< Abụ Ọma 97 >

1 Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ; ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa.
For David, when his land is established. The Lord reigns, let the earth exult, let many islands rejoice.
2 Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya.
Cloud, and darkness are round about him; righteousness and judgment are the establishment of his throne.
3 Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu ya ọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla.
Fire shall go before him, and burn up his enemies round about.
4 Amụma ya na-acha chazuo elu ụwa niile; ụwa niile na-ahụ ya na-ama jijiji.
His lightnings appeared to the world; the earth saw, and trembled.
5 Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu Onyenwe ụwa niile.
The mountains melted like wax at the presence of the Lord, at the presence of the Lord of the whole earth.
6 Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya.
The heavens have declared his righteousness, and all the people have seen his glory.
7 A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe, ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka mee feenụ ya ofufe, unu chi niile!
Let all that worship graven images be ashamed, who boast of their idols; worship him, all you his angels.
8 Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ, obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị.
Sion heard and rejoiced; and the daughters of Judea exulted, because of your judgments, O Lord.
9 Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile; ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile.
For you are Lord most high over all the earth; you are greatly exalted above all gods.
10 Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị, nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume.
You that love the Lord, hate evil; the Lord preserves the souls of his saints; he shall deliver them from the hand of sinners.
11 Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume, ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi.
Light is sprung up for the righteous, and gladness for the upright in heart.
12 Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume, tookwanụ aha nsọ ya.
Rejoice in the Lord, you righteous; and give thanks for a remembrance of his holiness.

< Abụ Ọma 97 >