< Mkpughe 12 >
1 Oke ihe ịrịbama pụtara ihe nʼeluigwe, otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dịka uwe. Ọnwa dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpueze nwee kpakpando iri na abụọ dịkwa ya nʼisi.
tataH paraM svargE mahAcitraM dRSTaM yOSidEkAsIt sA parihitasUryyA candrazca tasyAzcaraNayOradhO dvAdazatArANAM kirITanjca zirasyAsIt|
2 Ọ dị ime, na-etikwa mkpu nʼihi ahụhụ na ihe ụfụ nke ọmụmụ nwa.
sA garbhavatI satI prasavavEdanayA vyathitArttarAvam akarOt|
3 Mgbe ahụ, ihe ama ọzọ pụtara ihe nʼeluigwe, agwọ ochie nke dị ukwuu na-acha uhie uhie a na-akpọ dragọn, nke nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpueze asaa nʼisi ya.
tataH svargE 'param EkaM citraM dRSTaM mahAnAga Eka upAtiSThat sa lOhitavarNastasya sapta zirAMsi sapta zRggANi ziraHsu ca sapta kirITAnyAsan|
4 O nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke kpakpando niile dị nʼeluigwe, tụda ha nʼala. Ọ bịara guzo nʼihu nwanyị ahụ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ ma a mụpụta ya.
sa svalAggUlEna gaganasthanakSatrANAM tRtIyAMzam avamRjya pRthivyAM nyapAtayat| sa Eva nAgO navajAtaM santAnaM grasitum udyatastasyAH prasaviSyamANAyA yOSitO 'ntikE 'tiSThat|
5 Ọ mụpụtara nwantakịrị nwoke, “onye ga-ejikwa mkpara ọchịchị chịa mba niile ọchịchị.” Nʼotu oge ahụ kwa, e si nʼebe ahụ wepụ nwata ahụ were ya gaa nʼebe Chineke nọ nʼeluigwe nʼocheeze ya.
sA tu puMsantAnaM prasUtA sa Eva lauhamayarAjadaNPEna sarvvajAtIzcArayiSyati, kinjca tasyAH santAna Izvarasya samIpaM tadIyasiMhAsanasya ca sannidhim uddhRtaH|
6 Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii.
sA ca yOSit prAntaraM palAyitA yatastatrEzvarENa nirmmita AzramE SaSThyadhikazatadvayAdhikasahasradinAni tasyAH pAlanEna bhavitavyaM|
7 Mgbe ahụ, agha dapụtara nʼeluigwe. Maikel na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide agwọ ochie ahụ (a na-akpọ dragọn). Dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha nke ha,
tataH paraM svargE saMgrAma upApiSThat mIkhAyElastasya dUtAzca tEna nAgEna sahAyudhyan tathA sa nAgastasya dUtAzca saMgrAmam akurvvan, kintu prabhavituM nAzaknuvan
8 ma e meriri ha, ha enwekwaghị ọnọdụ ọbụla nʼeluigwe.
yataH svargE tESAM sthAnaM puna rnAvidyata|
9 Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile.
aparaM sa mahAnAgO 'rthatO diyAvalaH (apavAdakaH) zayatAnazca (vipakSaH) iti nAmnA vikhyAtO yaH purAtanaH sarpaH kRtsnaM naralOkaM bhrAmayati sa pRthivyAM nipAtitastEna sArddhaM tasya dUtA api tatra nipAtitAH|
10 Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị, “O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya, ha abụrụla ihe dị ire. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.
tataH paraM svargE uccai rbhASamANO ravO 'yaM mayAzrAvi, trANaM zaktizca rAjatvamadhunaivEzvarasya naH| tathA tEnAbhiSiktasya trAtuH parAkramO 'bhavatM|| yatO nipAtitO 'smAkaM bhrAtRNAM sO 'bhiyOjakaH| yEnEzvarasya naH sAkSAt tE 'dUSyanta divAnizaM||
11 Ha lụgburu ya nʼagha site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ na site nʼama nke okwu ọnụ ha, nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa, kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ.
mESavatsasya raktEna svasAkSyavacanEna ca| tE tu nirjitavantastaM na ca snEham akurvvata| prANOSvapi svakIyESu maraNasyaiva sagkaTE|
12 Ya mere, ṅụrịanụ ọṅụ eluigwe ma unu ndị niile bi nʼime ya. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼụwa na osimiri nʼihi na ekwensu abịakwutela unu. O jirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge a o nwere ehighị nne.”
tasmAd Anandatu svargO hRSyantAM tannivAminaH| hA bhUmisAgarau tApO yuvAmEvAkramiSyati| yuvayOravatIrNO yat zaitAnO 'tIva kApanaH| alpO mE samayO 'styEtaccApi tEnAvagamyatE||
13 Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nʼụwa, ọ chụsoro nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ ọsọ.
anantaraM sa nAgaH pRthivyAM svaM nikSiptaM vilOkya tAM putraprasUtAM yOSitam upAdravat|
14 Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dịka nku oke ugo, ka o jiri gbanarị agwọ ochie ahụ feba nʼime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii.
tataH sA yOSit yat svakIyaM prAntarasthAzramaM pratyutpatituM zaknuyAt tadarthaM mahAkurarasya pakSadvayaM tasvai dattaM, sA tu tatra nAgatO dUrE kAlaikaM kAladvayaM kAlArddhanjca yAvat pAlyatE|
15 Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nʼọnụ ya sọpụta dịka iyi nke ga-ebufu nwanyị ahụ.
kinjca sa nAgastAM yOSitaM srOtasA plAvayituM svamukhAt nadIvat tOyAni tasyAH pazcAt prAkSipat|
16 Ma ala nyeere nwanyị ahụ aka. O meghere ọnụ ya loda idee mmiri a nke si nʼọnụ agwọ ahụ sọpụta.
kintu mEdinI yOSitam upakurvvatI nijavadanaM vyAdAya nAgamukhAd udgIrNAM nadIm apivat|
17 Mgbe ahụ, agwọ ochie ahụ wesara nwanyị ahụ iwe, pụọ ịga buo agha megide ụmụ ya bụ ndị niile fọdụrụ, bụ ndị niile na-edebe iwu Chineke na ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị ama nke Jisọs.
tatO nAgO yOSitE kruddhvA tadvaMzasyAvaziSTalOkairarthatO ya IzvarasyAjnjAH pAlayanti yIzOH sAkSyaM dhArayanti ca taiH saha yOddhuM nirgatavAn|