< Abụ Ọma 99 >

1 Onyenwe anyị bụ eze, ka mba niile maa jijiji! O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim, ka elu ụwa maa jijiji.
Jehovah reigns. Let the peoples tremble. He sits enthroned among the cherubim; the earth shakes.
2 Onyenwe anyị dị ukwuu nʼime Zayọn; ọ bụ onye e buliri elu karịa mba niile dị iche iche.
Jehovah is great in Zion. He is high above all the peoples.
3 Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu, ọ dị nsọ.
Let them praise your great and awesome name. He is Holy.
4 Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya, i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike; nʼime Jekọb ka i mere ihe ziri ezi na ihe dị mma.
The King's strength also loves justice. You do establish equity. You execute justice and righteousness in Jacob.
5 Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu, feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya; ọ dị nsọ.
Exalt Jehovah our God. Worship at his footstool. He is Holy.
6 Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya, Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya; ha kpọkuru Onyenwe anyị ọ zakwara ha.
Moses and Aaron were among his priests, Samuel among those who call on his name; they called on Jehovah, and he answered them.
7 Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii. Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha.
He spoke to them in the pillar of cloud. They kept his testimonies, the statute that he gave them.
8 O Onyenwe anyị, Chineke anyị, ị zara ha; ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie, nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.
You answered them, Jehovah our God. You are a God who forgave them, although you took vengeance for their doings.
9 Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu; na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ, nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.
Exalt Jehovah, our God. Worship at his holy mountain, for Jehovah, our God, is holy.

< Abụ Ọma 99 >