< Abụ Ọma 97 >
1 Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ; ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa.
Bwana anatawala, nchi na ifurahi, visiwa vyote vishangilie.
2 Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya.
Mawingu na giza nene vinamzunguka, haki na hukumu ndio msingi wa kiti chake cha enzi.
3 Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu ya ọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla.
Moto hutangulia mbele zake na huteketeza adui zake pande zote.
4 Amụma ya na-acha chazuo elu ụwa niile; ụwa niile na-ahụ ya na-ama jijiji.
Umeme wake wa radi humulika dunia, nchi huona na kutetemeka.
5 Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu Onyenwe ụwa niile.
Milima huyeyuka kama nta mbele za Bwana, mbele za Bwana wa dunia yote.
6 Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya.
Mbingu zinatangaza haki yake, na mataifa yote huona utukufu wake.
7 A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe, ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka mee feenụ ya ofufe, unu chi niile!
Wote waabuduo sanamu waaibishwa, wale wajisifiao sanamu: mwabuduni yeye, enyi miungu yote!
8 Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ, obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị.
Sayuni husikia na kushangilia, vijiji vya Yuda vinafurahi kwa sababu ya hukumu zako, Ee Bwana.
9 Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile; ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile.
Kwa kuwa wewe, Ee Bwana, ndiwe Uliye Juu Sana kuliko dunia yote; umetukuka sana juu ya miungu yote.
10 Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị, nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume.
Wale wanaompenda Bwana na wauchukie uovu, kwa maana yeye hulinda maisha ya waaminifu wake na kuwaokoa kutoka mkononi mwa mwovu.
11 Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume, ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi.
Nuru huangaza wenye haki na furaha kwa watu wanyofu wa moyo.
12 Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume, tookwanụ aha nsọ ya.
Furahini katika Bwana, ninyi mlio wenye haki, lisifuni jina lake takatifu.