< Abụ Ọma 95 >

1 Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ.
Wozani, siyihlabelele iNkosi, senze umsindo wentokozo kulo idwala losindiso lwethu.
2 Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma.
Kasize phambi kobuso bayo ngokubonga, senze umsindo wentokozo kuyo ngezihlabelelo.
3 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu.
Ngoba iNkosi inguNkulunkulu omkhulu, leNkosi enkulu phezu kwabonkulunkulu bonke.
4 Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya.
Okusesandleni sayo indawo zomhlaba ezizikileyo, lezingqonga zezintaba zingezayo.
5 Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, aka ya kpụrụ ala akọrọ niile.
Olungolwayo ulwandle, yona-ke yalwenza, lezandla zayo zabumba umhlabathi owomileyo.
6 Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị;
Wozani, sikhonze sikhothame, siguqe phambi kweNkosi, umenzi wethu.
7 nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya,
Ngoba yona inguNkulunkulu wethu, thina-ke singabantu bedlelo layo, lezimvu zesandla sayo. Lamuhla uba lilizwa ilizwi layo,
8 “Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara,
lingayenzi ibe lukhuni inhliziyo yenu njengekuphikisaneni, njengesukwini lokulinga enkangala,
9 ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.
lapho oyihlo bangilinga bengihlola, yebo babona umsebenzi wami.
10 Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ; ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ, ha amatabeghị ụzọ m niile.’
Iminyaka engamatshumi amane nganengwa yilesisizukulwana ngaze ngathi: Bangabantu abaduhayo enhliziyweni, bona kabazazi indlela zami.
11 Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’”
Engafunga kubo ekuthukutheleni kwami, ngathi: Kabayikungena ekuphumuleni kwami.

< Abụ Ọma 95 >