< Abụ Ọma 98 >

1 Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta.
A Psalm. Sing ye to Jehovah a new song, For wonders He hath done, Given salvation to Him hath His right hand and His holy arm.
2 Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile.
Jehovah hath made known His salvation, Before the eyes of the nations, He hath revealed His righteousness,
3 O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
He hath remembered His kindness, And His faithfulness to the house of Israel, All ends of earth have seen the salvation of our God.
4 Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;
Shout to Jehovah, all the earth, Break forth, and cry aloud, and sing.
5 werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ, e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma,
Sing to Jehovah with harp, With harp, and voice of praise,
6 jirinụ opi na opi ike, tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.
With trumpets, and voice of a cornet, Shout ye before the king Jehovah.
7 Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya, ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
Roar doth the sea and its fulness, The world and the inhabitants in it.
8 Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha, ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ;
Floods clap hand, together hills cry aloud,
9 ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe. Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
Before Jehovah, For He hath come to judge the earth, He judgeth the world in righteousness, And the people in uprightness!

< Abụ Ọma 98 >