< Abụ Ọma 96 >

1 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.
你们要向耶和华唱新歌! 全地都要向耶和华歌唱!
2 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
要向耶和华歌唱,称颂他的名! 天天传扬他的救恩!
3 Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.
在列邦中述说他的荣耀! 在万民中述说他的奇事!
4 Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
因耶和华为大,当受极大的赞美; 他在万神之上,当受敬畏。
5 Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
外邦的神都属虚无; 惟独耶和华创造诸天。
6 Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.
有尊荣和威严在他面前; 有能力与华美在他圣所。
7 Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.
民中的万族啊,你们要将荣耀、能力归给耶和华, 都归给耶和华!
8 Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya; werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.
要将耶和华的名所当得的荣耀归给他, 拿供物来进入他的院宇。
9 Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya; maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.
当以圣洁的妆饰敬拜耶和华; 全地要在他面前战抖!
10 Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
人在列邦中要说:耶和华作王! 世界就坚定,不得动摇; 他要按公正审判众民。
11 Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya.
愿天欢喜,愿地快乐! 愿海和其中所充满的澎湃!
12 Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ.
愿田和其中所有的都欢乐! 那时,林中的树木都要在耶和华面前欢呼。
13 Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa, ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe, jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.
因为他来了,他来要审判全地。 他要按公义审判世界, 按他的信实审判万民。

< Abụ Ọma 96 >