< Abụ Ọma 98 >

1 Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta.
Ihubo Hlabelelani uThixo ingoma entsha, ngoba wenzile izinto ezimangalisayo; isandla sakhe sokunene lengalo yakhe engcwele sekumenzele insindiso.
2 Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile.
UThixo useyenze yaziwa insindiso yakhe waveza ukulunga kwakhe ezizweni.
3 O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
Uselukhumbule uthando lwakhe lokuthembeka Kwakhe endlini ka-Israyeli; yonke imikhawulo yomhlaba iyibonile insindiso kaNkulunkulu wethu.
4 Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;
Hlokomani ngentokozo kuThixo, mhlaba wonke, hlabelani ingoma ngokujabula okukhulu, litshaya amachacho;
5 werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ, e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma,
yenzani umsindo kuThixo ngomhubhe, ngomhubhe langomsindo wokuhlabela,
6 jirinụ opi na opi ike, tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.
ngamacilongo langomsindo wophondo lwenqama hlokomani ngentokozo phambi kukaThixo, iNkosi.
7 Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya, ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
Akuthi ulwandle luhlokome, lakho konke okuphakathi kwalo, umhlaba labo bonke abahlala kuwo.
8 Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha, ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ;
Akuthi imifula iqakeze izandla zayo, akuthi izintaba zihlabele kanyekanye ngentokozo;
9 ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe. Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
kazihlabele phambi kukaThixo, ngoba Uyeza ukuzakwahlulela umhlaba. Uzakwahlulela umhlaba ngokulunga labantu bonke ngokufaneleyo.

< Abụ Ọma 98 >