< Mkpughe 1 >
1 Mkpughe banyere Jisọs Kraịst, nke Chineke nyere ya igosi ndị ohu ya, ime ka ha mata ihe ndị ahụ na-aga ime nʼoge na-adịghị anya. O mere ka amata nke a site na izite mmụọ ozi ya ka ọ bịakwute ohu ya Jọn,
Hizi ni habari za mambo ambayo yalifunuliwa na Yesu Kristo. Mungu alimpa Kristo ufunuo huu ili awaonyeshe watumishi wake mambo ambayo yanapaswa kutukia karibuni. Kristo alimtuma malaika wake amjulishe Yohane, mtumishi wake, mambo hayo,
2 onye a gbara ama banyere ihe niile ọ hụrụ, okwu Chineke, na ọgbụgba ama Jisọs Kraịst.
naye Yohane, ameyasema yote aliyoyaona. Na hii ndio taarifa yake kuhusu ujumbe wa Mungu na ukweli uliofunuliwa na Yesu Kristo.
3 Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-agụpụta okwu ndị a dị nʼamụma a. Ngọzị na-adịkwara ndị na-anụ ya, ma nabata ihe e dere nʼime ya nʼobi ha. Nʼihi na oge mmezu ha dị nso.
Heri yake mtu anayesoma kitabu hiki; heri yao wale wanaosikiliza maneno ya ujumbe huu wa kinabii na kushika yaliyoandikwa humu, maana wakati umekaribia ambapo mambo haya yatatukia.
4 Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a, Na-edere ya nzukọ asaa dị na mpaghara Eshịa: Ka amara na udo nke sitere na Onye ahụ na-adị, Onye ahụ dịkwaarị, na Onye ahụ na-aga ịbịa dịrị unu, sitekwa nʼebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nʼihu ocheeze ya,
Mimi Yohane nayaandikia makanisa yaliyoko mkoani Asia. Nawatakieni neema na amani kutoka kwake yeye aliyeko, aliyekuwako na anayekuja; na kutoka kwa roho saba walio mbele ya kiti chake cha enzi,
5 sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa. Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie.
na kutoka kwa Yesu Kristo, shahidi mwaminifu, wa kwanza kufufuliwa kutoka wafu, na ambaye ni mtawala wa wafalme wa dunia. Yeye anatupenda, na kwa damu yake ametufungua kutoka vifungo vya dhambi zetu,
6 O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn )
akatufanya sisi kuwa ufalme wa makuhani, tumtumikie Mungu, Baba yake. Kwake Yesu Kristo uwe utukufu na nguvu, milele na milele! Amina. (aiōn )
7 “Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii. Anya niile ga-ahụkwa ya, ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.” Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.”
Tazama! Anakuja katika mawingu! Kila mtu atamwona, hata wale waliomchoma. Makabila yote duniani yataomboleza juu yake. Naam! Amina.
8 Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”
“Mimi ni Alfa na Omega,” asema Bwana Mungu Mwenye Uwezo, aliyeko, aliyekuwako na anayekuja.
9 Mụ onwe m, Jọn, nwanne unu nwoke, onye unu na ya na-enwekọ ahụhụ na nʼalaeze, na ntachiobi nke bụ oke anyị nʼime Jisọs. Anọ m nʼogbe ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu a na-akpọ Patmọs nʼihi okwu Chineke na-agba ama banyere Kraịst.
Mimi ni Yohane, ndugu yenu; na kwa kuungana na Kristo nashiriki pamoja nanyi katika kustahimili mateso yanayowapata wale walio wa Utawala wake. Mimi nilikuwa kisiwani Patmo kwa sababu ya kuhubiri ujumbe wa Mungu na ukweli wa Yesu.
10 Nʼụbọchị Onyenwe anyị, anọ m nʼime Mmụọ ma nụ otu oke olu dara ụda dị ka opi ike nʼazụ m,
Basi, wakati mmoja, siku ya Bwana, nilikumbwa na Roho, nikasikia nyuma yangu sauti kubwa kama sauti ya tarumbeta.
11 na-ekwu, “Dee ihe ị na-ahụ ugbu a nʼakwụkwọ zigara ya nzukọ asaa dị nʼEfesọs na Smyrna na Pegamọm na Tiatira na Sardis, na Filadelfia na Laodisia.”
Nayo ilisema, “Andika katika kitabu yote unayoyaona, ukipeleke kwa makanisa haya saba: Efeso, Smurna, Pergamoni, Thuatira, Sarde, Filadelfia na Laodikea.”
12 Mgbe m chigharịrị, lee anya ịhụ onye na-agwa m okwu, ahụrụ m ihe ịdọba oriọna asaa e ji ọlaedo kpụọ.
Basi, nikageuka nimwone huyo aliyesema nami, nikaona vinara vya taa saba vya dhahabu,
13 Nʼetiti ihe ịdọba oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere ihe okike na-acha ọlaedo e ji kee gburugburu obi ya.
na katikati yake kulikuwa na kitu kama mtu, naye alikuwa amevaa kanzu ndefu na ukanda wa dhahabu kifuani.
14 Isi ya na agịrị isi ya na-acha vaa dịka ogho ọcha, dịka akụmmiri igwe. Anya ya abụọ yiri ire ọkụ na-enwusi ike.
Nywele zake zilikuwa nyeupe kama pamba safi, kama theluji; macho yake yalimetameta kama moto;
15 Ụkwụ ya abụọ dị ka bronz a nụchasịrị nnọọ nke ọma hichapụkwa ya. Olu okwu ya na-ada dị ka ụzụ mmiri na-achị achị.
miguu yake iling'aa kama shaba iliyosafishwa katika tanuru ya moto na kusuguliwa, na sauti yake ilikuwa, kama sauti ya poromoko la maji.
16 O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile.
Katika mkono wake wa kulia, alikuwa na nyota saba, na kinywani mwake mlitoka upanga wenye makali kuwili. Uso wake uling'aa kama jua kali.
17 Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala nʼụkwụ ya dịka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nʼahụ na-ekwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ.
Basi, nilipomwona tu, nilianguka mbele ya miguu yake kama maiti. Lakini yeye akaweka mkono wake wa kulia juu yangu, akasema, “Usiogope! Mimi ni wa kwanza na wa mwisho.
18 Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ. (aiōn , Hadēs )
Mimi ni yeye aliye hai! Nilikuwa nimekufa, lakini, tazama, sasa ni mzima milele na milele. Ninazo funguo za kifo na Kuzimu. (aiōn , Hadēs )
19 “Ya mere, detuo ihe niile ị hụrụla, ihe dị ugbu a na ihe gaje ime na mgbe na adịghị anya.
Basi, sasa andika mambo haya unayoyaona, mambo yanayotukia sasa na yale yatakayotukia baadaye.
20 Nke a bụ ihe omimi nke kpakpando asaa ahụ ị hụrụ nʼaka nri m, na ihe ịdọba oriọna asaa ndị ahụ pụtara. Kpakpando asaa ahụ bụ ndị mmụọ ozi ụlọ nzukọ asaa ahụ. Osisi oriọna asaa ahụ bụ ụlọ nzukọ ndị ahụ nʼonwe ha.
Siri ya nyota zile saba ulizoziona katika mkono wangu wa kulia, na siri ya vile vinara saba vya taa hii: zile nyota saba ni malaika wa makanisa; na vile vinara saba vya taa ni makanisa saba.