino mutumwa wechitatu wakavatevera, achiti nenzwi guru: Kana pane umwe anonamata chikara nemufananidzo wacho, nekugamuchira mucherechedzo pahuma yake, kana paruoko rwake,
10 ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ.
ndiyewo achanwa zvewaini yekutsamwa kwaMwari, yakadururwa mumukombe wekutsamwa kwake, isina kuvhenganiswa; uye acharwadziswa mumoto uye sarufa pamberi pevatumwa vatsvene, nepamberi peGwayana.
11 Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya. (aiōn g165)
Zvino utsi hwekurwadziwa kwavo hunokwira kusvikira rinhi narinhi; uye havana zororo masikati neusiku ivo vanonamata chikara nemufananidzo wacho, uye kana pane anogamuchira mucherechedzo wezita racho. (aiōn g165)
12 Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs.”
Hekuno kutsungirira kwevatsvene, hevano vanochengeta mirairo yaMwari nerutendo rwaJesu.
13 Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.” “E, ha ga-ezu ike site na ndọgbu niile nke ha dọgburu onwe ha, nʼihi na ọrụ ha rụrụ ga-eso ha,” ka Mmụọ Nsọ na-ekwu.
Zvino ndakanzwa inzwi richibva kudenga richiti kwandiri: Nyora, uti: Vakaropafadzwa vakafa vanofira muna Ishe kubva ikozvino. Hongu, anoreva Mweya, kuti vazorore pakushingaira kwavo; nemabasa avo anotevera pamwe navo.
14 Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya.
Zvino ndakaona, uye tarira, gore jena, nepamusoro pegore pakagara wakaita seMwanakomana wemunhu, ane korona yegoridhe pamusoro wake, neparuoko rwake jeko rinopinza.
15 Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi sitere nʼụlọnsọ ukwu pụta, tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha sị, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nʼihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nʼụwa achaala nke ọma.”
Zvino umwe mutumwa wakabuda mutembere, achidanidzira nenzwi guru kuna iye wakange agere pamusoro pegore, achiti: Pinza jeko rako ugokohwa; nokuti nguva yekukohwa yakusvikira, nokuti kukohwa kwenyika kwaibva.
16 Ya mere, onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼime ụwa, ghọta ihe dị nʼụwa dịka ihe ubi.
Zvino wakange agere pamusoro pegore akakandira jeko rake panyika, nyika ndokukohwewa.
17 Mmụọ ozi ọzọ sitekwara nʼụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ.
Zvino umwe mutumwa wakabuda mutembere iri kudenga, iyewo ane jeko rinopinza.
18 Mmụọ ozi ọzọ, nke na-elekọta ọkụ sitekwara nʼebe ịchụ aja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọ ozi ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ bipụ osisi ụyọkọ mkpụrụ grepu site na vaịnị niile dị nʼụwa, nʼihi na ha niile achaala.”
Neumwe mutumwa akabuda muaritari, ane simba pamusoro pemoto, akadanidzira nekudana kukuru kuna iye wakange ane jeko rinopinza, achiti: Tuma jeko rako rinopinza, ugounganidza masumbu emuzambiringa wenyika, nokuti mazambiringa awo aibva.
19 Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, bipụsịa ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ahụ chịkọta ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha.
Zvino mutumwa wakakandira jeko rake panyika, ndokuunganidza mazambiringa enyika, akakandira muchisviniro chewaini chikuru chekutsamwa kwaMwari.
20 A zọchakwara mkpụrụ vaịnị ahụ nʼebe a na-azọcha mkpụrụ vaịnị nke dị nʼazụ obodo. Ọbara si nʼebe ahụ gbapụta dị elu ruo ihe dịka eriri e ji ekegide ịnyịnya nʼisi ime ka ọ gaa ebe achọrọ, ọ bụ ihe ruru narị kilomita atọ nʼogologo.
Uye chisviniro chewaini chakatsikwa-tsikwa kunze kweguta, ropa rikabuda muchisviniro chewaini kusvikira pamatomu amabhiza, kubva kumastadhia churu mazana matanhatu.

< Mkpughe 14 >