< Mkpughe 13 >
1 Agwọ ochie ahụ guzoro nʼakụkụ nʼọnụ oke osimiri ahụ. Ma ahụrụ m otu anụ ọhịa ka o si nʼime oke osimiri na-arịpụta. Anụ ọhịa a nwere isi asaa na mpi iri. Okpueze iri dịkwa nʼelu mpi ndị a. Aha e dekwasịrị nʼisi asaa ahụ nʼotu nʼotu bụ ikwutọ na ikwuhie Chineke.
Then I saw rising up out of the sea a beast who had ten horns and seven heads. On his horns he had ten diadems, and on his heads blasphemous titles.
2 Anụ ọhịa a m hụrụ dị ka agụ, ma ụkwụ ya dịka ụkwụ anụ ọhịa bịa. Ọnụ ya dịkwa ka nke ọdụm. Agwọ ochie ahụ nyere ya ike ya, na ocheeze ya na ikike dị ukwuu.
The beast I saw was like a leopard, and his feet were bear’s feet, and his mouth a lion’s mouth. The dragon gave him his power and his throne and great authority.
3 Otu nʼime isi ya nwere ọnya buru ibu, nke pụrụ iwetara ya ọnwụ, e mere ka ọnya ahụ laa. Ụwa niile sobere anụ ọhịa ahụ nʼazụ nʼịtụnanya.
And I saw that one of his heads seemed to have been mortally wounded, but its deadly wound had been healed. The whole earth was following the beast, wondering.
4 Ha kpọrọ isiala nye agwọ ochie ahụ nʼihi na o nyere anụ ọhịa ahụ ikike dị otu a. Ha bidokwara ịkpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ, na-asị, “Ebee ka onye ahụ nọ, nke dị ukwuu karịa ya, onye pụkwara ibu agha megide ya?”
Men worshiped the dragon because he gave his authority to the beast; and they worshiped the beast, saying. "Who is like the beast? Who can fight with him?"
5 E nyekwara anụ ọhịa ahụ ọnụ na ike ikwu okwu mpako na ikike ikwulu ekwulu ọnwa iri anọ na abụọ.
And he was permitted to utter loud boasts and blasphemies; and there was given to him authority to continue forty-two months.
6 O meghere ọnụ ya malite ikwulu Chineke, na aha ya na ebe obibi ya, na ndụ ahụ bụ ndị bi nʼeluigwe.
So he opened his mouth in blasphemy against God, to blaspheme his name and his tabernacle (those who live in his tabernacle in heaven).
7 E nyere ya ike ibuso ndị nsọ agha na imeri ha. E nyekwara ya ikike ịchị agbụrụ niile, na ebo niile, na ndị niile, na mba niile na asụsụ niile.
The beast was allowed to wage war upon the saints, and to conquer them; and there was given him authority over every tribe and people and tongue and nation;
8 Ndị niile bi nʼelu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ onye ọbụla a na-edeghị aha ya nʼime akwụkwọ nke ndụ nke Nwa atụrụ ahụ e gbururị, site nʼoge e kere ụwa.
and each one whose name has not been written in the Lamb’s book of life, the Lamb who has been slain from the foundation of the world. All who dwell on the earth shall worship him.
9 Onye nwere ntị ya nụrụ.
Let him who has ears to hear, listen.
10 “Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla a ga-adọta nʼagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nʼagha. Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla ga-anwụ site na mma agha, aghaghị iji mma agha gbuo ha.” Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume na iguzosikwa ike nʼokwukwe nke ndị Chineke.
Whoever is destined to go into captivity, goes into captivity. Whoever shall kill with the sword, shall surely be killed by the sword. (Here is the endurance and faith of the saints.)
11 Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhịa ọzọ dị iche ka o si nʼala na-arịpụta. O nwere mpi nta abụọ dịka mpi Nwa atụrụ, kama ọ na-ekwu okwu dịka agwọ ochie ahụ.
And I saw another beast ascending from the land; and he had two horns like a lamb, but he spoke like a dragon;
12 Ọ na-achị isi nʼọnọdụ anụ ọhịa nke mbụ. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagide ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka ha kpọọ isiala nye anụ ọhịa mbụ ahụ nke a gwọrọ ọnya ya na-eweta ọnwụ.
and he exerts the full authority of the first beast before him, and he makes the earth and its inhabitants worship the first beast whose death-stroke was healed.
13 Ọ na-emekwa ọtụtụ oke ihe ịrịbama dị iche iche. O mere ọbụladị ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nʼụwa nʼihu mmadụ niile.
And he performs great miracles, so that he even causes fire to come down to the earth from the sky, before men’s eyes.
14 O duhiekwara ndị mmadụ bi nʼụwa site nʼọrụ ịrịbama ya niile nke e nyere ya ike ịrụ nʼọnọdụ anụ ọhịa ahụ. Ọ gwakwara ndị niile bi nʼụwa ka ha kpụọ ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ nke e jiri mma agha merụchaa ahụ, ma mechaa dị ndụ.
And he deceives those who dwell on the earth, because of the miracles, which he is permitted to perform in the sight of the beast. He tells those who live on the earth to make an image to the beast who had the sword-stroke, yet lived.
15 E nyere ya ike ikunye ume ndụ nʼime oyiyi nke anụ ọhịa mbụ ahụ, ime ka ihe a kpụrụ akpụ kwuo okwu mekwa ka e gbuo ndị niile na-akpọghị isiala nye ya.
And he was permitted to give breath to the image of the beast, so that the image of the beast should speak; and so that any one who would not worship the image of the beast should be put to death.
16 O nyere iwu ka onye ọbụla, onye ukwu na onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya, nata akara nʼaka nri maọbụ nʼegedege ihu ha.
And he makes all men, low and high, rich and poor, freemen and slaves, to have a brand put upon their right hands or upon their brows,
17 Ya mere, ọ dịghị onye ọbụla nwere ike ịzụ ahịa maọbụ ree ahịa ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhịa ahụ, maọbụ ihe e ji mara ya, maọbụ ọnụọgụgụ nọchiri aha ya.
so that no one can buy or sell unless he has the brand of the beast, or the number of his name.
18 Nke a ka chọrọ amamihe maka ịghọta ya. Ka onye ọbụla nwere ọgụgụisi, gụọ ọnụọgụgụ nke anụ ọhịa ahụ, nʼihi na ọ bụ ọnụọgụgụ mmadụ. Ọnụọgụgụ ahụ bụkwa narị isi na iri isi na isii, ya bụ 666.
Here is wisdom. Let him who has understanding count the number of the beast; for it is the number of a man; and his number is 666.