< Mkpughe 11 >
1 Enyere m ihe ọtụtụ osisi achara e ji atụ ihe. Agwara m sị m, “Gaa tụọ ụlọnsọ ukwu Chineke, ma tụọkwa ebe ịchụ aja dị nʼụlọnsọ ahụ, gụọ ọnụọgụgụ ndị niile na-akpọ isiala nʼebe ahụ.
有人给我一根量尺,告诉我:“你起来量一量神的殿和祭坛,数一数在那里敬拜的人。
2 Ma atụkwala ogige nke dị na mpụta ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ewerela ya nye ndị mba ọzọ. Ha ga-azọtọkwa obodo nsọ ahụ ụkwụ iri ọnwa anọ na abụọ.
但不要量圣殿外面的院子,因为它已经交给异族人,他们要践踏圣城四十二个月。
3 Aga m enye mmadụ abụọ ndị ga-agbara m ama ike ka ha buo amụma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii, ha ga-eyi akwa mkpe.”
我要将能力赐给穿著麻衣的两个人见证人,他们要持续预言一千二百六十天。”
4 Ndị a bụ osisi oliv abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ, ndị na-eguzo nʼihu Onye nwe ụwa.
他们就是站在大地之主面前的两棵橄榄树和两个灯台。
5 Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, ọkụ ga-esi ha nʼọnụ pụta rechapụ ndị iro ha. Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, a ga-egbu ya nʼụzọ dị otu a.
如果有人想要伤害他们,就有火从他们口中喷出,烧死他们的敌人。凡是想要伤害他们的,都会被杀死。
6 A ga-enyekwa ha ike imechi eluigwe ime ka mmiri ozuzo ọbụla ghara izo nʼụwa nʼime afọ atọ na ọkara ahụ ha ga-ebu amụma ha. A ga-enyekwa ha ike ime ka osimiri na mmiri nta niile ghọọ ọbara. Ha ga-enwekwa ike ime ka ụdị ọrịa dị iche iche bịakwasị ụwa niile nʼoge ọbụla ha chepụtara nʼobi ha.
他们有力量在其预言的时候关闭天空,不再下雨;有权力将水变成血,随时用各样灾难攻击大地,它们想要多少次都可以。
7 Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha. (Abyssos )
他们完成其见证时,那从深渊上来的野兽就会与他们作战,战胜他们并将其杀死。 (Abyssos )
8 Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọrọ nʼokporoụzọ nke obodo ukwu ahụ nke a na-akpọ na mmụọ Sọdọm na Ijipt, ebe a kpọgburu Onyenwe ha nʼobe.
他们的尸首会倒在大城市的开阔道路上。这些城在精神层面代表着所多玛和埃及,也是他们的主被钉上十字架的地方。
9 A gaghị ekwenyekwa ka onye ọbụla lie ozu ha. Ma ndị niile dị iche iche nʼụwa, nʼebo niile, na asụsụ niile, na mba niile ga-agba ozu ha gburugburu ụbọchị atọ na ọkara nʼebe a tọgbọrọ ha na-ele ha anya.
在三天半的时间中,来自各民族、部落、语言和国家的人会看着他们的尸首,但不许把尸首安葬在坟墓中。
10 Ndị niile bi nʼụwa ga-aṅụrị ọṅụ, nyerịta ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nʼihi ogbugbu e gburu ndị amụma abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhụju anya.
地上居住的人因为他们之死而欢喜庆祝,彼此赠送礼物,因为这两位先知曾经让他们受痛苦。
11 Ma mgbe ụbọchị atọ na ọkara gafesịrị, Chineke ga-eme ka Mmụọ ya na-enye ndụ banyekwa nʼime ha, ha bilitere ọtọ, oke egwu jidere ndị niile hụrụ ha.
但三天半后,上帝赋予生命的气息进入他们体内,他们就站立起来,看见这一切的人非常惧怕。
12 Ha nụrụ oke olu si nʼeluigwe daa na-asị, “rigotanụ nʼelu.” Ha siri nʼigwe ojii, rigoro nʼeluigwe ebe ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya.
两位见证人听见从天上来的巨大声音,告诉他们:“上到这里来!”于是他们驾云上了天,他们的仇敌都看到了。
13 Ma nʼotu oge ahụ, nʼotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu mara nke mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ iri nke obodo ahụ niile daa. Ndị nwụrụ nʼoge ala ọma jijiji a dịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị niile fọdụrụ sitere nʼoke egwu nye Chineke nke eluigwe otuto.
就在那时,大地震发生了,那座城倒塌了十分之一,因地震而死的有七千人,其他人都很害怕,把荣耀归于天上的上帝。
14 Ugbu a ahụhụ nke abụọ ahụ agafeela. Ma mgbe na-adịghị anya, ahụhụ nke atọ na-abịa.
第二次灾祸过去了,第三次灾祸快要到了!
15 Ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya, oke olu dị iche iche dara ike ike nʼeluigwe, na-asị, “Alaeze niile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” (aiōn )
第七位天使吹响号角,天上传来巨大的声音说:“世上的国家成了我们主和基督所立的国,他要作王,直到永永远远!” (aiōn )
16 Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ nọ nʼocheeze ndị ahụ dị nʼihu ocheeze Chineke dara nʼala kpọọ isiala nye Chineke,
那在上帝面前坐在自己座位上的二十四位长老,朝着向地面俯倒敬拜上帝,
17 na-asị, “Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-adị, na onye dịkwaarị, nʼihi na i werela oke ike gị niile nʼaka gị malitekwa ịchị ọchịchị.
他们说:“过去和现在都存在的全能之主上帝,我们感谢你,因为你执掌了大权并成为统治者!
18 Mba niile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe na ịkwụghachi ndị ohu gị bụ ndị amụma ụgwọ ọrụ ha, na ndị nsọ na ndị gị niile, bụ ndị na-atụ egwu aha gị, bụ ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nʼiyi ndị na-emebi ụwa ga-adị.”
各国非常愤怒,但你的审判也来到了,这是死人受审判的时刻!你的仆人、先知、信徒只要尊重你的权威,无论虚弱或拥有全力,都要得赏赐!在此刻,你也将毁灭那些毁灭大地的人!”
19 Mgbe ahụ kwa, e meghere ụlọnsọ Chineke nke dị nʼeluigwe. A hụkwara igbe ọgbụgba ndụ nʼime ya. Nʼotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji na akụmmiri igwe mere mkpọtụ nke ukwuu.
于是,上帝在天上的圣殿打开,他的约柜在圣殿中显现,随即出现闪电、雷鸣、地震、大冰雹。