< Abụ Ọma 95 >

1 Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ. 2 Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma. 3 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu. 4 Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya. 5 Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, aka ya kpụrụ ala akọrọ niile. 6 Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị; 7 nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, 8 “Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara, 9 ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere. 10 Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ; ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ, ha amatabeghị ụzọ m niile.’ 11 Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’”

< Abụ Ọma 95 >